Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

DEUTERONOMI 2

2
1Ayi we che iru, bulie ije ba n'ọzara n'uzọ Oké Osimiri Uhie, dika Jehova gwaram okwu: ayi we je ugwu Sia buruburu ọtutu ubọchi. 2Jehova we gwam okwu, si, 3O zuworo unu, bú ije ugwu a buruburu: chenu iru n'Ugwu n'onwe-unu. 4Gi nye kwa ndim iwu, si, Unu onwe-unu nāgabiga n'ókè-ala umu-nne-unu, bú umu Isọ, ndi bi na Sia; ha gātu kwa egwu unu: ma unu gēlezi onwe-unu anya nke-uku: 5unu alusola ha ọ̀gù; n'ihi na M'gaghi-enye unu ala sitere n'ala-ha, ọbuná rue ebe nzọkwasi ọbu-ukwu-unu: n'ihi na ọ bu Isọ ka M'nyeworo ugwu Sia, ka ọ buru ihe-nnweta. 6Unu gēwere ego zuru ihe-oriri n'aka-ha, ka unu we rie; ọzọ kwa, unu gēwere ego zuru miri n'aka-ha, ka unu we ṅua. 7N'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, agọziwo gi n'omume aka-gi nile: Ọ mawo ije-ije-gi n'ọzara uku a: ọgu arọ abua ndia ka Jehova, bú Chineke-gi, nọyere gi; ọ dighi ihe kọrọ gi. 8Ayi we si n'ala umu-nne-ayi, bú umu Isọ, ndi bi na Sia, gabiga, site n'uzọ Araba, site n'Ilat, site kwa n'Ezion-geba.
Ayi we che iru, gabiga n'uzọ ọzara Moab. 9Jehova we sim, Akpab͕ula Moab, aluso-kwa-la ha ọ̀gù n'agha: n'ihi na M'gaghi-enye gi ala sitere n'ala-ya ibu ihe-nnweta; n'ihi na umu Lot ka M'nyeworo ya ka ọ buru ihe-nnweta. 10(Imim biri nime ya na mb͕e gara aga, ndi di uku, di kwa ọtutu, di kwa ogologo, dika ndi Anak; 11Refaim ka anāgu kwa ndia, dika ndi Anak; ma ndi Moab nākpọ ha Imim. 12Ọ bu kwa na Sia ka ndi Hoa bi na mb͕e gara aga, ma umu Isọ napuru ha ala-ha; ha we kpochapu ha n'iru ha, bichie n'ọnọdu ha; dika umu Israel mere ala nke ihe-nnweta-ya, nke Jehova nyere ha.) 13Ub͕u a, bilienu, gabiga miri-iyi Zered n'onwe-unu. Ayi we gabiga miri-iyi Zered. 14Ubọchi nile nke ayi siri na Kedesh-banea je ije, rue mb͕e ayi gabigara miri-iyi Zered, di orú arọ na iri na asatọ; rue mb͕e ọb͕ọ nile nke ndikom agha si n'etiti ọmuma-ulo-ikwū gwusia, dika Jehova ṅuru ha iyi. 15Ọzọ kwa, aka Jehova digidere ha, ikpochapu ha n'etiti ọmuma-ulo-ikwū, rue mb͕e emere ka ha gwusia.
16Ọ we rue, mb͕e ndikom agha ahu nile nwupusiri n'etiti ndi Israel, 17na Jehova gwaram okwu, si, 18Gi onwe-gi nāgabiga ya, bu ókè-ala Moab, ta: 19ma mb͕e i nābiaru nso ncherita-iru umu Amon, akpab͕ula ha, aluso-kwa-la ha ọ̀gù: n'ihi na M'gaghi-enye gi ala sitere n'ala umu Amon ka ọ buru ihe-nnweta: n'ihi na umu Lot ka M'nyeworo ya ibu ihe-nnweta. 20(Ala Refaim ka agu-kwa-ra nke ahu: Refaim biri nime ya na mb͕e gara aga; ma ndi Amon nākpọ ha Zamzumim; 21ndi di uku, di kwa ọtutu, di kwa ogologo, dika ndi Anak; ma Jehova kpochapuru ha n'iru ha; ha we napu ha ala-ha, bichie n'ọnọdu ha: 22dika ihe O mere nye umu Isọ, ndi bi na Sia, mb͕e o kpochapuru ndi Hoa n'iru ha; ha we napu ha ala-ha, bichie n'ọnọdu ha rue ta: 23ma Avim ndi bi n'obodo ntà rue Geza, Kaftorim, ndi si na Kaftoa puta, kpochapuru ha, bichie n'ọnọdu ha.) 24Bilienu, bulie ije, gabiga ndagwurugwu Anon: le, enyewom Saihon onye-Amorait, bú eze Heshbon, na ala-ya, n'aka-gi: malite inweta ya, luso kwa ya ọ̀gù n'agha: 25Ta ka M'gāmalite itiyekwasi ujọ-gi na egwu-gi n'iru ndi nile n'okpuru elu-igwe nile, ndi gānu akukọ-gi, ma kwa jijiji, ọ gēb͕u kwa ha nb͕u n'ihi unu.
26M'we si n'ọzara Kedimot zigara Saihon, bú eze Heshbon, ndi-ozi izì okwu udo, si, 27Ka m'gabiga n'ala-gi: n'uzọ n'uzọ ka m'ganēje, m'gaghi-ewezuga onwem n'aka-nri, ma-ọbu n'aka-ekpe. 28N'ego ka i gērenyem ihe-oriri, ka m'we rie; n'ego ka i gēnyekwam miri, ka m'we ṅua: nání kwe ka m'gabiga n'ukwum; 29dika umu Isọ ndi bi na Sia, na ndi Moab ndi bi na ya merem; rue mb͕e m'gāgabiga Jọdan, ba n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-ayi, nēnye ayi. 30Ma Saihon, bú eze Heshbon, achọghi ka ayi gabiga n'ala-ya: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, mere mọ-ya ka ọ di ike, b͕a kwa obi-ya ume, ka O we nye ya n'aka-gi, otú ọ di ta. 31Jehova we sim, Le, amalitewom irara Saihon na ala-ya nye n'iru gi: malite inweta, ka i we nweta ala-ya. 32Saihon we puta izute ayi, ya onwe-ya na ndi-ya nile, ibu agha, rue Jehaz. 33Jehova, bú Chineke-ayi, we rara ya nye n'iru ayi, ayi we tib͕ue ya, na umu-ya ndikom, na ndi-ya nile. 34Ayi we were obodo-ya nile na mb͕e ahu, wezuga obodo ndikom ọ bula, ya na ndinyom na umu-ntakiri, ka ebibie ha; ọ dighi onye fọduru ayi rapuru: 35nání anu-ulo ka ayi lutara n'agha n'onwe-ayi, ha na ihe-nkwata obodo nile nke ayi were. 36Site n'Aroea, nke di n'usọ ndagwurugwu Anon, na obodo ahu nke di na ndagwurugwu ahu, we rue Gilead, ọ dighi obodo nke kariri ayi elu: ihe nile ka Jehova, bú Chineke-ayi, rara nye n'iru ayi: 37nání, i biarughi nso ala umu Amon; akuku nile nke miri-iyi Jabok, na obodo nile nke ugwu, na ebe ọ bula Jehova, bú Chineke-ayi, nyere ayi iwu bayere ya.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

DEUTERONOMI 2: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye