N'ihi nka, ebe unu tupuru okwu-ugha, nēkwunu ezi-okwu onye ọ bula n'ebe onye-ab͕ata-obi-ya nọ: n'ihi na ayi nāburita ihe di n'aru ibe-ayi. Unu emehiela mb͕e unu nēwe iwe: ekwela anyanwu da na nkpasu-iwe-unu: enye-kwa-la ekwensu uzọ. Ka onye nēzu ori ghara izu kwa ori ọzọ: kama ka ọ dọb͕u onwe-ya n'ọlu, nēji aka ya abua lu ezi ihe, ka o we nwe ihe ya na onye nọ na nkpà gēketa. Ka okwu ọ bula nke ruru aru ghara isi n'ọnu-unu puta, kama ihe bu ezi ihe, iwuli madu elu dika ulo, dika nkpà si di, ka o we nye ndi nānu ya amara. Unu eme-kwa-la ihe gēwuta Mọ Nsọ nke Chineke, Onye akara unu akàrà nime Ya rue ubọchi nb͕aputa. Ka ewepu ihe-ilu na ọnuma na iwe na iti-nkpu na nkwulu nile, ha na obi ọjọ nile, n'etiti unu: nweritanu obiọma n'aru ibe-unu, nwenu obi ọmiko, were-kwa-nu amara b͕aghara onwe-unu, dika Chineke were-kwa-ra amara b͕aghara unu nime Kraist.
Gụọ NDI EFESỌS 4
Geere nke a ntị NDI EFESỌS 4
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: NDI EFESỌS 4:25-32
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo