Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌLU NDI-OZI 17

17
1Ma mb͕e ha gabigasiri n'Amfipọlis na Apọlonia, ha biaruru Tesalọnaika, ebe ulo-nzukọ ndi-Ju di: 2Pọl dika ọ nēme mb͕e dum, we bakuru ha, ogologo ubọchi-izu-ike atọ ọ nāgwa kwa ha okwu site n'ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, 3nēmeghe ha, nēche kwa n'iru ndi ahu, na Kraist-ha aghaghi ihu ahuhu, na isi na ndi nwuru anwu bilie; nēgosi kwa na Jisus nka, Onye mu onwem nēkwusara unu, ka o kwuru, bu Kraist ahu. 4Ewe me ka ufọdu nime ha kweye, ha we dayere Pọl na Sailas; ha na oké ìgwè madu n'etiti ndi-Grik ndi nātu egwu Chineke, ọ dighi kwa ndinyom ole-na-ole nime ndinyom ndi bu ndi-isi dayere ha. 5Ma ndi-Ju, ebe ha nēkwo ekworo, ha kuru ajọ ndikom ufọdu nime ndi nēguzo n'efu n'ọma-ahia ka ha so ha, ha we kpọkọta ìgwè madu, me ka obodo ahu tua ùzù; ha we biakwasi ulo Jeson, chọ uzọ ikuputa ha n'iru ọra madu. 6Ma mb͕e ha nāchọtaghi ha, ha dọkpuru Jeson na umu-nna nime Kraist ufọdu ga n'iru ndi-isi obodo, nēti nkpu, si, Ndia, bú ndi kpùru elu-uwa dum madu bi iru, ha eruwo kwa n'ebe a; 7ndi Jeson kpọbataworo: ndia nile nēmegide kwa iwu nile nke Sisa, ebe ha nāsi na Eze di iche di, bú Jisus. 8Ha we me ka obi lọ ìgwè madu ahu na ndi-isi obodo miri, mb͕e ha nuru ihe ndia. 9Mb͕e ha mesiri ka Jeson na ndi fọduru nọ n'aka-mbe, ha we rapu ha ka ha la.
10Ngwa ngwa umu-nna nime Kraist we zipu Pọl na Sailas n'abali igaru Beria: mb͕e ha ruru ebe ahu, ha ba nime ulo-nzukọ nke ndi-Ju. 11Ma ndia ka ndi bi na Tesalọnaika nma n'obi, ebe ha were obi di ọku nile nara okwu ahu nke-ọma, nēnyocha ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ kwa-ubọchi, ma ihe ndia di otú a. 12Ya mere ọtutu madu nime ha kwere na Jisus; ọ dighi kwa ole-na-ole kwere n'etiti ndinyom Grik ndi anāsọpuru, na n'etiti ndikom. 13Ma mb͕e ndi-Ju nke Tesalọnaika mara na Pọl nēkwusa kwa okwu Chineke na Beria, ha bia-kwa-ra ebe ahu, nākpali ìgwè madu nile, nēme kwa ka obi lọ ha miri. 14Mb͕e ahu umu-nna nime Kraist we zipu Pọl ngwa ngwa iga rue oké osimiri: ma Sailas na Timọti nọgidere n'ebe ahu. 15Ma ndi duru Pọl kuru ya rue Atens: mb͕e ha natasiri iwu inye Sailas na Timọti ka ha biakute ya ọsọsọ ka ike-ha ra, ha we la.
16Ma mb͕e Pọl nēche ha n'Atens, oké iwe nēwe mọ-ya nime ya, mb͕e ọ huru ka obodo ahu juputara n'arusi. 17Ya mere ọ nāgwa ndi-Ju na ndi nātu egwu Chineke okwu n'ulo-nzukọ, ọ nāgwa kwa ndi ọ nēzute n'ọma-ahia okwu kwa-ubọchi. 18Ufọdu kwa nime ndi-Epikurean na ndi-Stoik, bú ndi nāhu amam-ihe n'anya, we zute ya. Ufọdu we si, Gini ka onye-ekwukwu a nāchọ ikwu? ndi ọzọ nāsi kwa, Ọ di ka onye nēkwusa ndi-mọ nke ala ọzọ: n'ihi na ọ nēzisa ozi ọma nke Jisus na nbilite-n'ọnwu-Ya. 19Ha we jide ya, kuru ya je n'iru Areọpagọs, si, Àyi puru ima ihe ozizí ọhu nka bu, nke i nēkwu? 20N'ihi na i nēweta na nti-ayi ihe ufọdu nke ala ọzọ: ya mere ayi nēzube ima isi ihe ndia. 21(Ma ndi Atens nile na ndi ala ọzọ ndi nọ dika ọbìa n'ebe ahu enweghi oghere ime ihe ọzọ di iche, ma-ọbughi ikwu ma-ọbu inu ihe dikariri ọhu.) 22Pọl we guzo n'etiti Areọpagọs, si,
Ndikom nke Atens, n'ihe nile ahuwom na unu nāsọpuru ndi-mọ-unu nke-uku. 23N'ihi na mb͕e m'nāgabiga, nēkiri kwa ihe di iche iche unu nāsọpuru, m'we hu otù ebe-ichu-àjà nke edekwasiri ihe a n'elu ya, ENYERE CHI NKE ANĀMAGHI AMA. Ya mere ihe unu nāsọpuru nāmaghi ama, nka ka mu onwem nēkwusara unu. 24Chineke Onye kère uwa na ihe nile di nime ya, ebe Ọ bu Onye-nwe elu-igwe na ala, Ya onwe-ya adighi-ebi n'ulo nsọ eji aka wu; 25ejighi kwa aka madu jere ya ozi, dika o nwere ihe ọ bula di Ya nkpà, ebe Ya onwe-ya nēnye madu nile ndu, na ume, na ihe nile; 26O we site n'otù onye kè mba nile n'otù n'otù nke madu, ka ha biri n'elu uwa nile, mb͕e O debesiri oge-ha akaworo àkà na ókè nile nke ebe-obibi-ha; 27ka ha we chọ Chineke, ma eleghi anya ha gāsọ ìsì, we chọta Ya, ọ bu ezie na Ọ nọghi n'ebe di anya n'aru onye ọ bula nime ayi: 28n'ihi na ọ bu nime Ya onwe-ya ka ayi nādi ndu, nējeghari kwa, nādi kwa; dika ufọdu ọbuná nime ndi nke unu ndi nēme abù kwuworo, si, N'ihi na ayi bu kwa ndi Ọ muru. 29Ya mere ebe ayi bu ndi Chineke muru, o kwesighi ka ayi nēchè na Ihe akpọrọ Chineke yiri ọla-edo, ma-ọbu ọla-ọcha, ma-ọbu nkume, ihe apiri api site na ǹkà na ihe di n'obi madu. 30Ya mere Chineke lefuru oge nile nke amaghi-ihe anya; ma ub͕u a Ọ nāgwa madu ka ha nile chègharia n'ebe nile: 31ebe O debeworo otù ubọchi, nke Ọ gēkpe elu-uwa dum madu bi ikpé n'ezi omume nime ya site n'aka otù Nwoke Ọ kara àkà; O nye-kwa-ra madu nile ihe ha gēji kwere nka, ebe Ọ mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie.
32Ma mb͕e ha nuru okwu bayere nbilite-n'ọnwu nke ndi nwuru anwu, ufọdu were ya me ihe-ọchì; ma ndi ọzọ siri, Ayi gānu kwa olu-gi bayere nka ọzọ. 33Otú a ka Pọl siri n'etiti ha pua. 34Ma ndikom ufọdu rapara n'aru-ya, we kwere na Jisus: n'etiti ha Daiọnisiọs onye Areọpagọs di kwa, na otù nwanyi, aha-ya bu Damaris, ha na ndi ọzọ.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

ỌLU NDI-OZI 17: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye