Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌPUPU 15:19-27

ỌPUPU 15:19-27 IGBOB

N'ihi na inyinya nile nke Fero, ha na ub͕ọ-ala-ya nile na ndi-inyinya-ya, bara nime oké osimiri, Jehova we me ka miri nke oké osimiri lata n'aru ha; ma umu Israel jere ije n'elu ala-akọrọ n'etiti oké osimiri. Miriam, bú nwayi-amuma, bú nwa-nne-nwayi Eron, we were egwú-otiti n'aka-ya; ndinyom nile we chiri egwú-otiti na ite-egwú soro ya pua. Miriam we za ha, si, Unu bukue Jehova abù, n'ihi na O biliwo elu nke-uku; Inyinya na onye o nēbu, Ọ tubàwo ha n'oké osimiri. Moses we me ka Israel si n'Oké Osimiri Uhie bulie ije, ha we pua ba n'ọzara Shua; ha we je ije ubọchi atọ n'ọzara ahu, ma ha achọtaghi miri. Ha we biarue Mara, ma ha apughi iṅu miri nke Mara, n'ihi na ilu ka ha di: n'ihi nka akpọrọ aha-ya Mara. Ndi Israel we tamu ntamu megide Moses, si, Gini ka ayi gāṅu? Ọ we tikue Jehova; Jehova we me ka ọ hu otù osisi, ọ tubà ya na miri ahu, miri ahu we di utọ. N'ebe ahu ka O doro ukpuru na ikpé nye ha, ọ bu kwa n'ebe ahu ka Ọ nwara ha; si, Ọ buru na i ge nti nke-ọma n'olu Jehova, bú Chineke-gi, ọ buru kwa na i me ihe nke ziri ezi n'anya-Ya, ọ buru kwa na i ṅa nti n'ihe Ọ nyere n'iwu, ọ buru kwa na i debe ukpuru-Ya nile, ọ dighi ọria ọ bula nke M'tiyere n'aru ndi Ijipt M'gētiye n'aru gi: n'ihi na Mu onwem bu Jehova Nke nēme ka aru di gi nma. Ha biarue Ilim, ebe isi-iyi iri na abua na ọgu nkwu atọ na iri di: ha we ma ulo-ikwū-ha n'ebe ahu n'akuku miri.