Jehova we gwa Moses okwu, si, Gi onwe-gi kwa, gwa umu Israel okwu, si, N'ezie ubọchi-izu-ikem nile ka unu gēdebe: n'ihi na ihe-iriba-ama ka ọ bu n'etiti Mu na unu rue ọb͕ọ-unu nile; ka unu we mara na Mu onwem bu Jehova Nke nēdo unu nsọ. Unu gēdebe kwa ubọchi-izu-ikem; n'ihi na nsọ ka ọ diri unu: onye nēme ya ka ọ ghara idi nsọ, aghaghi ime ka ọ nwua: n'ihi na onye ọ bula nke nēje ozi nime ya, agēbipu onye ahu n'etiti umu-nna-ya. Ubọchi isi ka agēje ozi; ma n'ubọchi nke-asa ubọchi-izu-ike nke idebe-ubọchi-izu-ike di, ọ bu ihe nsọ Jehova nwere: onye ọ bula nke nēje ozi n'ubọchi-izu-ike, aghaghi ime ka ọ nwua. Ma umu Israel gēdebe ubọchi-izu-ike, ime ememe ubọchi-izu-ike ahu rue ọb͕ọ-ha nile, ọ bu ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi. Ihe-iriba-ama ka ọ bu n'etiti Mu na umu Israel rue mb͕e ebighi-ebi: n'ihi na n'ubọchi isi ka Jehova mere elu-igwe na uwa, ma ọ bu n'ubọchi nke-asa ka Ọ kwusiri n'ọlu-Ya, wee zuru ike.
Gụọ ỌPUPU 31
Geere nke a ntị ỌPUPU 31
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ỌPUPU 31:12-17
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị