ỌPUPU 39:32-43
ỌPUPU 39:32-43 Bible Nso (IGBOB)
Ewe me ka òfùfè nile nke ebe-obibi nke ulo-ikwū nzute gwusia: umu Israel we me dika ihe nile si di nke Jehova nyere Moses n'iwu, otú a ka ha mere. Ha we butere Moses ebe-obibi ahu, Ulo-ikwū ahu, na ihe-ya nile, nko-ya nile, na ibo-ya nile, na nkpọrọ-ya nile, na ide-ya nile, na ukwu-ya nile; na ihe-nkpuchi akpukpọ ebulu esijiri ọbara-ọbara, na ihe-nkpuchi akpukpọ seal, na ákwà-nb͕ochi nke ákwà-nkwuchi-ya; na ib͕e ihe-àmà ahu, na nkpa-n'aka-ya abua, na ebe-nkpuchi-nmehie ahu; na table ahu, na ihe-ya nile, na achicha nke iru Chineke; na ihe-idọba-oriọna ahu nke bu ọla-edo anāgwaghi agwa, na oriọna-ya nile, bú oriọna nke ido n'usoro, na ihe-ya nile, na manu nke ihe nēnye ìhè; na ebe-ichu-àjà ọla-edo ahu, na manu otite-manu ahu, na ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me, na ákwà-nkwuchi nke ọnu-uzọ Ulo-ikwū ahu; na ebe-ichu-àjà ọla ahu, na ihe-ọkpukpa ọla nke o nwere, na nkpa-n'aka-ya abua, na ihe-ya nile, na ite ọsisa-miri ahu, na ukwu-ala-ya; na ákwà-ngechi nile nke ogige ahu, na ide-ya nile, na ukwu ide-ya, na ákwà-nkwuchi ọnu-uzọ-ama ogige ahu nwere, na udọ̀-ya nile, na ǹtú-ya nile, na ihe nile nke òfùfè ebe-obibi ahu, nke diri ulo-ikwū nzute ahu; na uwe nile akpara nke-ọma, iji je ozi n'ebe nsọ ahu, na uwe nsọ nile Eron onye-nchu-àjà nwere, na uwe nile nke umu-ya ndikom, ibu ndi-nchu-àjà. Dika ihe nile Jehova nyere Moses n'iwu si di, otú a ka umu Israel jere ozi-ya nile. Moses we hu ojije-ozi ahu nile, ma, le, ha ejewo ya; dika Jehova nyere iwu, otú a ka ha jere ya: Moses we gọzie ha.
ỌPUPU 39:32-43 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Otu a ka ha si rụchaa ọrụ iwu ụlọ nzute ahụ. Ndị Izrel mere ihe niile dịka ONYENWE ANYị si nye Mosis nʼiwu. Mgbe ahụ, ha buteere Mosis ụlọ nzute ahụ: ụlọ ikwu ahụ ya na ngwongwo ya niile, ya bụ nko ya niile, mbudo ibo ya niile, mkpọrọ osisi ya niile, ogidi ya niile na ụkwụ ya niile, na akpụkpọ ebule e sijiri uhie uhie, akpụkpọ ehi mmiri e ji emechi elu ụlọ nzute ahụ, na akwa mgbochi, na igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ, ya na mkpara e ji ebu ya, na oche ebere ya, na tebul ahụ, ya na ngwongwo ya niile na achịcha nke iche nʼIhu Onyenwe anyị, na ihe ịdọkwasị oriọna e ji ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ, na iheọkụ ya niile na ngwongwo ya niile, na mmanụ oliv maka ịmụ ọkụ, na ebe ịchụ aja ọlaedo, mmanụ nsọ na ụda na-esi isi ụtọ na akwa mgbochi nke ọnụ ụzọ ụlọ nzute, na ebe ịchụ aja bronz ahụ, na ihe ọkpụkpa bronz ya, mkpara ya niile na ngwongwo ya niile, efere ukwu ahụ ya na ihe ndọkwasị ya, akwa mgbochi nke ogige ụlọ ahụ, na ogidi ya na ihe ndọkwasị ya nakwa akwa mgbochi nke ọnụ ụzọ e si abanye nʼogige ahụ; ụdọ na ǹtu ịkpọgide ogige ahụ; ngwongwo niile nke ụlọ nzute ahụ, ụlọ ikwu nzute ahụ na uwe niile a kpara akpa, nke a na-eyi eje ozi nʼebe nsọ ahụ, ma uwe nsọ nke Erọn, onye nchụaja, na uwe nke ụmụ ya ndị ikom na-eyi mgbe ha na-eje ozi ha dịka ndị nchụaja. Ndị Izrel niile rụzuru ọrụ ndị a niile dịka ONYENWE ANYị si nye ya Mosis nʼiwu. Mosis nʼonwe ya hụkwara ọrụ ndị a niile, nabata ya ka nke e jere dịka iwu ONYENWE ANYị nyere si dị. Nʼihi ya, Mosis gọziri ha.