Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. SAMUEL 6

6
1Devid we chikọta kwa ndikom nile arọputara arọputa n'Israel, orú nnù madu uzọ atọ na nnù iri-na-ise. 2Devid we bilie, si na Beale Juda je, ya na ndi Israel nile ndi ya na ha nọ, isi n'ebe ahu bugota ib͕e Chineke, nke akpọkwasiri Aha, bú aha Jehova nke usu nile nke ndi-agha Onye nānọkwasi cherubim. 3Ha we me ka ub͕ọ-ala ọhu būru ib͕e Chineke, ha we buputa ya n'ulo Abinadab nke di n'ugwu ntà: Uza na Ahio, bú umu Abinadab, we nēdu ub͕ọ-ala ọhu ahu. 4Ha we buputa ya n'ulo Abinadab nke di n'ugwu ntà, ya na ib͕e Chineke: Ahio we nēje n'iru ib͕e ahu. 5Devid na ulo Israel nile nēgwu egwū n'iru Jehova, were ihe nile eji osisi fir me, were kwa ubọ-akwara, na une, na egwú-otiti, na castanet, na ájà. 6Ha we biarue ebe-nzọcha-ọka Nakon, Uza we setia aka-ya rue ebe ib͕e Chineke di, jide ya, n'ihi na ehi nāb͕a ukwu. 7Iwe Jehova we di ọku megide Uza; Chineke we tib͕ue ya n'ebe ahu n'ihi nmehie-ya; o we nwua n'ebe ahu n'akuku ib͕e Chineke. 8Iwe Devid we di ọku n'ihi na Jehova tiwaputara ntiwa megide Uza: ọ we kpọ ebe ahu Perez-uza, rue ta. 9Devid we tua egwu Jehova n'ubọchi ahu; ọ si, Ìb͕e Jehova gēsi aṅa biakutem? 10Devid ekweghi kwa iwezugara onwe-ya ib͕e Jehova rue obodo Devid; ma Devid buzugara ya rue ulo Obed-edom, bú onye Gat. 11Ib͕e Jehova we nọdu n'ulo Obed-edom, bú onye Gat, ọnwa atọ: Jehova we gọzie Obed-edom na ulo-ya nile. 12Ewe gosi eze, bú Devid, si, Jehova agọziwo ulo Obed-edom na ihe nile o nwere, n'ihi ib͕e Chineke. Devid we were ọṅu je, si n'ulo Obed-edom bugota ib͕e Chineke n'obodo Devid. 13O rue, mb͕e ndi nēbu ib͕e Jehova zọrọ nzọ-ukwu isi, na ọ churu ehi na nwa-ehi mara abuba n'àjà. 14Devid were kwa ike-ya nile te egwún'iru Jehova; ewere ephod ákwà ọcha ke Devid n'ukwù. 15Devid na ulo Israel nile we were iti-nkpu, were kwa olu opì-ike, nēbugota ib͕e Jehova. 16O rue, mb͕e ib͕e Jehova batara n'obodo Devid, na Maikal nwa-nwayi Sọl lepuru anya na window, hu eze, bú Devid, ka ọ nāwuli, nēte kwa egwú, n'iru Jehova; o we leda ya anya n'obi-ya. 17Ha we bubata ib͕e Jehova, guzo ya n'ọnọdu-ya, n'etiti ulo-ikwū nke Devid mara nye ya: Devid we sure àjà-nsure-ọku na àjà-udo n'iru Jehova. 18Devid we surebìe àjà-nsure-ọku ahu na àjà-udo nile, gọzie ndi Israel n'aha Jehova nke usu nile nke ndi-agha. 19O we kesara ndi Israel nile, bú ìgwè nile nke Israel, ma nwoke ma nwayi, madu ọ bula, otù ob͕e achicha, na otú ọkpurukpu anu, na otù mbadamba nkpuru-vine amiri ami. Ndi Israel nile we la, nwoke ọ bula n'ulo-ya. 20Devid we lata igọzi ulo-yaz. Maikal, bú nwa-nwayi Sọl, we puta izute Devid, si, Le, otú eze Israel di nsọpuru nke-uku ta, onye kpupuru uwe n'aru-ya ta n'anya ndi-orù-nwayi nke ndi-orù-ya, dika otù nime ndikom efu nēkpupu uwe n'aru-ya ekpupu! 21Devid we si Maikal, Ọ bu n'iru Jehova, Onye rọputaramn kari nna-gi, kari kwa ulo-ya nile, inyem iwu ibu onye-ndú ndi Jehova, bú Israel: m'we gwú egwu n'iru Jehova. 22Ma m'gēweta-kwa-ra onwem nkọcha kari nka, m'gādi kwa ala n'anyam: ma ndi orù-nwayi ndi i kwuru okwu bayere ha, n'etiti ha ka agāsọpurum. 23Ma Maikal, bú nwa-nwayi Sọl, o nweghi nwa rue ubọchi ọnwu-ya.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

II. SAMUEL 6: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye