Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌPUPU 6

6
1Jehova we si Moses, Ub͕u a ka i gāhu ihe M'gēme Fero: n'ihi na n'aka di ike ka o gēzipu ha, ọ bu kwa n'aka di ike ka ọ gāchupu ha n'ala-ya.
2Chineke we gwa Moses okwu, si ya, Mu onwem bu JEHOVA: 3eme-kwa-ram Abraham, me kwa Aisak, me kwa Jekob, ka ha hum anya dika Chineke Nke puru ime ihe nile, ma n'aham, bú JEHOVA, ka anēmeghi ka ha maram. 4Ọzọ kwa, emewom ka ọb͕ub͕a-ndum guzosie ike n'ebe ha nọ, inye ha ala Kenean, bú ala ọnọdu-ọbìa nile ha, nke ha nọri dika ọbìa nime ya. 5Ọzọ kwa, Mu onwem anuwo isu-ude umu Israel, ndi ndi Ijipt nēme ka ha buru orù; echetawokwam ọb͕ub͕a-ndum. 6N'ihi ya si umu Israel, Mu onwem bu Jehova, M'gēme kwa ka unu si n'okpuru ibu nile nke ndi Ijipt pua, M'gānaputa kwa unu n'òfùfè-ha, were kwa ogwe-aka esetiri eseti, were kwa ikpé uku di iche iche, b͕aputa unu: 7M'gēwere kwa unu n'Onwem ka unu buru otù ndi, M'gābu-kwa-ra unu Chineke: unu gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova Chineke-unu, Nke nēme ka unu si n'okpuru ibu nile nke ndi Ijipt puta. 8M'gēme kwa ka unu bata n'ala ahu, nke M'weliri akam iwere ya nye Abraham, nye kwa Aisak, nye kwa Jekob; M'gēnye kwa unu ya ka ọ buru ihe-nnweta: Mu onwem bu Jehova. 9Moses we gwa umu Israel okwu otú a: ma ha egeghi Moses nti site n'enweghi-ntachi-obi nime mọ-ha, site kwa n'òfùfè siri ike.
10Jehova we gwa Moses okwu, si, 11Bà gwa Fero, bú eze Ijipt, okwu, ka ọ we zipu umu Israel n'ala-ya. 12Moses we kwue n'iru Jehova, si, Le, umu Israel egeghm nti; Fèro gēsi kwa aṅa nuru olum, onye mu onwem bu onye anēbighi úgwù n'eb͕ub͕ere-ọnu? 13Jehova we gwa Moses na Eron okwu, nye ha iwu n'ebe umu Israel nọ, na n'ebe Fero eze Ijipt nọ, ime ka umu Israel si n'ala Ijipt pua.
14Ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha: umu-ndikom Reuben, bú ọkpara Israel; Hanok, na Palu, na Hezron, na Kami: ndia bu ab͕uru Reuben. 15Umu-ndikom Simeon kwa; Jemuel, na Jamin, na Ohad, na Jakin, na Zoha, na Shaul, bú nwa nke nwayi Kenean ahu: ndia bu ab͕uru Simeon. 16Ndia bu kwa aha umu-ndikom Livai, dika osuso-ọmumu nile ha si di; Giashon, na Kohat, na Merari: arọ ndu Livai di ọgu arọ isi na iri na asa. 17Umu-ndikom Giashon; Libni, na Shimai, dika ab͕uru nile ha si di. 18Umu-ndikom Kohat kwa; Amram, na Izha, na Hebron, na Uziel: arọ ndu Kohat di ọgu arọ isi na iri na atọ. 19Umu-ndikom Merari kwa; Mahli na Mushi. Ndia bu ab͕uru ndi Livai, dika osuso-ọmumu nile ha si di. 20Amram we lutara onwe-ya Jokebed na nwunye, bú nwa-nne-nwayi nke nna-ya; ọ we muara ya Eron na Moses: arọ ndu Amram di ọgu arọ isi na iri na asa. 21Umu-ndikom Izha kwa; Kora, na Nefeg, na Zikri. 22Umu-ndikom Uziel kwa; Mishael, na Elzafan, na Sitri. 23Eron we lutara onwe-ya Elisheba na nwunye, bú nwa-nwayi Aminadab, nwa-nne-nwayi Nahshon; ọ we muara ya Nedab, na Abaihu, na Eleeza, na Itama. 24Umu-ndikom Kora kwa; Asia, na Elkena, na Abiasaf; ndia bu ab͕uru ndi Kora. 25Eleeza nwa Eron we lutara onwe-ya otù nime umu-ndinyom Putiel, ọ we muara ya Finehas. Ndia bu ndi-isi nke ndi bu nna nke ndi Livai, dika ab͕uru nile ha si di. 26Ndia bu Eron na Moses ahu, ndi Jehova siri, Menu ka umu Israel si n'ala Ijipt puta n'usu nile nke ndi-agha-ha. 27Ha onwe-ha bu ndi nāgwa Fero eze Ijipt okwu, ime ka umu Israel si n'Ijipt pua: ndia bu Moses na Eron ahu.
28O rue, n'ubọchi Jehova gwara Moses okwu n'ala Ijipt, 29na Jehova gwara Moses okwu, si, Mu onwem bu Jehova: gwa Fero eze Ijipt okwu nile nke Mu onwem nāgwa gi. 30Moses we si n'iru Jehova, Le, mu onwem bu onye anēbighi úgwù n'eb͕ub͕ere-ọnu, Fèro gēsi kwa aṅa gem nti?

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ỌPUPU 6: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye