II. TIMỌTI 4:19-22
II. TIMỌTI 4:19-22 IGBOB
Kele Priska na Akwila, na èzí-na-ulo Ọnisifọrọs. Erastọs nọgidere na Kọrint: ma arapurum Trọfimọs nime Militọs, aru adighi ya ike. Were inu-ọku-n'obi bia tutu mb͕e oyi erue. Yubulọs nēkele gi, ya na Pudins, na Lainọs, na Klọdia, na umu-nna-ayi nile. Ka Onye-nwe-ayi nọyere mọ nke gi. Ka amara dinyere unu.

