Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌPUPU 15:1-18

ỌPUPU 15:1-18 IGBOB

Mb͕e ahu Moses na umu Israel nābukuru Jehova abù a, ha kwue, si, Ka m'bukue Jehova abù, n'ihi na O biliwo elu nke-uku: Inyinya na onye o nēbu, Ọ tubàwo ha n'oké osimiri. Ikem na abù ọmam ka Ja bu, Ọ we ghọrọm nzọputa: Onye a bu Chinekem, m'gēme kwa Ya ka Ọ di elu; Chineke nke nnam, m'gēweli kwa Ya elu. Jehova bu onye-agha: Jehova bu aha-Ya. Ub͕ọ-ala Fero nile na usu-ndi-agha-ya ka O tufuworo n'oké osimiri: Ndi-isi-agha-ya arọputara arọputa, ha emikpuwo emikpu n'Oké Osimiri Uhie. Ob͕u-miri nēkpuchi ha: Ha aridawo na miri di omìmì dika nkume. Jehova, aka-nri-Gi, nke di ebube n'ike, Jehova, aka-nri-Gi nētipia onye-iro. N'idi-ọtutu nke nbili-elu-Gi ka I nākwada ndi nēbili megide Gi: I nēzipu iwe-Gi di ọku, o richapu ha dika ahihia-ọka. Ewere iku-ume nke oghere-imi-Gi me ka miri tua obo, Nrurù-miri guzoro onwe-ha ọtọ dika obo; Ob͕u-miri raruru aruru n'obi oké osimiri. Onye-iro siri, M'gāchu, m'gēru ha aru, m'gēkesa ihe m'kwatara: Nkpuru-obim gējuputa na ha, M'gāmipu mma-agham, akam gā-napu ha ihe nile. I were ifufe-Gi fe, oké osimiri kpuchiri ha: Ha mikpuru dika opù nime miri di ebube. Ònye di ka Gi n'etiti chi nile, Jehova? Ònye di ka Gi, di ebube n'idi-nsọ? Onye anātu egwu n'otuto nile, nēme ihe-ebube di iche iche. I setiri aka-nri-Gi, Ala elo ha. N'ebere-Gi ka I duworo ndi nke I b͕aputaworo: N'ike-Gi ka I duworo ha nwayọ rue ebe-obibi-Gi di nsọ. Ndi ọzọ anuwo, ha ama jijiji: Ihe-nb͕u eb͕uwo ndi bi na Filistia. Mb͕e ahu ka obi lọrọ ndi-isi Edom miri: Ebulu nke Moab, ọma-jijiji nējide ha: Ndi nile bi na Kenean ab͕azewo. Oké ujọ na oké egwù nādakwasi ha; N'idi-uku nke ogwe-aka-Gi ha nọ jū dika nkume; Rue mb͕e ndi-Gi gāgabiga, Jehova, Rue mb͕e ndi nke I nwetara gāgabiga. I gēme ka ha bata, I gāku kwa ha n'ugwu nke ihe-nketa-Gi, Bú ọnọdu guzosiri ike I meworo, ka ọ we buru ebe I gēbi, Jehova, Ebe di nsọ, Onye-nwe-ayi, nke aka-Gi abua meworo ka o guzosi ike. Jehova gābu eze rue mb͕e nile ebighi-ebi.