Ọ we kwue ihe bayere Josef, si,
Ihe Jehova nāgọzi ka ala-ya bu;
Site n'ihe di oké ọnu-ahia nke elu-igwe, site n'igirigi,
Site kwa n'ob͕u-miri nke nāmakpu n'okpuru.
Site kwa n'ihe di oké ọnu-ahia nke ihe-ọmume anyanwu,
Site kwa n'ihe di oké ọnu-ahia nke ihe-npuputa nke ọnwa nile.
Site kwa n'isi ihe nke ugwu nke di site na mb͕e ochie,
Site kwa n'ihe di oké ọnu-ahia nke ugwu ntà di mb͕e ebighi-ebi.
Site kwa n'ihe di oké ọnu-ahia nke uwa na ùjú-ya,
Na obi-ọma nke Onye bi n'osisi ntà:
Ka ngọzi ahu biakwasi n'isi Josef,
Na n'opu-n'isi nke onye ekewapuru n'etiti umu-nne-ya.
Nwa ehi-ya buru uzọ mu, ima-nma diri ya;
Mpi nke atu ka mpi-ya abua bu kwa:
Ọ gēwere ha sọkọta ndi nile, rue nsọtu nile nke uwa:
Ndi ahu bu kwa usu nile nke orú nnù ndikom na nnù ise nke Efraim,
Ndi ahu bu kwa usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri nke Manase.
Ọ we kwue ihe bayere Zebulun, si,
Zebulun, ṅuria ọṅu n'ọpupu-gi;
Isaka, ṅuri kwa ọṅu n'ulo-ikwū-gi nile.
Ha gākpọ ndi nile bia n'ugwu;
N'ebe ahu ka ha gāchu àjà ezi omume:
N'ihi na njuputa nke oké osimiri nile ka ha gāmí dika ara,
Ya na ihe nile zoro ezo nke ezoro n'ájá.
Ọ we kwue ihe bayere Gad, si,
Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Onye nēme ka Gad sa mbara:
Dika nne-ọdum ka ọ nēbi,
Ọ nādọka kwa ogwe-aka, ya na opu-n'isi.
Ọ nāhuta-kwa-ra onwe-ya ihe mbu,
N'ihi na ebe ahu ka ekpuchiri òkè onye nēnye iwu;
Ọ we soro ndi-isi ndi Israel bia,
Ezi omume nke Jehova ka o mere,
Na ikpé-Ya nile n'ebe Israel nọ.
O we kwue ihe bayere Dan, si,
Dan bu nwa ọdum,
Ọ nēsi na Beshan maputa.
O we kwue ihe bayere Naftali, si,
Naftali, onye ewere ihe-utọ me ka afọ ju gi,
Onye juputa-kwa-ra na ngọzi Jehova:
Gi nweta Ọdida-anyanwu na Ndida.
O we kwue ihe bayere Asha, si,
Onye agọziri agọzi n'umu ka Asha bu;
Ka ihe-ya tọ umu-nne-ya utọ,
Ka ọ zọye kwa ukwu-ya na manu.
Ígwè na ọla ka akpukpọ-ukwu-gi gābu;
Dika ubọchi-gi nile si di kwa, otú a ka ume-gi gādi.
Ọ dighi onye di ka Chineke, gi Jeshurun,
Onye elu-igwe nēbu dika inyinya n'iyere gi aka,
Onye mbara-ígwé nēbu kwa nime nbili-elu-Ya.
Ebe-obibi-gi ka Chineke nke di site na mb͕e ochie bu,
N'okpuru ka ogwe-aka mb͕e ebighi-ebi di kwa:
Ọ chupu-kwa-ra onye-iro n'iru gi,
We si, Kpochapu.
Israel we biri na ntukwasi-obi,
Isi-iyi Jekob nání ya iche,
N'ala ọka na manya-vine ọhu;
Ọzọ, elu-igwe-ya nātasi igirigi.
Onye ihe nile nāgara nke-ọma ka i bu, Israel:
Ònye di ka gi? bú ndi Jehova zọputaworo,
Onye bu ọta nke iye-aka-gi,
Onye bu kwa mma-agha nke nbili-elu-gi!
Ndi-iro-gi gērube kwa isi aghughọ n'okpuru gi;
Gi onwe-gi gāzọkwasi kwa ebe di elu nke ha ukwu.