Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

DEUTERONOMI 26

26
1Ọ gēru kwa, mb͕e i gābà n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi n'ihe-nketa, mb͕e i gēnweta kwa ya, we biri nime ya; 2na i gēwere ufọdu nime nkpuru mbu nke nkpuru nile nke ala-ubi, nke i gēsi n'ala-gi nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi webata; i gētiye kwa ya n'abọ, jerue ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa ime ka aha-Ya biri n'ebe ahu. 3I gābiakute kwa onye-nchu-àjà nke gānọ na mb͕e ahu, si ya, Egosiwom Jehova, bú Chineke-gi, ta, na abatawom n'ala ahu nke Jehova ṅuru nna-ayi-hà iyi inye ayi. 4Onye-nchu-àjà gānara abọ ahu n'aka-gi, dọba ya n'iru ebe-ichu-àjà nke Jehova, bú Chineke-gi. 5I gāza kwa, si n'iru Jehova, bú Chineke-gi, Onye Siria nke nāla n'iyì ka nnam bu, o we rida n'Ijipt, nọ dika ọbìa n'ebe ahu, ya na ndikom ole-na-ole; o we ghọ mba n'ebe ahu, nke di uku, di kwa ike, ba kwa uba: 6ndi Ijipt we mejọ ayi, weda ayi n'ala, tukwasi ayi òfùfè siri ike: 7ayi we tikue Jehova, bú Chineke nke nna-ayi-hà, Jehova we nu olu-ayi, hu kwa nweda-n'ala-ayi, na ndọb͕u ayi nādọb͕u onwe-ayi n'ọlu, na nmeb͕u-ayi: 8Jehova we were aka di ike, na ogwe-aka esetiri eseti, na egwu uku, na ihe-iriba-ama di iche iche, na ihe-ebube di iche iche, me ka ayi si n'Ijipt puta: 9O we me ka ayi bata n'ebe a, O we nye ayi ala nka, bú ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya. 10Ma ub͕u a, le, ewetawom nkpuru mbu nke nkpuru ala-ubi nke I nyeworom, Jehova. I gādọba kwa ya n'iru Jehova, bú Chineke-gi, kpọ isi ala n'iru Jehova, bú Chineke-gi: 11i gāṅuri kwa ọṅu n'ezi ihe nile Jehova, bú Chineke-gi, nyeworo gi, nye kwa ulo-gi, gi onwe-gi, na onye Livai, na ọbìa nke nọ n'etiti gi.
12Mb͕e i gēnyebìwori otù uzọ n'uzọ iri nile nke ihe-ọmume-gi n'arọ nke-atọ, bú arọ nke inye otù uzọ n'uzọ iri, i gēnye kwa ya onye Livai, nye kwa ọbìa, nye kwa nwa-nb͕ei, nye kwa nwayi di-ya nwuru, ka ha we rie nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, afọ ewe ju ha; 13i gāsi kwa n'iru Jehova, bú Chineke-gi, Ekpochapuwom ihe nsọ ahu n'ulom, ọzọ kwa, enyewom ya ndi Livai, nye kwa ọbìa, nye kwa nwa-nb͕ei, nye kwa nwayi di-ya nwuru, dika ihe nile I nyere n'iwu si di nke I nyerem n'iwu: agabigaghm ihe nile I nyere n'iwu, echezọghkwam: 14erighm ihe sitere na ya n'iru-újúm, ekpochapughkwam ihe sitere na ya n'adighi-ọcha, enyeghkwam ihe sitere na ya bayere onye nwuru anwu: egewom nti olu Jehova, bú Chinekem, emewom dika ihe nile si di nke I nyeworom n'iwu. 15Si n'ebe-obibi nsọ Gi, si n'elu-igwe, le anya, gọzie ndi-Gi, bú Israel, na ala-ubi ahu nke I nyeworo ayi, dika I ṅuru nna-ayi-hà iyi, bú ala miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya.
16Ubọchi ta ka Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi iwu ime ukpuru ndia na ikpé ndia: i gēwere kwa obi-gi nile, were kwa nkpuru-obi-gi nile, debe ha, me kwa ha. 17Jehova ka i meworo ka Ọ si ta na Ọ gāburu gi Chineke, na i gēje kwa ije n'uzọ-Ya nile, debe kwa ukpuru-Ya nile, na ihe nile O nyere n'iwu, na ikpé-Ya nile, ge kwa nti olu-Ya: 18Jehova emewo kwa ka i si ta na i gāburu Ya ndi nke aka Ya, dika Ọ gwaworo gi okwu, na i gēdebe kwa ihe nile O nyere n'iwu; 19na Ọ gēme kwa gi ka i kachasia mba nile O meworo elu, ibu otuto, ibu kwa aha, ibu kwa ihe mara nma; ka i we buru-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, ndi nsọ, dika O kwuworo.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

DEUTERONOMI 26: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye