Moses we gwabìe Israel nile okwu nile ndia: o we si ha, Tukwasi obi-unu n'okwu nile nke mu onwem nāb͕ara unu àmà ta; nke unu gēnye umu-unu n'iwu, ka ha lezie anya ime okwu nile nke iwu a. N'ihi na ọ bughi ihe efu ka ọ bu n'ebe unu nọ; n'ihi na nka bu ndu-unu, ọ bu kwa ihe a ka unu gēwere me ka ubọchi-unu di anya n'elu ala, ebe unu onwe-unu nāgabiga Jọdan inweta ya. Jehova we gwa Moses okwu n'otù ubọchi ahu, si, Rigo n'ugwu a nke Abarim, bú ugwu Nebo, nke di n'ala Moab, nke di n'irú Jeriko; le kwa ala Kenean anya, bú nke Mu onwem nēnye umu Israel n'ihe-onwunwe: gi nwu kwa n'ugwu ahu ebe i nārigo, ka achikọta kwa gi na umu-nna-gi n'ala-mọ; dika Eron, bú nwa-nne-gi, nwuru n'ugwu Hoa, ewe chikọta ya na umu-nna-ya n'ala-mọ: n'ihi na unu mekpuru ihe-nmekpu megidem n'etiti umu Israel na miri Meriba Kedesh, n'ọzara Zin; n'ihi na unu edoghm nsọ n'etiti umu Israel. N'ihi na ọ bu na ncherita-iru ka i gāhu ala ahu; ma i gaghi-abà n'ebe ahu n'ala ahu nke Mu onwem nēnye umu Israel.
Gụọ DEUTERONOMI 32
Geere nke a ntị DEUTERONOMI 32
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: DEUTERONOMI 32:45-52
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị