NDI EFESỌS 4:25-32
NDI EFESỌS 4:25-32 Bible Nso (IGBOB)
N'ihi nka, ebe unu tupuru okwu-ugha, nēkwunu ezi-okwu onye ọ bula n'ebe onye-ab͕ata-obi-ya nọ: n'ihi na ayi nāburita ihe di n'aru ibe-ayi. Unu emehiela mb͕e unu nēwe iwe: ekwela anyanwu da na nkpasu-iwe-unu: enye-kwa-la ekwensu uzọ. Ka onye nēzu ori ghara izu kwa ori ọzọ: kama ka ọ dọb͕u onwe-ya n'ọlu, nēji aka ya abua lu ezi ihe, ka o we nwe ihe ya na onye nọ na nkpà gēketa. Ka okwu ọ bula nke ruru aru ghara isi n'ọnu-unu puta, kama ihe bu ezi ihe, iwuli madu elu dika ulo, dika nkpà si di, ka o we nye ndi nānu ya amara. Unu eme-kwa-la ihe gēwuta Mọ Nsọ nke Chineke, Onye akara unu akàrà nime Ya rue ubọchi nb͕aputa. Ka ewepu ihe-ilu na ọnuma na iwe na iti-nkpu na nkwulu nile, ha na obi ọjọ nile, n'etiti unu: nweritanu obiọma n'aru ibe-unu, nwenu obi ọmiko, were-kwa-nu amara b͕aghara onwe-unu, dika Chineke were-kwa-ra amara b͕aghara unu nime Kraist.
NDI EFESỌS 4:25-32 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ya mere, wezuganụ ịgha ụgha, ka anyị niile kwuo eziokwu nye ndị agbataobi anyị, nʼihi na anyị niile bụ ndị e jikọtara nʼotu anụ ahụ. Mgbe ị na-ewe iwe emehiekwala. Ekwela ka anyanwụ daa mgbe ị ka nọ na-ewe iwe. Enyela ekwensu ohere. Ka onye na-ezu ohi kwụsị izu ohi. Kama ya jiri aka ya abụọ rụọ ezi ọrụ, ka o nwee ike inyere ndị ọzọ nọ na mkpa aka. Ka okwu rere ure ọbụla hapụ isite nʼọnụ unu pụta. Kama kwuonụ naanị ezi ihe nke ga-aba uru iwuli ndị ọzọ elu dịka mkpa ha si dị na iwetara ndị nụrụ ya ngọzị. Unu akpasukwala Mmụọ Nsọ nke Chineke iwe, onye a kara unu akara nʼime ya maka ụbọchị nke mgbapụta. Wepụnụ obi ilu niile, na obi ọjọọ na iwe, ya na nkwulu na ibu iro niile nʼetiti unu. Nʼọnọdụ ihe ndị a niile, nweenụ obi ebere nʼebe ibe unu nọ. Gbagharanụ ibe unu dịka Chineke sitere nʼamara ya gbaghara unu nʼihi na unu bụ nke Kraịst.