N'ihi nka ka ndi Kaldea ufọdu biaruru nso n'otù mb͕e ahu, bo ndi-Ju ebubo. Ha zara, si Nebukadneza, bú eze, Eze, di ndu rue mb͕e ebighi-ebi. Gi onwe-gi, eze, enyewo iwu, si, na onye ọ bula nke gānu olu nke opì-ike, na nke ọ̀jà, na nke ubọ-akwara, na nke sackbut, na nke une, na nke dulcimer, na nke ubọ na opì nile di iche iche, gāda n'ala kpọ isi ala nye onyinyo ọla-edo ahu: ma onye ọ bula nke nādaghi n'ala kpọ isi ala, agātubà ya n'etiti oké ọku nke nēnwu ajọ onwunwu. Ndi-Ju ufọdu di ndi i doworo ndi-isi ọlu nke ala ahu anāchi achi, bú Babilon, ha bu Shedrak na Mishak na Abed-nego; ndikom ndia anughi olu-gi, eze: chi-gi nile ka ha nādighi-efè, ọ bu kwa onyinyo ọla-edo nke i guzobeworo ọtọ ka ha nādighi-akpọ isi ala nye.
Gụọ DANIEL 3
Geere nke a ntị DANIEL 3
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: DANIEL 3:8-12
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo