Nebukadneza zara, si, Onye agọziri agọzi ka Chineke nke Shedrak na Mishak na Abed-nego bu, Onye ziteworo mọ-ozi-Ya, we naputa ndi-orù-Ya ndi tukwasiri Ya obi, ọ bu kwa okwu eze ka ha b͕anweworo, we rara aru-ha nye, ka ha we ghara ifè ma-ọbu ikpọ isi ala nye chi ọ bula, ma-ọbughi Chineke-ha. N'ihi ya anēsite n'akam nye iwu, si, na ndi ọ bula, ma-ọbu mba ọ bula, ma-ọbu asusu ọ bula, nke gēkwuhie megide Chineke nke Shedrak na Mishak na Abed-nego, agābọkasi ya, ọ bu kwa ulo-ya ka agēme ebe-ikpofu-ahihia: n'ihi na ọ dighi chi ọzọ nke puru inaputa otú a. Mb͕e ahu eze mere ka ihe gara Shedrak na Mishak na Abednego nke-ọma n'ala ahu anāchi achi, bú Babilon.
Gụọ DANIEL 3
Geere nke a ntị DANIEL 3
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: DANIEL 3:28-30
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo