Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌPUPU 40

40
1Jehova we gwa Moses okwu, si, 2N'ubọchi mbu nke ọnwa mbu ka i gēguzo ebe-obibi nke ulo-ikwū nzute ahu ọtọ. 3I gādọba kwa n'ebe ahu ib͕e ihe-àmà ahu, i gēji kwa ákwà-nb͕ochi ahu kwuchi ib͕e ahu. 4I gēwebata kwa table ahu, do ihe ya n'usoro; i gēwe-bata kwa ihe-idọba-oriọna ahu, weli kwa oriọna-ya nile. 5I gētiye kwa ebe-ichu-àjà ọla-edo isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'iru ib͕e ihe-àmà ahu, tukwasi kwa ákwà-nkwuchi nke ọnu-uzọ n'ebe-obibi ahu. 6I gētiye kwa ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku ahu n'iru ọnu-uzọ nke ebe-obibi nke ulo-ikwū nzute ahu. 7I gētiye kwa ite ọsisa-miri ahu n'etiti ulo-ikwū nzute ahu na ebe-ichu-àjà ahu, tiye miri n'ebe ahu. 8I gēdebe kwa ogige ahu buruburu, tiye ákwà-nkwuchi nke ọnu-uzọ-ama ogige ahu. 9I gēwere kwa manu otite-manu ahu te ebe-obibi ahu, na ihe nile nke di nime ya, i gēdo kwa ya nsọ, na ihe-ya nile: ọ gādi kwa nsọ. 10I gēte kwa ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku ahu manu, ya na ihe-ya nile, do ebe-ichu-àjà ahu nsọ: ebe-ichu-àjà ahu gābu ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile. 11I gēte kwa ite ọsisa-miri ahu na ukwu-ala-ya manu, do ya nsọ. 12I gēme kwa Eron na umu-ya ndikom ka ha biarue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute ahu nso, i gēwere kwa miri sa ha aru. 13I gēyikwasi kwa Eron uwe nsọ ahu; i gēte kwa ya manu, do ya nsọ, ka o we burum onye-nchu-àjà. 14Ọ bu kwa umu-ya ndikom ka i gēme ka ha biarue nso, i gēyikwasi kwa ha uwe-ime: 15i gēte kwa ha manu, dika i tere nna-ha, ka ha we burum ndi-nchu-àjà: otite-manu-ha aghaghi iburu ha ọlu-nchu-àjà ebighi-ebi rue ọb͕ọ-ha nile. 16Moses we me ya: dika ihe nile si di nke Jehova nyere ya n'iwu, otú a ka ọ mere.
17O rue n'ọnwa mbu n'arọ nke-abua, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, na eguzoro ebe-obibi ahu ọtọ. 18Moses we guzo ebe-obibi ahu ọtọ, tiye ukwu-ya nile, guzo ibo-ya nile ọtọ, tiye nkpọrọ-ya nile, guzo ide-ya nile ọtọ. 19Ọ we b͕asa ulo-ikwū ahu n'elu ebe-obibi ahu, tukwasi ya ihe-nkpuchi nke ulo-ikwū ahu n'elu; dika Jehova nyere Moses iwu. 20O were ihe-àmà ahu tiye n'ib͕e ahu, tukwasi nkpa-n'aka-ya abua n'ib͕e ahu, tiyekwasi ebe-nkpuchi-nmehie n'ib͕e ahu n'elu: 21o webata ib͕e ahu n'ebe-obibi ahu, do ákwà-nb͕ochi nke ákwà-nkwuchi ahu, we kwuchi ib͕e ihe-àmà ahu; dika Jehova nyere Moses iwu. 22O tiye table ahu n'ulo-ikwū nzute, n'akuku ebe-obibi ahu chere iru n'Ugwu, n'èzí ákwà-nb͕ochi ahu. 23O do usoro achicha n'usoro n'elu-ya n'iru Jehova; dika Jehova nyere Moses iwu. 24Ọ dọba ihe-idọba-oriọna ahu nime ulo-ikwū nzute, na ncherita-iru table, n'akuku ebe-obibi ahu chere iru na Ndida. 25O welie oriọna ahu nile n'iru Jehova; dika Jehova nyere Moses iwu. 26O tiye ebe-ichu-àjà ọla-edo ahu n'ulo-ikwū nzute n'iru ákwà-nb͕ochi ahu: 27o we sure n'elu ya ihe-nsure-oku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me; dika Jehova nyere Moses iwu. 28Ọ tukwasi ákwà-nkwuchi nke ọnu-uzọ n'ebe-obibi ahu. 29Ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku ka ọ dọba-kwa-ra n'ọnu-uzọ ebe-obibi nke ulo-ikwū nzute, we sure n'elu ya àjà-nsure-ọku ahu na onyinye-inata-iru-ọma ahu; dika Jehova nyere Moses iwu. 30Ọ dọba ite ọsisa-miri ahu n'etiti ulo-ikwū nzute na ebe-ichu-àjà, tiye miri n'ebe ahu, iji sa aru. 31Moses na Eron na umu-ya ndikom we sa aka-ha na ukwu-ha site na ya: 32mb͕e ha nābà n'ulo-ikwū nzute, na mb͕e ha nābiaru ebe-ichu-àjà nso, ha we sa aru: dika Jehova nyere Moses iwu. 33O guzo-kwa-ra ogige ahu ọtọ buru-buru ebe-obibi ahu na ebe-ichu-àjà ahu, tiye ákwà-nkwuchi nke ọnu-uzọ-ama ogige ahu. Moses we jesia ozi ahu.
34Igwe-oji ahu we kpuchie ulo-ikwū nzute, ebube Jehova we juputa ebe-obibi ahu. 35Moses apughi kwa ibà n'ulo-ikwū nzute, n'ihi na igwe-oji ahu biri n'elu ya, ebube Jehova juputa-kwa-ra ebe-obibi ahu. 36Mb͕e ọ bula emere ka igwe-oji ahu si n'elu ebe-obibi ahu rigo, umu Israel we bulie ije, nime nbuli-ije-ha nile: 37ma ọ buru na emeghi ka igwe-oji ahu rigo, ha adighi-ebuli kwa ije rue ubọchi emere ka ọ rigo. 38N'ihi na igwe-oji nke Jehova di n'elu ebe-obibi ahu n'ehihie, ọku di kwa nime ya n'abali, n'anya ulo Israel nile, nime nbuli-ije-ha nile.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ỌPUPU 40: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye