Ubọchi a gāburu unu ihe-ncheta, unu gēme kwa ya ka ọ buru ememe unu nēmere Jehova: n'ọb͕ọ nile unu ka unu ganēme ya ka ọ buru ememe site n'ukpuru ebighi-ebi. Ubọchi asa ka unu gēri achicha ekoghi-eko; ọ buná n'ubọchi mbu ka unu gēme ka ihe nēko achicha ghara idi n'ulo nile unu: n'ihi na onye ọ bula nke nēri achicha koro eko site n'ubọchi mbu rue ubọchi nke-asa, agēbipu madu ahu n'Israel. N'ubọchi mbu nkpọkọta di nsọ gādi, n'ubọchi nke-asa nkpọkọta di nsọ gādi-kwa-ra unu; ọ dighi ozi ọ bula agēje nime ha, nání ihe onye ọ bula gēri, nání nke ahu ka unu gēme. Unu gēdebe kwa ememe achicha ekoghi-eko; n'ihi na ọ bu nime otù ubọchi a ka M'meworo ka usu nile nke ndi-agha-unu si n'ala Ijipt puta: unu gēdebe kwa ubọchi a rue ọb͕ọ nile unu site n'ukpuru ebighi-ebi. N'onwa mbu, n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa ahu n'anyasi, ka unu gēri achicha ekoghi-eko, rue ubọchi nke-orú-na-otù nke ọnwa ahu n'anyasi. Ubọchi asa ka anāgaghi-ahu ihe nēko achicha n'ulo nile unu: n'ihi na onye ọ bula nke nēri achicha koro eko, agēbipu madu ahu nime nzukọ Israel, ma n'etiti ndi-ọbìa, ma n'etiti ndi amuru n'ala. Unu agaghi-eri achicha ọ bula koro eko; n'ebe-obibi-unu nile ka unu gēri achicha ekoghi-eko.
Moses we kpọ ndi-okenye nile nke Israel, si ha, Kpuputanu, chiri kwa ìgwè ewu na aturu n'onwe-unu, dika ab͕uru-unu nile si di, b͕u-kwa-nu anu ngabiga nka. Unu gēwere kwa ùkwù hyssop, sue ya n'ọbara nke di n'ọkwa, were ya jua ọbara ufọdu nke di n'ọkwa elu-uzọ na n'awara-uzọ abua; unu onwe-unu agaghi-apu kwa, onye ọ bula n'ọnu-uzọ ulo-ya, rue ututu. N'ihi na Jehova gāgabiga iti ndi Ijipt ihe; ma mb͕e Ọ huru ọbara ahu n'elu elu-uzọ na n'elu awara-uzọ abua, Jehova gāgabiga ọnu-uzọ ahu, Ọ gaghi-ekwe onye-nbibì ahu ka ọ ba n'ulo-unu iti unu ihe. Unu gēdebe kwa ihe a ka ọ buru ukpuru n'ebe i nọ na n'ebe umu-gi nọ rue mb͕e ebighi-ebi. O gēru kwa, mb͕e unu gābà n'ala ahu nke Jehova gēnye unu, dika O kwuworo, na unu gēdebe òfùfè a. O gēru kwa, mb͕e umu-unu gāsi unu, Gini bu òfùfè a unu nwere? na unu gāsi, Àjà ngabiga ka ọ bu nke anāchuru Jehova, Onye gabigara ulo nile nke umu Israel n'Ijipt, mb͕e O tiri ndi Ijipt ihe, O we naputa ulo nile ayi. Ndi Israel we rube isi, kpọ isi ala. Umu Israel we je me ya; dika Jehova nyere Moses na Eron iwu, otú a ka ha mere.
O rue, n'etiti abali, na Jehova tib͕uru nwa ọ bula eburu uzọ mu n'ala Ijipt, site na nwa eburu uzọ muru Fero nke nānọkwasi n'oche-eze-ya rue nwa eburu uzọ muru onye adọtara n'agha nke nọ n'ulo olùlù; O tib͕u-kwa-ra nwa anumanu ọ bula eburu uzọ mu. Fero we bilie n'abali, ya onwe-ya, na ndi-orù-ya nile, na ndi Ijipt nile; oké iti-nkpu we di n'Ijipt; n'ihi na ọ dighi ulo ebe onye nwuru anwu nādighi. O we kpọ Moses na Eron n'abali, si, Bilienu, si n'etiti ndim pua, ma unu onwe-unu ma umu Israel; je-kwa-nu, fè Jehova, dika unu kwuru. Chirinu ma ìgwè ewu na aturu-unu ma ìgwè ehi-unu, dika unu kwuru, jenu; gọzi-kwa-num. Ndi Iiipt we di ike n'aru ndi Israel izipu ha n'ala-ha ngwa ngwa; n'ihi na ha siri, Ayi nile bu ndi nwuru anwu. Ndi Israel we buru utu ọka flour-ha agwọrọ agwọ tutu o ko, ebe ekere ihe-ha eji agwọ achicha n'uwe-nb͕okwasi-ha tukwasi n'ubu-ha. Umu Israel me-kwa-ra dika okwu Moses si di; ha we riọ n'aka ndi Ijipt ihe ọla-ọcha, na ihe ọla-edo, na uwe-nb͕okwasi: Jehova we nye ndi Israel amara n'iru ndi Ijipt, ha we me ka ha riọta ihe. Ha we napu ndi Ijipt ihe-ha.
Umu Israel we bulie ije site na Rameses rue Sukot, ihe ra ka orú nnù ndikom ọgu uzọ atọ na orú nnù uzọ iri-na-ise, ndi ji ukwu eje, bú ndikom, nāgughi umu-ntakiri. Ọzọ kwa, ọtutu ndi gwara ọgwa soro ha rigo; na ìgwè ewu na aturu, na ìgwè ehi, anu-ulo riri nne nke-uku. Ha we were utu ọka flour agwọrọ agwọ, bú nke ha si n'Ijipt bute, sie achicha ekoghi-eko, n'ihi na o koghi eko; n'ihi na achupuru ha n'Ijipt, ha apughi kwa inọ ọdù, ọzọ kwa, ọ dighi ihe iri n'uzọ ha doziri onwe-ha. Ma obibi umu Israel, nke ha biri n'Ijipt, di nnù arọ na orú arọ na iri. O rue, n'ọgwugwu nnù arọ na orú arọ na iri ahu, ọ bu kwa n'otù ubọchi ahu ka o ruru, na usu nile nke ndi-agha Jehova siri n'ala Ijipt pua. Abali nche ka ọ buru Jehova ime ka ha si n'ala Ijipt puta: otù abali ahu bu abali nche diri Jehova nke umu Israel nile nwere rue ọb͕ọ nile ha.
Jehova we si Moses na Eron, Nka bu ukpuru ngabiga ahu: ọ dighi onye ala ọzọ gēri ya: ma orù ọ bula nke onye ọ bula, bú nke ejiri ego b͕ata, mb͕e i bìworo ya úgwù, mb͕e ahu o gēri ya. Onye-nnọdu na onye egoro ọlu agaghi-eri ya. N'otù ulo ka agēri ya; i gaghi-esi n'ulo wepu ihe ọ bula n'anu-aru-ya n'èzí; ọ dighi kwa ọkpukpu unu gētiji nime ya. Nzukọ nile nke Israel gēme ya. Ma mb͕e ọbìa gānọ n'ala-gi dika ọbìa, mb͕e ọ gēme-kwa-ra Jehova ememe ngabiga, ka ebìe nwoke ọ bula ọ nwere úgwù, mb͕e ahu ya biarue nso ime ya; ọ gādi kwa ka onye amuru n'ala: ma ọ dighi onye ọ bula anēbighi úgwù gēri ya. Otù iwu ka ha gēnwe, bú onye amuru n'ala na ọbìa nke nọ dika ọbìa n'etiti unu. Umu Israel nile we me ya; dika Jehova nyere Moses na Eron iwu, otú a ka ha mere. O rue, n'otù ubọchi ahu, na Jehova mere ka umu Israel si n'ala Ijipt puta n'usu nile nke ndi-agha-ha.