Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. NDI-EZE 9:1-13

II. NDI-EZE 9:1-13 IGBOB

Ma Elaisha, bú onye-amuma, kpọrọ otù onye nime umu ndi-amuma, si ya, Ke ihe-ọkiké n'úkwù-gi, were karama manu a n'aka-gi, je Remot-gilead. Mb͕e i biara ebe ahu, gi hu Jihu nwa Jehoshafat nwa Nimshi anya n'ebe ahu, ba nime, me ka o bilie site n'etiti umu-nne-ya, me kwa ka ọ ba n'ime-ulo di n'ime-ulo. Gi were kwa karama manu ahu, wukwasi ya n'isi-ya, si, Otú a ka Jehova siri, Etewom i manu ibu eze Israel. Meghe kwa uzọ, b͕alaga, eche-kwa-la eche. Nwa-okorọbia ahu, ọbuná nwa-okorọbia ahu, bú onye-amuma, we jerue Remot-gilead. Ọ bia, ma, le, ndi-isi usu-ndi-agha nanọdu ala; ọ si, Enwerem okwu igwa gi, onye-isi. Jihu we si, Ọ̀ bu onye nime ayi nile? Ọ si, Ọ bu gi, onye-isi. O bilie, ba n'ulo; ọ wukwasi manu ahu n'isi-ya, si ya, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Etewom i manu ibu eze ndi Jehova, bú Israel. I gētib͕u kwa ulo Ehab, bú onye-nwe-gi, ka M'we bọ ọ́bọ̀ ọbara ndi-orùm, bú ndi-amuma, na ọbara ndi-orù nile nke Jehova, n'aka Jezebel. Ulo nile nke Ehab gāla kwa n'iyì: M'gēbipu kwa n'aru Ehab nwa-nwoke ọ bula, na onye eb͕ochiri eb͕ochi na onye arapuru arapu n'Israel. M'gēme kwa ulo Ehab ka ọ di ka ulo Jeroboam nwa Nebat, ka ọ di kwa ka ulo Beasha nwa Ahaija. Nkita gēri kwa Jezebel n'òkè-ala-ubi Jezreel, ọ dighi kwa onye nēlì ya. O we meghe uzọ b͕alaga. Jehu we pukute ndi-orù onye-nwe-ya: otù onye we si ya, Ùdo di kwa? gini mere onye a nke nāwi ara biakutere gi? Ọ si ha, Unu onwe-unu amawo nwoke ahu na nkpari-uka-ya. Ha si, Ọ bu okwu-ugha; biko, gosi ayi. Ọ si, Otú a na otú a ka ọ gwaram, si, Otú a ka Jehova siri, Etewom i manu ibu eze Israel. Ha we me ngwa, chiri, nwoke ọ bula uwe-ya, do ya n'okpuru ya n'elu ihe-nrigo, fùa opì-ike, si, Jihù bu eze.