Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

DEUTERONOMI 21

21
1Mb͕e agāhuta otù onye eb͕uru eb͕u ka ọ dara n'ọhia n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ka i we nweta ya, ma amaghi onye tib͕uru ya: 2ndi-okenye-gi na ndi-ikpé-gi gāputa kwa, tùrue obodo nile nke di buruburu onye ahu eb͕uru eb͕u: 3ọ gēru kwa, na obodo ahu nke dikachasiri nso onye ahu eb͕uru eb͕u, ndi-okenye obodo ahu gēwere kwa nwa-ab͕ọghọ-ehi nke ìgwè ehi, nke akējighi ya lu ọlu-ubi, nke akādọghi kwa ihe nime yoke; 4ndi-okenye obodo ahu gākpudata nwa-ab͕ọghọ-ehi ahu nime ndagwurugwu miri nērù mbe nile, nke anālughi ọlu-ubi, nke anāghaghi kwa nkpuru nime ya, ha gāb͕aji kwa olu nwa-ab͕ọghọ-ehi ahu n'ebe ahu nime ndagwurugwu ahu: 5ndi-nchu-àjà, bú umu Livai, gābiaru kwa nso; n'ihi na ha ka Jehova, bú Chineke-gi, rọputaworo ijere Ya ozi, na igọzi n'aha Jehova; ọ bu kwa dika okwu-ọnu-ha si di ka ise-okwu ọ bula na otiti-ihe ọ bula gādi: 6ndi-okenye nile nke obodo ahu, ndi nọkachasiri nso onye ahu eb͕uru eb͕u, gākwọ kwa aka-ha n'elu nwa-ab͕ọghọ-ehi ahu nke ab͕ajiri olu-ya nime ndagwurugwu ahu. 7Ha gāza kwa, si, Aka-ayi awusighi ọbara nka, anya-ayi ahughi kwa ya. 8Jehova, kpuchiere ndi-Gi nmehie-ha, bú Israel, nke I b͕aputaworo, ekwela ka ọbara nke nēmeghi ihe ọjọ di n'etiti ndi-Gi, bú Israel. Agēkpuchi-kwa-ra ha nmehie ọbara ahu. 9Gi onwe-gi gēkpochapu kwa n'etiti gi ọbara nēmeghi ihe ọjọ, mb͕e i gēme ihe ziri ezi n'anya Jehova.
10Mb͕e i nāpu ibuso ndi-iro-gi agha, Jehova, bú Chineke-gi, we nye ha n'aka-gi, i we dọta usu ndi-ha adọtara n'agha n'agha, 11i we hu nwayi nke mara nma n'aru n'usu ndi adọtara n'agha, ihe-ya we di gi ezi utọ, i we lutara ya onwe-gi na nwunye; 12i gēme kwa ka ọ bata n'etiti ulo-gi; ọ gākọpu kwa isi-ya, mezie mbọ-aka-ya, 13yipu uwe ndọta-n'agha-ya n'aru ya, nọdu n'ulo-gi, kwara nna-ya na nne-ya ogologo otù ọnwa: emesia i gābakuru ya, we ghọrọ ya di, ọ we ghọrọ gi nwunye. 14O gēru kwa, ọ buru na ihe-ya atọghi gi utọ, na i gēzipu ya dika nkpuru-obi-ya si achọ; ma erela ya n'ego ma-ọli, emela ya dika orù, n'ihi na i wedawo ya n'ala.
15Mb͕e nwoke nwere ndinyom abua, ma otù nime ha bu nwayi anāhu n'anya, nke-ọzọ aburu nwayi anākpọ asì, asi kwa na ha amuworo ya umu-ndikom, ma nwayi anāhu n'anya ma nwayi anākpọ asì; ma ọkpara bu nwa nwayi anākpọ asì muru; 16ọ gēru kwa, n'ubọchi mb͕e ọ nēme ka umu-ya ndikom keta ihe o nwere, na ọ pughi ime ka nwa-nwoke nke nwayi anāhu n'anya buru ọkpara n'iru nwa-nwoke nke nwayi anākpọ asì, bú ọkpara: 17kama ọ gēkwe na ọkpara ka ọ bu, bú nwa-nwoke nke nwayi anākpọ asì, n'inye ya òkè abua n'ihe ọ bula ahutara n'aka-ya: n'ihi na nwa ahu bu nkpuru mbu nke ume-ya; ọ bu ya nwe ihe ekpeziri ọnọdu-ọkpara.
18Mb͕e nwoke nwere nwa-nwoke nēwezuga onwe-ya, nānupu kwa isi, nke nāgaghi-ege nti n'olu nna-ya, na n'olu nne-ya, ha we dọ ya aka na nti, ma ọ geghi ha nti: 19nna-ya na nne-ya gējide kwa ya aka, me ka ọ pukuru ndi-okenye obodo-ya, we rue ọnu-uzọ-ama ebe nke ya; 20ha gāsi kwa ndi-okenye obodo-ya, Nwa-ayi nka nēwezuga onwe-ya, nānupu kwa isi, ọ dighi-ege nti n'olu-ayi; ọ bu onye-nmefu, na onye nāṅubiga manya okè. 21Ndikom nile nke obodo-ya gēwere nkume tub͕ue ya, ka ọ we nwua: i we kpochapu ihe ọjọ ahu n'etiti gi; Israel nile gānu kwa, we tua egwu.
22Mb͕e nmehie di n'onye ọ bula, bú ihe eji ma ya ikpe ọnwu, ewe me ka ọ nwua, i we kwuba ya n'osisi; 23ozu-ya agaghi-adigide n'elu osisi abali nile, kama i ghaghi ilì ya n'ubọchi ahu; n'ihi na ihe-nkọcha nke Chineke ka onye a kwugburu akwugbu bu; ka i ghara imeru ala-gi, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ka ọ buru ihe-nketa.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

DEUTERONOMI 21: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye