DEUTERONOMI 4:15-49
DEUTERONOMI 4:15-49 Bible Nso (IGBOB)
Lezi-kwa-nu nkpuru-obi-unu anya nke-uku; n'ihi na unu ahughi udi ọ bula n'ubọchi Jehova si n'etiti ọku ahu gwa unu okwu na Horeb: ka unu we ghara ibibi onwe-unu, we mere onwe-unu arusi apiri api, bú udi nke oyiyi-ihe, ihe-atù nke oké ma-ọbu nwunye, ihe-atù nke anumanu ọ bula nke di n'uwa, ihe-atù nke nnunu ọ bula nke nwere nkù nke nēfe n'elu-igwe, ihe-atù nke ihe ọ bula nke nākpu akpu n'ala, ihe-atù nke azù ọ bula nke di na miri n'okpuru uwa: ka i we ghara kwa iweli anya-gi abua le elu-igwe, hu anyanwu na ọnwa na kpakpando, bú usu nile nke ihe elu-igwe, ewe duhie gi, i we kpọ isi ala nye ha, fè ha, bú ihe nke Jehova, bú Chineke-gi, kesaworo ndi nile n'okpuru elu-igwe nile. Ma Jehova ewerewo unu, me ka unu si n'oké ọku ígwè ahu, bú Ijipt, puta, iburu Ya ndi nketa, otú ọ di ta. Jehova wesa-kwa-ram iwe n'ihi okwu-unu, we ṅua iyi na m'gaghi-agabiga Jọdan, na m'gaghi-abà kwa n'ezi ala ahu, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ka ọ buru ihe-nketa: ma mu onwem gaje inwu n'ala nka, adighm-agabiga Jọdan: ma unu onwe-unu nāgabiga, unu gēnweta kwa ezi ala ahu. Lezienu onwe-unu anya, ka unu ghara ichezọ ọb͕ub͕a-ndu nke Jehova, bú Chineke-unu, nke unu na Ya b͕ara, unu we mere onwe-unu arusi apiri api, bú udi ihe ọ bula nke Jehova, bú Chineke-gi, nyere gi iwu bayere ya, si, Emela. N'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, ọku nēripia eripia ka ọ bu, Chineke ekworo. Mb͕e i gāmu umu, na umu umu, unu we nọ di anya n'ala ahu, duhie onwe-unu, me arusi apiri api, bú udi ihe ọ bula, i we me ihe ọjọ n'anya Jehova, bú Chineke-gi, ikpasu Ya iwe: emewom ka elu-igwe na uwa b͕agide unu àmà ta, na unu gālapusi n'iyì ngwa ngwa n'ala ahu nke unu nāgabiga Jọdan ibà n'ebe ahu inweta ya; unu agaghi-eme ka ubọchi-unu di anya n'elu ya, kama agēkpochapu unu ekpochapu. Jehova gēme kwa ka unu b͕asa n'etiti ndi nile, unu gāfọdu kwa ndikom ole-na-ole n'etiti mba nile ọzọ, ebe Jehova gēduga unu. Unu gēfè kwa chi n'ebe ahu, ndi bu ọlu aka madu, bú osisi na nkume, nke nādighi-ahu uzọ, ha adighi-anu kwa ihe, ha adighi-eri ihe, ha adighi-anu kwa ísì. Ma asi na i si n'ebe ahu chọ Jehova, bú Chineke-gi, i gāchọta kwa Ya, mb͕e i were obi-gi nile na nkpuru-obi-gi nile jua ase Ya. Mb͕e nkpab͕u diri gi, mb͕e ihe nile ndia abiakwasiwo-kwa-ra gi, na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia i gālaghachikuru kwa Jehova, bú Chineke-gi, ge kwa olu-Ya nti: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, bu Chineke nwere obi-ebere; Ọ gaghi-ara gi aka, Ọ gaghi-ebibi kwa gi, Ọ gaghi-echezọ kwa ọb͕ub͕a-ndu nke nna-gi-hà, nke Ọ ṅuru ha iyi bayere ya. N'ihi na biko, jua ajuju bayere ubọchi nile gara aga, nke buru gi uzọ, site n'ubọchi mb͕e Chineke kere madu n'elu uwa, site kwa n'otù nsọtu elu-igwe we rue nsọtu elu-igwe ọzọ, ma ihe dika ihe uku a adiwo, ma-ọbu na anuwo ihe di ka ya. Ọ̀di ndi ọ bula nuru olu Chineke ka o nēsi n'etiti ọku kwue okwu, dika gi onwe-gi nuworo, we di ndu? Ma-ọbu Chineke, Ọ̀ nwawo ibà nime otù mba isi n'etiti ya were n'Onwe-ya mba ọzọ, n'ọnwunwa di iche iche, na n'ihe-iriba-ama di iche iche, na n'ihe-ebube di iche iche, na n'agha, na n'aka di ike, na n'ogwe-aka esetiri eseti, na n'oké egwu di iche iche, dika ihe nile si di nke Jehova, bú Chineke-unu, mere unu n'Ijipt n'anya-unu? Emewo ka gi onwe-gi hu ya, ka i we mara na Jehova, Ya onwe-ya bu Chineke; ọ dighi onye ọzọ ma-ọbughi Ya; N'elu-igwe ka O si me ka i nu olu-Ya, ka O we dọ gi aka na nti: n'elu uwa ka O me-kwa-ra gi ka i hu ọku uku Ya; i we nu okwu-Ya nile site n'etiti ọku ahu. Ma n'ihi na Ọ huru nna-gi-hà n'anya, O we rọputa nkpuru-ha nọchiri ha, O we were ike uku Ya me ka i si n'Ijipt puta n'iru Ya; ka O we napu mba uku di kwa ike kari gi ala-ha n'iru gi, ime ka i ba, ka O we nye gi ala-ha ibu ihe-nketa, otú ọ di ta. I mawo kwa ta, cheta-kwa-ra obi-gi, na Jehova, Ya onwe-ya bu Chineke n'elu-igwe di n'elu na n'elu uwa di n'okpuru: ọ dighi onye ọzọ. I gēdebe kwa ukpuru-Ya nile, na ihe nile O nyere n'iwu, nke Mu onwem nēnye gi n'iwu ta, ka o we diri gi nma, di-kwa-ra umu-gi gānọchi gi, ka i we me kwa ka ubọchi-gi di anya n'elu ala ahu, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, ubọchi nile. Mb͕e ahu Moses kpaputara obodo atọ n'ofè Jọdan n'uzọ ọwuwa-anyanwu; ka ob͕u-madu we b͕alaga n'ebe ahu, bú onye nēb͕u ab͕ata-obi-ya nāmaghi ama, ma ya onwe-ya akpọghi ya asì na mb͕e gara aga; ka ọ we b͕alaga n'otù nime obodo ahu, we di ndu: bú Biza nime ọzara, n'ala ahu di lari, ka ọ diri ndi Reuben; na Remot nime Gilead, ka ọ diri ndi Gad; na Golan nime Beshan, ka ọ diri ndi Manase. Nka bu kwa iwu ahu nke Moses doro n'iru umu Israel: ndia bu ihe-àmà, na ukpuru, na ikpé, nke Moses gwara umu Israel, mb͕e ha si n'Ijipt puta; n'ofè Jọdan, na ndagwurugwu ahu na ncherita-iru Bet-peoa, n'ala Saihon, bú eze ndi-Amorait, onye bi na Heshbon, onye Moses na umu Israel tib͕uru, mb͕e ha si n'Ijipt puta: ha we nweta ala-ya, na ala Og, bú eze Beshan, bú eze abua ndi-Amorait, ndi di n'ofè Jọdan n'uzọ ọwuwa-anyanwu; site n'Aroea, nke di n'usọ ndagwurugwu Anon, we rue ugwu Saion (nke ahu bu Heamon), na Araba nile n'ofè Jọdan n'uzọ ọwuwa-anyanwu, we rue oké osimiri nke Araba, n'okpuru nkpọrube Pisga.
DEUTERONOMI 4:15-49 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Unu maara na unu ahụghị ụdịdị ONYENWE ANYị anya nʼụbọchị ahụ o sitere nʼọkụ gwa unu okwu nʼugwu Horeb. Ya mere kpachapụrụnụ onwe unu anya ka unu ghara imerụ onwe unu site nʼịkpụ oyiyi ọbụla dịka arụsị, ụdị oyiyi ihe ọbụla, maọbụ nʼụdị nwoke maọbụ nʼụdị nwanyị, maọbụ nʼụdị anụmanụ, maọbụ nʼụdị nnụnụ na-efe efe, maọbụ nʼụdị anụ na-akpụ akpụ, ma ọ bụkwanụ nʼụdị azụ bi na mmiri. Mgbe unu lere anya na mbara eluigwe hụ anyanwụ, ọnwa, na kpakpando, dịka ha si basaa na mbara eluigwe, unu ekwela ka unu bụrụ ndị a na-arafu ịkpọ isiala nye ha na ife ha ofufe bụ ihe ndị a ONYENWE ANYị Chineke unu kere nye mba niile bi nʼokpuru eluigwe. Ma banyere unu, Onyenwe anyị kpọọrọ unu, kpọpụta unu site nʼime ọkụ na-agbaze igwe, site nʼIjipt pụta, ka unu bụrụ ihe nketa ya, dịka unu dị ugbu a. ONYENWE ANYị wesoro m iwe nʼihi unu, ọ ṅụrụ iyi na m agaghị agafe osimiri Jọdan ịbanye nʼala ọma ahụ nke ONYENWE ANYị Chineke gị na-enye gị dịka ihe nketa gị. Aghaghị m ịnwụ nʼala a. Agaghị m agafe Jọdan. Ma unu ga-agafe gaa nweta ala ọma ahụ. Lezienụ anya ka unu ghara ichefu ọgbụgba ndụ unu na ONYENWE ANYị Chineke unu nwekọrọ, unu emerela onwe unu arụsị yiri ụdịdị ihe ọbụla, ndị ahụ iwu ONYENWE ANYị Chineke unu nyere megidere. Nʼihi na ONYENWE ANYị Chineke unu bụ ọkụ na-erepịa erepịa. Ọ bụ Chineke ekworo. Mgbe ị ga-amụ ụmụ, nwekwa ụmụ ụmụ, mgbe unu birila ọtụtụ oge nʼala ahụ, ọ bụrụ na unu emerụọ onwe unu site nʼimere onwe unu ụdị arụsị ọbụla, si otu a mee ihe dị njọ nʼanya ONYENWE ANYị Chineke unu, ma kpasuo ya iwe ana m akpọku eluigwe na ụwa ka ha bụrụ ndị akaebe mụ na unu taa, na a ga-ala unu nʼiyi ngwangwa nʼala ahụ bụ nke unu na-agafe Jọdan inweta. Unu agaghị ebi ogologo oge nʼebe ahụ, nʼihi na a ga-ekpochapụ unu. ONYENWE ANYị ga-eme ka unu gbasasịa nʼetiti mba ndị ọzọ. Ọ bụkwa naanị mmadụ ole na ole ga-afọdụ ndụ nʼetiti mba ndị ahụ ONYENWE ANYị ga-achụga unu. Nʼebe ahụ, unu ga-efe chi ndị bụ ọrụ aka mmadụ nke e ji osisi tụọ na nke e ji nkume pịa, nke na-adịghị ahụ ụzọ, nke na-adịghị anụ ihe, nke na-apụghị iri nri ma ọ bụkwanụ ịnụ isisi. Ma ọ bụrụ na unu anọrọ nʼebe ahụ chọọ ONYENWE ANYị Chineke unu, unu ga-achọtakwa ya, mgbe unu ji obi unu niile na mkpụrụobi unu niile chọọ ya. Mgbe mkpagbu bịara, mgbe ihe ilu ndị a bịakwasịrị unu nʼoge dị nʼihu, unu ga-emesịa lọghachikwute ONYENWE ANYị Chineke unu, unu ga-egekwa ntị nʼihe ọ ga-agwa unu. Nʼihi na ONYENWE ANYị Chineke unu bụ Chineke na-eme ebere. Ọ gaghị agọnarị unu maọbụ laa unu nʼiyi, maọbụ chefuo ọgbụgba ndụ ya na nna nna unu ha gbara, nke o ji iyi ọ ṅụrụ mesie ike. ONYENWE ANYị Nyochaanụ ihe mere nʼoge gara aga, tupu a mụọ unu, na tupu Chineke ekee mmadụ nʼụwa. Jụọnụ ajụjụ nʼụwa niile, jụta ma ihe ukwu dị otu a o metụla mgbe ọbụla. O nweela ndị mmadụ nụrụ olu Chineke mgbe o si nʼọkụ gwa ha okwu dịka unu mere, ma ha anwụghị? O nweela chi ọzọ nwara ka o site na mba ọzọ nwetara onwe ya otu mba, site nʼihe nwalee, site nʼihe ịrịbama na ihe ebube dị iche iche, site nʼagha, nʼaka dị ike, na ogwe aka esetipụrụ esetipụ, maọbụ nʼihe dị oke egwu dị iche iche, dịka ihe niile nke ONYENWE ANYị Chineke unu mere nʼala Ijipt nʼihu anya unu abụọ? O gosiri unu ihe ndị a ka unu mara na ONYENWE ANYị bụ Chineke nʼezie, na ọ dịkwaghị onye ọzọ ma ọ bụghị ya. O sitere nʼeluigwe mee ka unu nụ olu ya maka ịdọ unu aka na ntị. Nʼụwa, o mere ka unu hụ oke ogidi ọkụ ahụ o wuru, unu nụkwara olu ya nʼetiti ọkụ ahụ. Nʼihi ịhụnanya o nwere nʼebe nna nna unu nọ na nʼihi nhọpụta ọ họpụtara ụmụ ụmụ ha, ka o ji si nʼIjipt dupụta unu nʼihu ya. Ọ bụkwa ike aka ya ka o ji mezuo nke a. Ka o site nʼihu unu chụpụ mba dị ukwuu na ndị dị ike, ma kpọbata unu nʼala ha, inye unu ala ahụ dịka ihe nketa unu, dị ka o si dị taa. Matanụ nke ọma, ma nabata okwu a nʼobi unu na ONYENWE ANYị bụ Chineke nʼeluigwe na nʼụwa. O nwekwaghị chi ọzọ dị ma ọ bụghị ya. Debenụ ụkpụrụ ya na iwu ndị a niile m na-enye unu taa, ka ihe niile gaara unu na ụmụ unu nke ọma, ka unu biekwa nʼala ahụ ONYENWE ANYị Chineke na-enye unu ruo mgbe niile. Mgbe ahụ, Mosis họpụtara obodo atọ nʼofe ọwụwa anyanwụ nke osimiri Jọdan, ebe onye ọbụla gburu mmadụ ga-agbaba ọsọ ndụ, ma ọ bụrụ na ha gburu onye agbataobi ha na-amaghị ama, na-akpọghị ya asị na mgbe gara aga. Ọ ga-agbaba nʼotu ime obodo ndị a ichebe ndụ ya. Obodo ndị ahụ bụ, Beza, nke dị nʼugwu elu ya dị larịị nʼime ọzara. A họpụtara ya maka ebo Ruben. Ramọt, nke dị na Gilead, maka ebo Gad, na Golan, nke dị na Bashan, maka ebo Manase. Nke a bụ iwu Mosis chere nʼihu ụmụ Izrel. Ndị a bụ ihe ama, na ụkpụrụ, na iwu Mosis nyere ụmụ Izrel nke ha aghaghị idebe mgbe ha si nʼIjipt pụta na ndagwurugwu Bet-Peoa nke dị nʼọwụwa anyanwụ Jọdan, nʼala Saịhọn, eze ndị Amọrait, onye na-achị na Heshbọn, bụ onye Mosis na ndị Izrel meriri nʼagha mgbe ha si nʼIjipt pụta. Ndị Izrel nwetaara onwe ha ala ya na ala Ọg, eze Bashan. Eze abụọ ndị a bụ eze ndị Amọrait ndị ala ha dị nʼọwụwa anyanwụ nke osimiri Jọdan. Ala a sitere nʼAroea, nʼọnụ mmiri Anọn ruo nʼugwu Siriọn (ya bụ ugwu Hemon), ruo nʼala Araba niile, nke dị nʼọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan, ruokwa nʼOsimiri Nnu, nʼala ala ugwu Pisga.