ka O we nye unu, dika àkù nke ebube-Ya si di, ka ewere ike me ka unu di ike site n'aka Mọ-Ya nābata nime madu ime unu; ka Kraist we site n'okwukwe-unu bigide nime obi-unu; ka unu, ebe unu b͕agideworo nkpọrọgwu nime ihu-n'anya buru kwa ndi atọworo ntọ-ala nime ya, ka unu we nara ike ighọta, unu na ndi nsọ nile, ihe bu obodobo na ogologo na idi-elu na omimi, na imara ihu-n'anya Kraist nke kariri ọmuma nke-uku ri nne, ka ewe me ka unu zue ezù rue ozuzù nile nke Chineke. Ma otuto diri Onye ahu Onye puru imebiga ókè nke-uku ri nne kari ihe nile nke ayi nāriọ ma-ọbu nke ayi nātughari uche, dika ike nke nālusi ike nime ayi si di, otuto diri Ya nime nzukọ-Ya na nime Kraist Jisus rue ọb͕ọ nile nke mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.
Gụọ NDI EFESỌS 3
Geere nke a ntị NDI EFESỌS 3
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: NDI EFESỌS 3:16-21
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị