Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. TIMỌTI 2

2
1Ya mere, gi onwe-gi, nwam, ka eme ka i di ike n'amara nke di nime Kraist Jisus. 2Ihe nile i nukwara n'ọnum site n'etiti ọtutu ndi-àmà, nye ihe ndia n'aka madu ndi kwesiri ntukwasi-obi idebe, bú madu ndi ọ gēkwe kwa izí madu-ibe-ha ihe ndia. 3Som hujukọ anya, dika onye-agha ọma nke Kraist Jisus. 4Ọ dighi onye-agha ọ bula nātuhi onwe-ya n'ihe nke ibi-obi a mb͕e o nēbu agha; ka o we me ihe gātọ onye dere aha-ya n'akwukwọ dika onye-agha. 5Ma ọ buru kwa na onye ọ bula nāb͕a nb͕a, ekpughi ya okpu-nmeri, ma ọ buru na ọ b͕aghi nb͕a otú ọ di n'iwu. 6Onye-ọlu-ubi nke nādọb͕u onwe-ya n'ọlu aghaghi ibu uzọ kère òkè na nkpuru-ya. 7Nātughari uche n'ihe m'nēkwu; n'ihi na Onye-nwe-ayi gēnye gi nghọta n'ihe nile. 8Nēcheta Jisus Kraist, dika Onye emeworo ka O si na ndi nwuru anwu bilie, Onye si na nkpuru Devid puta, dika ozi ọmam si di: 9nke m'nāhuju anya nime ya rue ab͕u, dika onye nālu ọlu ọjọ; ma ekeghi okwu Chineke ab͕u. 10N'ihi nka ka m'nwere ntachi-obi n'ihe nile n'ihi ndi arọputara, ka ha onwe-ha we ru kwa nzọputa nke di nime Kraist Jisus, ya na ebube ebighi-ebi. 11Okwu a kwesiri ntukwasi-obi: N'ihi na asi na ayi soro Ya nwukọ ọnwu, ayi gēso kwa Ya dikọ ndu: 12asi na ayi nēnwe ntachi-obi, ayi gēso kwa Ya bukọ eze: asi na ayi gāgọnari Ya, Ya onwe-ya gāgọnari kwa ayi: 13asi na ayi ekweghi ekwe, Ya onwe-ya nānọgide n'ikwesi ntukwasi-obi; n'ihi na Ọ pughi igọnari Onwe-ya.
14Nēchetara ha ihe ndia, nāgwasi ha ike n'iru Onye-nwe-ayi, ka ha ghara ise okwu bayere okwu efu, bú ihe nābaghi n'ihe, nēkpù ndi nānu anu iru. 15Nānu ọku n'obi iche onwe-gi n'iru madu dika onye Chineke nwaputaworo, onye-ọlu nke ihere nāpughi ime ya, onye nēkwuzi okwu nke ezi-okwu ahu. 16Ma nēze okwu efu nile emeruru emeru: n'ihi na ha gāga kari n'iru n'asọpurughi-Chineke, 17okwu-ha gābu kwa ọnyá nāba aba dika gangrene: ndi Haimeniọs na Filitọs di n'etiti ha; 18bú madu ndi hiere n'ihe bayere ezi-okwu ahu, nāsi na nbilite-n'ọnwu agabigawo ub͕u a, ha nēkpù kwa okwukwe madu ufọdu iru. 19Otú ọ di, ntọ-ala di ike nke Chineke nēguzo, ebe o nwere akàrà nka, Onye-nwe-ayi mara ndi bu nke Ya: na, Ka onye ọ bula nke nākpọ aha Onye-nwe-ayi si n'ajọ omume wezuga onwe-ya. 20Ma nime ulo uku ọ bughi nání ihe ọla-edo na ihe ọla-ọcha di, kama ihe osisi na ihe ájá di kwa; e mekwara ufọdu ka ha buru ihe-nsọpuru, me kwa ufọdu ha na buru ihe-ihere. 21Ya mere ọ buru na onye ọ bula asacha onwe-ya pua n'ihe ndia, ọ gābu ihe emere ka ọ buru ihe-nsọpuru, ihe edoworo nsọ, ihe bara n'ihe ka Onye-nwe-ya were ya me ihe, ihe edoziworo iji lu ezi ọlu nile ọ bula. 22Ma nāb͕anari agu ihe ọjọ nāgu nwa-okorọbia, nāb͕aso kwa ezi omume, okwukwe, ihu-n'anya, udo, gi na ndi nākpọku Onye-nwe-ayi site n'obi di ọcha. 23Ma nāju iju-ajuju nzuzu na nke amaghi-ihe, ebe i matara na ha nāmuputa ilu-ọ̀gù. 24Ma orù nke Onye-nwe-ayi aghaghi ibu onye nādighi-alu ọ̀gù, kama ọ ghaghi idi nwayọ n'ebe madu nile nọ, ọ ghaghi kwa ibu onye nwere ike izí ihe, onye nānagide ihe ọjọ, 25n'idi-nwayọ nādọ ndi nēdo onwe-ha imegide ya aka na nti; ma asi na ọ bu ezie ma eleghi anya na Chineke gēnye ha nchèghari ka ha we mazu ezi-okwu, 26we teta n'ura manya pua n'ọnyà ekwensu, ebe orù Onye-nwe-ayi nwudeworo ha na ndu ka ha me ihe Chineke nāchọ.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

II. TIMỌTI 2: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye