Ewe me ka òfùfè nile nke ebe-obibi nke ulo-ikwū nzute gwusia: umu Israel we me dika ihe nile si di nke Jehova nyere Moses n'iwu, otú a ka ha mere.
Ha we butere Moses ebe-obibi ahu, Ulo-ikwū ahu, na ihe-ya nile, nko-ya nile, na ibo-ya nile, na nkpọrọ-ya nile, na ide-ya nile, na ukwu-ya nile; na ihe-nkpuchi akpukpọ ebulu esijiri ọbara-ọbara, na ihe-nkpuchi akpukpọ seal, na ákwà-nb͕ochi nke ákwà-nkwuchi-ya; na ib͕e ihe-àmà ahu, na nkpa-n'aka-ya abua, na ebe-nkpuchi-nmehie ahu; na table ahu, na ihe-ya nile, na achicha nke iru Chineke; na ihe-idọba-oriọna ahu nke bu ọla-edo anāgwaghi agwa, na oriọna-ya nile, bú oriọna nke ido n'usoro, na ihe-ya nile, na manu nke ihe nēnye ìhè; na ebe-ichu-àjà ọla-edo ahu, na manu otite-manu ahu, na ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me, na ákwà-nkwuchi nke ọnu-uzọ Ulo-ikwū ahu; na ebe-ichu-àjà ọla ahu, na ihe-ọkpukpa ọla nke o nwere, na nkpa-n'aka-ya abua, na ihe-ya nile, na ite ọsisa-miri ahu, na ukwu-ala-ya; na ákwà-ngechi nile nke ogige ahu, na ide-ya nile, na ukwu ide-ya, na ákwà-nkwuchi ọnu-uzọ-ama ogige ahu nwere, na udọ̀-ya nile, na ǹtú-ya nile, na ihe nile nke òfùfè ebe-obibi ahu, nke diri ulo-ikwū nzute ahu; na uwe nile akpara nke-ọma, iji je ozi n'ebe nsọ ahu, na uwe nsọ nile Eron onye-nchu-àjà nwere, na uwe nile nke umu-ya ndikom, ibu ndi-nchu-àjà. Dika ihe nile Jehova nyere Moses n'iwu si di, otú a ka umu Israel jere ozi-ya nile. Moses we hu ojije-ozi ahu nile, ma, le, ha ejewo ya; dika Jehova nyere iwu, otú a ka ha jere ya: Moses we gọzie ha.