Lezi-kwa-nu nkpuru-obi-unu anya nke-uku; n'ihi na unu ahughi udi ọ bula n'ubọchi Jehova si n'etiti ọku ahu gwa unu okwu na Horeb: ka unu we ghara ibibi onwe-unu, we mere onwe-unu arusi apiri api, bú udi nke oyiyi-ihe, ihe-atù nke oké ma-ọbu nwunye, ihe-atù nke anumanu ọ bula nke di n'uwa, ihe-atù nke nnunu ọ bula nke nwere nkù nke nēfe n'elu-igwe, ihe-atù nke ihe ọ bula nke nākpu akpu n'ala, ihe-atù nke azù ọ bula nke di na miri n'okpuru uwa: ka i we ghara kwa iweli anya-gi abua le elu-igwe, hu anyanwu na ọnwa na kpakpando, bú usu nile nke ihe elu-igwe, ewe duhie gi, i we kpọ isi ala nye ha, fè ha, bú ihe nke Jehova, bú Chineke-gi, kesaworo ndi nile n'okpuru elu-igwe nile. Ma Jehova ewerewo unu, me ka unu si n'oké ọku ígwè ahu, bú Ijipt, puta, iburu Ya ndi nketa, otú ọ di ta. Jehova wesa-kwa-ram iwe n'ihi okwu-unu, we ṅua iyi na m'gaghi-agabiga Jọdan, na m'gaghi-abà kwa n'ezi ala ahu, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ka ọ buru ihe-nketa: ma mu onwem gaje inwu n'ala nka, adighm-agabiga Jọdan: ma unu onwe-unu nāgabiga, unu gēnweta kwa ezi ala ahu. Lezienu onwe-unu anya, ka unu ghara ichezọ ọb͕ub͕a-ndu nke Jehova, bú Chineke-unu, nke unu na Ya b͕ara, unu we mere onwe-unu arusi apiri api, bú udi ihe ọ bula nke Jehova, bú Chineke-gi, nyere gi iwu bayere ya, si, Emela. N'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, ọku nēripia eripia ka ọ bu, Chineke ekworo.
Mb͕e i gāmu umu, na umu umu, unu we nọ di anya n'ala ahu, duhie onwe-unu, me arusi apiri api, bú udi ihe ọ bula, i we me ihe ọjọ n'anya Jehova, bú Chineke-gi, ikpasu Ya iwe: emewom ka elu-igwe na uwa b͕agide unu àmà ta, na unu gālapusi n'iyì ngwa ngwa n'ala ahu nke unu nāgabiga Jọdan ibà n'ebe ahu inweta ya; unu agaghi-eme ka ubọchi-unu di anya n'elu ya, kama agēkpochapu unu ekpochapu. Jehova gēme kwa ka unu b͕asa n'etiti ndi nile, unu gāfọdu kwa ndikom ole-na-ole n'etiti mba nile ọzọ, ebe Jehova gēduga unu. Unu gēfè kwa chi n'ebe ahu, ndi bu ọlu aka madu, bú osisi na nkume, nke nādighi-ahu uzọ, ha adighi-anu kwa ihe, ha adighi-eri ihe, ha adighi-anu kwa ísì. Ma asi na i si n'ebe ahu chọ Jehova, bú Chineke-gi, i gāchọta kwa Ya, mb͕e i were obi-gi nile na nkpuru-obi-gi nile jua ase Ya. Mb͕e nkpab͕u diri gi, mb͕e ihe nile ndia abiakwasiwo-kwa-ra gi, na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia i gālaghachikuru kwa Jehova, bú Chineke-gi, ge kwa olu-Ya nti: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, bu Chineke nwere obi-ebere; Ọ gaghi-ara gi aka, Ọ gaghi-ebibi kwa gi, Ọ gaghi-echezọ kwa ọb͕ub͕a-ndu nke nna-gi-hà, nke Ọ ṅuru ha iyi bayere ya. N'ihi na biko, jua ajuju bayere ubọchi nile gara aga, nke buru gi uzọ, site n'ubọchi mb͕e Chineke kere madu n'elu uwa, site kwa n'otù nsọtu elu-igwe we rue nsọtu elu-igwe ọzọ, ma ihe dika ihe uku a adiwo, ma-ọbu na anuwo ihe di ka ya. Ọ̀di ndi ọ bula nuru olu Chineke ka o nēsi n'etiti ọku kwue okwu, dika gi onwe-gi nuworo, we di ndu? Ma-ọbu Chineke, Ọ̀ nwawo ibà nime otù mba isi n'etiti ya were n'Onwe-ya mba ọzọ, n'ọnwunwa di iche iche, na n'ihe-iriba-ama di iche iche, na n'ihe-ebube di iche iche, na n'agha, na n'aka di ike, na n'ogwe-aka esetiri eseti, na n'oké egwu di iche iche, dika ihe nile si di nke Jehova, bú Chineke-unu, mere unu n'Ijipt n'anya-unu? Emewo ka gi onwe-gi hu ya, ka i we mara na Jehova, Ya onwe-ya bu Chineke; ọ dighi onye ọzọ ma-ọbughi Ya; N'elu-igwe ka O si me ka i nu olu-Ya, ka O we dọ gi aka na nti: n'elu uwa ka O me-kwa-ra gi ka i hu ọku uku Ya; i we nu okwu-Ya nile site n'etiti ọku ahu. Ma n'ihi na Ọ huru nna-gi-hà n'anya, O we rọputa nkpuru-ha nọchiri ha, O we were ike uku Ya me ka i si n'Ijipt puta n'iru Ya; ka O we napu mba uku di kwa ike kari gi ala-ha n'iru gi, ime ka i ba, ka O we nye gi ala-ha ibu ihe-nketa, otú ọ di ta. I mawo kwa ta, cheta-kwa-ra obi-gi, na Jehova, Ya onwe-ya bu Chineke n'elu-igwe di n'elu na n'elu uwa di n'okpuru: ọ dighi onye ọzọ. I gēdebe kwa ukpuru-Ya nile, na ihe nile O nyere n'iwu, nke Mu onwem nēnye gi n'iwu ta, ka o we diri gi nma, di-kwa-ra umu-gi gānọchi gi, ka i we me kwa ka ubọchi-gi di anya n'elu ala ahu, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, ubọchi nile.
Mb͕e ahu Moses kpaputara obodo atọ n'ofè Jọdan n'uzọ ọwuwa-anyanwu; ka ob͕u-madu we b͕alaga n'ebe ahu, bú onye nēb͕u ab͕ata-obi-ya nāmaghi ama, ma ya onwe-ya akpọghi ya asì na mb͕e gara aga; ka ọ we b͕alaga n'otù nime obodo ahu, we di ndu: bú Biza nime ọzara, n'ala ahu di lari, ka ọ diri ndi Reuben; na Remot nime Gilead, ka ọ diri ndi Gad; na Golan nime Beshan, ka ọ diri ndi Manase.
Nka bu kwa iwu ahu nke Moses doro n'iru umu Israel: ndia bu ihe-àmà, na ukpuru, na ikpé, nke Moses gwara umu Israel, mb͕e ha si n'Ijipt puta; n'ofè Jọdan, na ndagwurugwu ahu na ncherita-iru Bet-peoa, n'ala Saihon, bú eze ndi-Amorait, onye bi na Heshbon, onye Moses na umu Israel tib͕uru, mb͕e ha si n'Ijipt puta: ha we nweta ala-ya, na ala Og, bú eze Beshan, bú eze abua ndi-Amorait, ndi di n'ofè Jọdan n'uzọ ọwuwa-anyanwu; site n'Aroea, nke di n'usọ ndagwurugwu Anon, we rue ugwu Saion (nke ahu bu Heamon), na Araba nile n'ofè Jọdan n'uzọ ọwuwa-anyanwu, we rue oké osimiri nke Araba, n'okpuru nkpọrube Pisga.