Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. NDI TESALỌNAIKA 1

1
1Pọl na Silvanọs na Timọti nēdegara nzukọ nke ndi Tesalọnaika nime Chineke, bú Nna-ayi, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, akwukwọ: 2Amara diri unu na udo nke si n'aka Chineke, bú Nna-ayi, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist puta.
3Ayi ji ugwọ ikele Chineke ekele mb͕e nile bayere unu, umu-nna-ayi, dika o kwesiri, n'ihi na okwukwe-unu nāba uba nke-uku, ihunanya ahu unu nile n'otù n'otù nāhurita ibe-unu nēri kwa nne; 4ya mere ayi onwe-ayi nānya isi n'aru unu n'etiti nzukọ Chineke nile n'ihi ntachi-obi-unu na okwukwe-unu nime nsob͕u-unu nile na nime nkpab͕u nile unu nānagide; 5nke bu ihe nēme ka ikpé ziri ezi nke Chineke puta ìhè; ka ewe gua unu na ndi kwesiri ala-eze Chineke, nke unu nāhu kwa ahuhu n'ihi ya: 6asi na ọ bu ezie na o ziri ezi n'ebe Chineke nọ inyeghachi ndi nākpab͕u unu nkpab͕u, 7na inyeghachi unu, bú ndi anākpab͕u, aru-efè, ayi na unu, nime nkpughe nke Onye-nwe-ayi Jisus site n'elu-igwe, Ya na ndi-mọ-ozi nke ike-Ya, 8nime ọku nēre ere, nābọ̀ ọ́bọ̀ n'aru ndi nāmataghi Chineke, ha na ndi nāṅaghi nti ozi ọma nke Onye-nwe-ayi Jisus: 9bú madu ndi gāhu ahuhu-nmehie nke ọmuma-ikpe ziri ezi, bú nbibi ebighi-ebi nke sitere n'iru Onye-nwe-ayi, site kwa n'ebube nke ike-Ya, 10mb͕e ọ bula Ọ gabia ka ewe nye Ya otuto nime ndi nsọ Ya, ka ibobo-Ya we nwu kwa ihe nile n'aru nime ndi kwereri ekwe (n'ihi na ekwere àmà ayi b͕ara unu) n'ubọchi ahu. 11Ọ bu kwa nka ka ayi ji nēkpe kwa ekpere bayere unu mb͕e nile, ka Chineke-ayi we gua unu na ndi kwesiri ọkpukpọ akpọrọ unu, ka O were kwa ike mezu ihe nile ọ bula nke diri idi-nma ezi nma na ọlu nile ọ bula nke okwukwe; 12ka ewe nye aha Onye-nwe-ayi Jisus otuto nime unu, nye kwa unu onwe-unu otuto nime Ya, dika amara nke Chineke-ayi na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist si di.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

II. NDI TESALỌNAIKA 1: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye