ỌPUPU 12:14-51
ỌPUPU 12:14-51 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Ụbọchị a ga-abụrụ unu ihe ncheta nye ọgbọ niile ndị na-eso nʼazụ. Unu ga-emekwa ya ka ọ bụrụ mmemme nye ONYENWE ANYị. Ụkpụrụ nke na-adịgide adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. Ụbọchị asaa ka unu ga-eri achịcha na-ekoghị eko. Nʼụbọchị mbụ nke ụbọchị asaa ahụ, ka unu ga-esite nʼụlọ unu wezuga ihe iko achịcha niile, nʼihi na onye ọbụla riri nri nke ihe na-eko achịcha dị nʼime ya site nʼụbọchị mbụ ruo nʼụbọchị nke asaa, aghaghị ibipụ ya site nʼala Izrel. Unu ga-ewere ụbọchị mbụ na ụbọchị nke asaa, nke mmemme ahụ, nwee mkpọkọta dị nsọ. Onye ọbụla agaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị abụọ ndị a, karịakwa isi nri unu ga-eri. “Unu ga-edobekwa mmemme achịcha na-ekoghị eko nʼihi na ọ bụ nʼime otu ụbọchị a ka m sitere nʼala Ijipt kpọpụta unu dịka usuu ndị agha. Unu ga-emekwa mmemme ụbọchị a ka ọ bụrụ ụkpụrụ nke na-adịgide adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ Nʼọnwa mbụ, nʼanyasị nke ụbọchị nke iri na anọ, ka unu ga-eri achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee ruo nʼanyasị nke ụbọchị iri abụọ na otu. Nʼime ụbọchị asaa ahụ, agaghị ahụ ihe na-eko achịcha nʼụlọ unu. A ga-esite nʼọgbakọ ndị Izrel bipụ onye ọbụla riri ihe ọbụla nke ihe na-eko achịcha dị nʼime ya. Iwu a dịrị ndị ọbịa niile nʼala Izrel, dịkwara ndị nwa afọ ala. Unu agaghị eri ihe ọbụla e ji ihe na-eko achịcha mee. Nʼebe obibi unu niile, ọ bụ naanị achịcha na-ekoghị eko ka unu ga-eri.” Mgbe ahụ, Mosis kpọkọtara ndị okenye ụmụ Izrel niile gwa ha okwu sị, “Gaanụ họpụta ụmụ atụrụ nʼihi agbụrụ unu niile, gbuonụ atụrụ ngabiga ndị a. Were ahịhịa hisọp, denye ya nʼọbara si nʼatụrụ ndị a nke a ga-awụnye nʼefere, tee ya nʼelu ibo na nʼakụkụ abụọ nke ọnụ ụzọ ụlọ unu. Onye ọbụla nʼime unu agaghị apụ nʼezi tutu ruo ụtụtụ. Mgbe ONYENWE ANYị ga-agafe igbu ndị Ijipt, ọ ga-ahụ ọbara ahụ nʼawara na mbudo ibo ọnụ ụzọ ụlọ unu. Ọ ga-agafe ụlọ unu, gharakwa ikwe ka onye mbibi bata nʼụlọ unu gbuo unu. “Unu ga-edobe mmemme a dịka iwu ga-adịgide nye unu na ụmụ unu. Mgbe unu batara nʼala ahụ ONYENWE ANYị ga-enye unu dịka o kwere na nkwa, unu ga-edobe ofufe a. Mgbe ụmụ unu ga-ajụ unu ajụjụ sị, ‘Gịnị ka ofufe a pụtara?’ Unu ga-azaghachi ha sị, ‘Ọ bụ aja ngabiga anyị na-achụrụ ONYENWE ANYị nʼihi na ọ gafere ụlọ ụmụ Izrel nʼala Ijipt, mgbe o gburu ndị Ijipt, ma o nweghị onye ọbụla nʼime anyị o gburu.’ ” Ụmụ Izrel mezuru ihe niile ONYENWE ANYị gwara ha site nʼọnụ Mosis na Erọn. Nʼime etiti abalị ụbọchị ahụ, ONYENWE ANYị gburu ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt, malite nʼọkpara Fero onye nọ nʼocheeze ya, ruo nʼọkpara nke onye Ijipt nọ nʼụlọ mkpọrọ olulu. O gbukwara ụmụ anụ ụlọ niile e bụ ụzọ mụọ. Nʼabalị ahụ kwa, Fero na ndị ozi ya, na ndị Ijipt niile biliri. Oke iti mkpu akwa dakwara nʼala Ijipt, nʼihi na ọ dịghị ezinaụlọ ọnwụ na-erughị. Nʼotu abalị ahụ, Fero zipụrụ ozi ka a kpọ Mosis na Erọn. Mgbe ha bịara, ọ gwara ha sị, “Ngwa bilienụ, unu bụ ụmụ Izrel niile. Kewapụnụ onwe unu site nʼetiti anyị. Gaanụ, fee ONYENWE ANYị unu ofufe dịka unu rịọrọ. Durunụ igwe ehi na atụrụ unu mgbe unu na-aga. Gọziekwanụ m mgbe unu na-apụ.” Ndị Ijipt gbalịrị ime ka ụmụ Izrel hapụ ha ngwangwa. Ha sịrịtara onwe ha, “Ọ bụrụ na ụmụ Izrel ahapụghị anyị ugbu a, anyị niile ga-anwụkwa.” Ya mere, ụmụ Izrel buuru ụtụ ọka e ji eme achịcha na-ekoghị eko, nke ha tinyere nʼefere e ji agwakọta ya. Ha ji akwa kechie ha, bukwasị ha nʼubu ha. Ha mekwara ihe ndị ọzọ dịka Mosis gwara ha. Ha rịọrọ ndị Ijipt ka ha nye ha ihe iji ngwa nke ọlaọcha na ọlaedo, na uwe. ONYENWE ANYị nyere ndị ya amara nʼihu ndị Ijipt, ha nyere ha ihe niile ha rịọrọ. Site nʼụzọ dị otu a, ụmụ Izrel napụtara ndị Ijipt ihe niile ha ji biri nʼụlọ. Mgbe nke a gasịrị, ụmụ Izrel malitere ije ha site na Ramesis. Mgbe ha hapụrụ Ramesis, na-eje Sukọt, ha dị narị puku ndị ikom isii, na-agụghị ndị inyom na ụmụntakịrị. Ọtụtụ mmadụ dị iche iche sooro ha nʼije ha. Ha dukwa igwe anụ ụlọ, igwe ewu na atụrụ ha, nke dị ukwu nʼọnụọgụgụ. Ha ji ụtụ ọka ha si Ijipt buputa mee achịcha na-ekoghị eko. Nʼihi na a chụpụrụ ha achụpụ site nʼIjipt, ha enweghị ezi ohere kwadooro onwe ha ihe oriri. Tupu ha ahapụ ala Ijipt, ụmụ Izrel ebiela nʼebe ahụ narị afọ anọ na iri afọ atọ. Mgbe narị afọ anọ na iri afọ atọ zuru, nʼụbọchị ahụ o zuru, usuu ndị ONYENWE ANYị niile hapụrụ Ijipt. ONYENWE ANYị chere nche nʼabalị ụbọchị ahụ maka ịkpọpụta ha site nʼala Ijipt. Nʼihi ya, abalị ụbọchị ahụ bụ mgbe pụrụ iche nye ụmụ Izrel maka iji iche nche sọpụrụ ONYENWE ANYị nʼọgbọ ha niile. ONYENWE ANYị kpọrọ Mosis na Erọn gwa ha sị, “Ndị a bụ usoro iwu metụtara Mmemme Ngabiga: “Onye mba ọzọ agaghị eri anụ nwa atụrụ ahụ. Ohu ọbụla a kwụrụ ụgwọ nʼisi ya ga-eri ya naanị ma e biri ya ugwu. Ohu e goro ọrụ, maọbụ onye ọbịa ọbụla agaghị eri ya. “A ga-eri ya naanị nʼime otu ụlọ. Ọ gaghị apụ nʼezi. Unu agaghị atapịa ọkpụkpụ ọbụla nke nwa atụrụ ahụ. Nzukọ niile nke ụmụ Izrel ga-eme Mmemme Ngabiga a. “Onye mba ọzọ bi nʼetiti unu chọrọ isoro unu na Mmemme Ngabiga ONYENWE ANYị aghaghị ibi ndị ikom niile nọ nʼezinaụlọ ya ugwu. Mgbe ahụ, ọ ga-abịaru nso isoro na mmemme, nʼihi na a ga-agụ ya dịka nwa afọ ala. Ọ dịghị onye ikom a na-ebighị ugwu ga-eri nri ahụ. Otu iwu a dịrị nwa afọ ala na ndị ọbịa niile bi nʼala Izrel.” Ụmụ Izrel mere ihe ndị a niile, dịka ONYENWE ANYị nyere ha nʼiwu site nʼọnụ Mosis na Erọn. Ọ bụkwa nʼotu ụbọchị ahụ ka ONYENWE ANYị sitere nʼala Ijipt dupụta ụmụ Izrel, dịka usuu ha niile si dị.
ỌPUPU 12:14-51 Bible Nso (IGBOB)
Ubọchi a gāburu unu ihe-ncheta, unu gēme kwa ya ka ọ buru ememe unu nēmere Jehova: n'ọb͕ọ nile unu ka unu ganēme ya ka ọ buru ememe site n'ukpuru ebighi-ebi. Ubọchi asa ka unu gēri achicha ekoghi-eko; ọ buná n'ubọchi mbu ka unu gēme ka ihe nēko achicha ghara idi n'ulo nile unu: n'ihi na onye ọ bula nke nēri achicha koro eko site n'ubọchi mbu rue ubọchi nke-asa, agēbipu madu ahu n'Israel. N'ubọchi mbu nkpọkọta di nsọ gādi, n'ubọchi nke-asa nkpọkọta di nsọ gādi-kwa-ra unu; ọ dighi ozi ọ bula agēje nime ha, nání ihe onye ọ bula gēri, nání nke ahu ka unu gēme. Unu gēdebe kwa ememe achicha ekoghi-eko; n'ihi na ọ bu nime otù ubọchi a ka M'meworo ka usu nile nke ndi-agha-unu si n'ala Ijipt puta: unu gēdebe kwa ubọchi a rue ọb͕ọ nile unu site n'ukpuru ebighi-ebi. N'onwa mbu, n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa ahu n'anyasi, ka unu gēri achicha ekoghi-eko, rue ubọchi nke-orú-na-otù nke ọnwa ahu n'anyasi. Ubọchi asa ka anāgaghi-ahu ihe nēko achicha n'ulo nile unu: n'ihi na onye ọ bula nke nēri achicha koro eko, agēbipu madu ahu nime nzukọ Israel, ma n'etiti ndi-ọbìa, ma n'etiti ndi amuru n'ala. Unu agaghi-eri achicha ọ bula koro eko; n'ebe-obibi-unu nile ka unu gēri achicha ekoghi-eko. Moses we kpọ ndi-okenye nile nke Israel, si ha, Kpuputanu, chiri kwa ìgwè ewu na aturu n'onwe-unu, dika ab͕uru-unu nile si di, b͕u-kwa-nu anu ngabiga nka. Unu gēwere kwa ùkwù hyssop, sue ya n'ọbara nke di n'ọkwa, were ya jua ọbara ufọdu nke di n'ọkwa elu-uzọ na n'awara-uzọ abua; unu onwe-unu agaghi-apu kwa, onye ọ bula n'ọnu-uzọ ulo-ya, rue ututu. N'ihi na Jehova gāgabiga iti ndi Ijipt ihe; ma mb͕e Ọ huru ọbara ahu n'elu elu-uzọ na n'elu awara-uzọ abua, Jehova gāgabiga ọnu-uzọ ahu, Ọ gaghi-ekwe onye-nbibì ahu ka ọ ba n'ulo-unu iti unu ihe. Unu gēdebe kwa ihe a ka ọ buru ukpuru n'ebe i nọ na n'ebe umu-gi nọ rue mb͕e ebighi-ebi. O gēru kwa, mb͕e unu gābà n'ala ahu nke Jehova gēnye unu, dika O kwuworo, na unu gēdebe òfùfè a. O gēru kwa, mb͕e umu-unu gāsi unu, Gini bu òfùfè a unu nwere? na unu gāsi, Àjà ngabiga ka ọ bu nke anāchuru Jehova, Onye gabigara ulo nile nke umu Israel n'Ijipt, mb͕e O tiri ndi Ijipt ihe, O we naputa ulo nile ayi. Ndi Israel we rube isi, kpọ isi ala. Umu Israel we je me ya; dika Jehova nyere Moses na Eron iwu, otú a ka ha mere. O rue, n'etiti abali, na Jehova tib͕uru nwa ọ bula eburu uzọ mu n'ala Ijipt, site na nwa eburu uzọ muru Fero nke nānọkwasi n'oche-eze-ya rue nwa eburu uzọ muru onye adọtara n'agha nke nọ n'ulo olùlù; O tib͕u-kwa-ra nwa anumanu ọ bula eburu uzọ mu. Fero we bilie n'abali, ya onwe-ya, na ndi-orù-ya nile, na ndi Ijipt nile; oké iti-nkpu we di n'Ijipt; n'ihi na ọ dighi ulo ebe onye nwuru anwu nādighi. O we kpọ Moses na Eron n'abali, si, Bilienu, si n'etiti ndim pua, ma unu onwe-unu ma umu Israel; je-kwa-nu, fè Jehova, dika unu kwuru. Chirinu ma ìgwè ewu na aturu-unu ma ìgwè ehi-unu, dika unu kwuru, jenu; gọzi-kwa-num. Ndi Iiipt we di ike n'aru ndi Israel izipu ha n'ala-ha ngwa ngwa; n'ihi na ha siri, Ayi nile bu ndi nwuru anwu. Ndi Israel we buru utu ọka flour-ha agwọrọ agwọ tutu o ko, ebe ekere ihe-ha eji agwọ achicha n'uwe-nb͕okwasi-ha tukwasi n'ubu-ha. Umu Israel me-kwa-ra dika okwu Moses si di; ha we riọ n'aka ndi Ijipt ihe ọla-ọcha, na ihe ọla-edo, na uwe-nb͕okwasi: Jehova we nye ndi Israel amara n'iru ndi Ijipt, ha we me ka ha riọta ihe. Ha we napu ndi Ijipt ihe-ha. Umu Israel we bulie ije site na Rameses rue Sukot, ihe ra ka orú nnù ndikom ọgu uzọ atọ na orú nnù uzọ iri-na-ise, ndi ji ukwu eje, bú ndikom, nāgughi umu-ntakiri. Ọzọ kwa, ọtutu ndi gwara ọgwa soro ha rigo; na ìgwè ewu na aturu, na ìgwè ehi, anu-ulo riri nne nke-uku. Ha we were utu ọka flour agwọrọ agwọ, bú nke ha si n'Ijipt bute, sie achicha ekoghi-eko, n'ihi na o koghi eko; n'ihi na achupuru ha n'Ijipt, ha apughi kwa inọ ọdù, ọzọ kwa, ọ dighi ihe iri n'uzọ ha doziri onwe-ha. Ma obibi umu Israel, nke ha biri n'Ijipt, di nnù arọ na orú arọ na iri. O rue, n'ọgwugwu nnù arọ na orú arọ na iri ahu, ọ bu kwa n'otù ubọchi ahu ka o ruru, na usu nile nke ndi-agha Jehova siri n'ala Ijipt pua. Abali nche ka ọ buru Jehova ime ka ha si n'ala Ijipt puta: otù abali ahu bu abali nche diri Jehova nke umu Israel nile nwere rue ọb͕ọ nile ha. Jehova we si Moses na Eron, Nka bu ukpuru ngabiga ahu: ọ dighi onye ala ọzọ gēri ya: ma orù ọ bula nke onye ọ bula, bú nke ejiri ego b͕ata, mb͕e i bìworo ya úgwù, mb͕e ahu o gēri ya. Onye-nnọdu na onye egoro ọlu agaghi-eri ya. N'otù ulo ka agēri ya; i gaghi-esi n'ulo wepu ihe ọ bula n'anu-aru-ya n'èzí; ọ dighi kwa ọkpukpu unu gētiji nime ya. Nzukọ nile nke Israel gēme ya. Ma mb͕e ọbìa gānọ n'ala-gi dika ọbìa, mb͕e ọ gēme-kwa-ra Jehova ememe ngabiga, ka ebìe nwoke ọ bula ọ nwere úgwù, mb͕e ahu ya biarue nso ime ya; ọ gādi kwa ka onye amuru n'ala: ma ọ dighi onye ọ bula anēbighi úgwù gēri ya. Otù iwu ka ha gēnwe, bú onye amuru n'ala na ọbìa nke nọ dika ọbìa n'etiti unu. Umu Israel nile we me ya; dika Jehova nyere Moses na Eron iwu, otú a ka ha mere. O rue, n'otù ubọchi ahu, na Jehova mere ka umu Israel si n'ala Ijipt puta n'usu nile nke ndi-agha-ha.