Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌPUPU 31

31
1Jehova we gwa Moses okwu, si, 2Le, akpọwom Bezalel n'aha, bú nwa Uri, nwa Hua, nke ebo Juda: 3emejuwokwam ya na Mọ nke Chineke, n'amam-ihe, na nime nghọta, na n'ihe-ọmuma, na n'ije-ozi ọ bula, 4icheputa ọlu onye-ọ̀kà di iche iche, ilu ọlu n'ọla-edo, na n'ọla-ọcha, na n'ọla, 5na n'ilu ọlu onye-ọ̀kà na idukọta ya adukọta, na n'ilu ọlu onye-ọ̀kà n'osisi, ilu ọlu n'ije-ozi ọ bula. 6Ma Mu onwem, le, enyewom Ọhọliab tiyere ya, bú nwa Ahisamak, nke ebo Dan; ọ bu kwa n'obi onye ọ bula nke nwere obi amam-ihe ka M'tiyeworo amam-ihe, ka ha we me ihe nile nke M'nyeworo gi n'iwu: 7ulo-ikwū nzute, na ib͕e nke diri ihe-àmà ahu, na ebe-nkpuchi-nmehie nke di n'elu ya, na ihe nile nke Ulo-ikwū ahu; 8na table ahu na ihe-ya nile, na ihe-idọba-oriọna nke ọla-edo anāgwaghi agwa na ihe-ya nile, na ebe-ichu-àjà nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, 9na ebe-ichu-aja nke àjà-nsure-ọku na ihe-ya nile, na ite ọsisa-miri ahu na ukwu-ala-ya: 10na uwe nile akpara nke ọma, na uwe nsọ nile Eron, bú onye-nchu-aja, nwere, na uwe nile nke umu-ya ndikom, ibu ndi-nchu-àjà; 11na manu nke otite-manu, na ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me, bú nke diri ebe nsọ ahu: dika ihe M'nyeworo gi n'iwu si di, otú a ka ha gēme.
12Jehova we gwa Moses okwu, si, 13Gi onwe-gi kwa, gwa umu Israel okwu, si, N'ezie ubọchi-izu-ikem nile ka unu gēdebe: n'ihi na ihe-iriba-ama ka ọ bu n'etiti Mu na unu rue ọb͕ọ-unu nile; ka unu we mara na Mu onwem bu Jehova Nke nēdo unu nsọ. 14Unu gēdebe kwa ubọchi-izu-ikem; n'ihi na nsọ ka ọ diri unu: onye nēme ya ka ọ ghara idi nsọ, aghaghi ime ka ọ nwua: n'ihi na onye ọ bula nke nēje ozi nime ya, agēbipu onye ahu n'etiti umu-nna-ya. 15Ubọchi isi ka agēje ozi; ma n'ubọchi nke-asa ubọchi-izu-ike nke idebe-ubọchi-izu-ike di, ọ bu ihe nsọ Jehova nwere: onye ọ bula nke nēje ozi n'ubọchi-izu-ike, aghaghi ime ka ọ nwua. 16Ma umu Israel gēdebe ubọchi-izu-ike, ime ememe ubọchi-izu-ike ahu rue ọb͕ọ-ha nile, ọ bu ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi. 17Ihe-iriba-ama ka ọ bu n'etiti Mu na umu Israel rue mb͕e ebighi-ebi: n'ihi na n'ubọchi isi ka Jehova mere elu-igwe na uwa, ma ọ bu n'ubọchi nke-asa ka Ọ kwusiri n'ọlu-Ya, wee zuru ike.
18Mb͕e Ọ kpayesiri Moses uka n'ugwu Sainai, O we nye ya mbadamba nkume abua nke ihe-àmà ahu, bú mbadamba nkume, nke ewere nkpisi-aka Chineke de ihe n'elu ha.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ỌPUPU 31: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara