Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌLU NDI-OZI 9:1-31

ỌLU NDI-OZI 9:1-31 IGBOB

Ma Sọl, ebe ọ nēwere iba-nba na ob͕ub͕u ku ume megide ndi nēso uzọ Onye-nwe-ayi rue ub͕u a, o jekuru onye-isi-nchu-àjà, riọ akwukwọ-ozi n'aka-ya igaru Damaskọs inye ndi ulo-nzukọ, ka ọ gābu, ma asi na ọ chọtara ndi ọ bula di n'Uzọ a, ma-ọbu ndikom ma-ọbu ndinyom, ka o we dọkpuru ha n'ab͕u bia Jerusalem. Ma mb͕e ọ nāga, o rue na ọ nābiaru Damaskọs nso: na mberede ìhè si n'elu-igwe b͕uru ya àmùmà buruburu: o we da n'ala, nu otù olu ka ọ nāsi ya, Sọl, Sọl, gini mere i nēsob͕um? O we si, Ì bu Onye, Onye-nwe-ayi? Ọ si Mu onwem bu Jisus, Onye gi onwe-gi nēsob͕u: ma bilie, ba nime obodo, agāgwa gi ihe i nāghaghi ime. Ndikom ndi soro ya n'ije we guzo apughi ikwu okwu, ebe ha nānu olu ahu, ma ha ahughi onye ọ bula. Sọl we si n'ala bilie; ma mb͕e anya-ya saghere, ọ hughi ihe ọ bula; ha we jide ya n'aka duru ya, we dubata ya na Damaskọs. Ọ hughi kwa uzọ ubọchi atọ, ọ dighi kwa ihe ọ nēri ma-ọbu nke ọ nāṅu. Ma otù onye nke nēso uzọ Jisus nọ na Damaskọs, aha-ya bu Ananaias; Onye-nwe-ayi we si ya n'ọhù, Ananaias. O we si, Le, mu onwem, Onye-nwe-ayi. Onye-nwe-ayi we si ya, Bilie, ga rue amá nke anākpọ Amá Eguzoziri, chọ kwa n'ulo Judas otù onye aha-ya bu Sọl, onye Tasọs: n'ihi na le, ọ nēkpe ekpere; ọ hu-kwa-ra otù nwoke, aha-ya bu Ananaias, ka ọ nābata, nēbikwasi kwa ya aka-ya abua n'isi, ka ewe me ka ọ hu uzọ. Ma Ananaias zara, si, Onye-nwe-ayi, anurum n'ọnu ọtutu madu ihe bayere nwoke a, ka ha ra, bú ajọ ihe o mere ndi nsọ Gi na Jerusalem: n'ebe a ka o nwe-kwa-ra ike site n'ebe ndi-isi-nchu-àjà nọ ike ndi nile nākpọku aha-Gi ab͕u. Ma Onye-nwe-ayi siri ya, Ga: n'ihi na onye ahu bu ihe-ọlu arọputara nyem, ka o buru aham che n'iru mba ọzọ na ndi-eze, na umu Israel: n'ihi na Mu onwem gēgosi ya ka ha ra, bú ahuhu nile ọ nāghaghi ihu n'ihi aham. Ananaias we je, ba n'ulo ahu; o we bikwasi ya aka-ya abua n'isi, si, Sọl, nwa-nnam, Onye-nwe-ayi, bú Jisus, Onye mere ka i hu Ya n'uzọ i si bia, ezitewom, ka ewe me ka i hu uzọ, ka i we juputa kwa na Mọ Nsọ. Ngwa ngwa ihe dika akpirikpa we si n'anya-ya dapu, eme-kwa-ra ka ọ hu uzọ; o we bilie, eme ya baptism; o we nara nri, ewe me ka ọ nwe ume. Ya na ndi nēso uzọ Jisus na Damaskọs we nọ ubọchi ufọdu. Ngwa ngwa n'ulo-nzukọ-ha nile o we nēkwusa Jisus, na Ya onwe-ya bu Ọkpara Chineke. Ibobo we nwua ndi nile nuru ya n'aru, ha nāsi, Ọ̀ bughi onye a bu onye mebiri nime Jerusalem ndi nākpọku aha nka? ọ bia-kwa-rari n'ebe a ime ihe a, bú, ka o we dọkpuru ha n'ab͕u je n'iru ndi-isi-nchu-àjà. Ma emere Sọl ka o nwe kari ike, ọ nēkwu kwa okwu nke b͕ara ndi-Ju bi na Damaskọs ghari, ebe ọ nēgosi nke-ọma na Onye a bu Kraist-ha. Ma mb͕e ọtutu ubọchi zuru, ndi-Ju b͕ara ìzù ib͕u ya: ma emere ka Sọl mara ajọ ìzù-ha. Ha we nēche kwa ọnu-uzọ-ama nile ehihie na abali ka ha we b͕ue ya: ma ndi nēso uzọ-ya kuru ya n'abali, weda ya n'ala site na mb͕idi nke obodo, nārada ya n'abọ. Ma mb͕e ọ biaruru Jerusalem, ọ nwara iwere onwe-ya rapara n'aru ndi nēso uzọ Jisus: ma ha nile nātu egwu ya, ebe ha nēkweghi na ọ bu onye nēso uzọ Jisus. Ma Banabas jidere ya n'aka, we duru ya jekuru ndi-ozi, kọrọ ha otú ọ hururi Onye-nwe-ayi n'uzọ, kọkwa-ra ha, si, na Ọ gwara ya-ri okwu, ya na otú o kwuwarari okwu na Damaskọs n'aha Jisus. Ya na ha we nọ, ọ nābata nāpu kwa na Jerusalem, nēkwuwa okwu n'aha Onye-nwe-ayi: o we nāgwa ndi-Ju nāsu asusu Grik okwu, ya na ha nājurita kwa onwe-ha ajuju; ma ha tiyere aka-ha ib͕u ya. Ma mb͕e umu-nna nime Kraist mazuru ya, ha dudara ya rue Sisaria, we zipu ya igaru Tasọs. Ya mere nzukọ Kraist nime Judia na Galili na Sameria dum nwere udo, ebe anēwuli ya elu dika ulo; ọ nāba kwa uba, ebe ọ nāga n'egwu Onye-nwe-ayi na nkasi-obi nke Mọ Nsọ.

Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Dị N’efu na Ihe Ofufe Gasị metụtara ỌLU NDI-OZI 9:1-31