Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. NDI-EZE 9:1-13

II. NDI-EZE 9:1-13 Bible Nso (IGBOB)

Ma Elaisha, bú onye-amuma, kpọrọ otù onye nime umu ndi-amuma, si ya, Ke ihe-ọkiké n'úkwù-gi, were karama manu a n'aka-gi, je Remot-gilead. Mb͕e i biara ebe ahu, gi hu Jihu nwa Jehoshafat nwa Nimshi anya n'ebe ahu, ba nime, me ka o bilie site n'etiti umu-nne-ya, me kwa ka ọ ba n'ime-ulo di n'ime-ulo. Gi were kwa karama manu ahu, wukwasi ya n'isi-ya, si, Otú a ka Jehova siri, Etewom i manu ibu eze Israel. Meghe kwa uzọ, b͕alaga, eche-kwa-la eche. Nwa-okorọbia ahu, ọbuná nwa-okorọbia ahu, bú onye-amuma, we jerue Remot-gilead. Ọ bia, ma, le, ndi-isi usu-ndi-agha nanọdu ala; ọ si, Enwerem okwu igwa gi, onye-isi. Jihu we si, Ọ̀ bu onye nime ayi nile? Ọ si, Ọ bu gi, onye-isi. O bilie, ba n'ulo; ọ wukwasi manu ahu n'isi-ya, si ya, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Etewom i manu ibu eze ndi Jehova, bú Israel. I gētib͕u kwa ulo Ehab, bú onye-nwe-gi, ka M'we bọ ọ́bọ̀ ọbara ndi-orùm, bú ndi-amuma, na ọbara ndi-orù nile nke Jehova, n'aka Jezebel. Ulo nile nke Ehab gāla kwa n'iyì: M'gēbipu kwa n'aru Ehab nwa-nwoke ọ bula, na onye eb͕ochiri eb͕ochi na onye arapuru arapu n'Israel. M'gēme kwa ulo Ehab ka ọ di ka ulo Jeroboam nwa Nebat, ka ọ di kwa ka ulo Beasha nwa Ahaija. Nkita gēri kwa Jezebel n'òkè-ala-ubi Jezreel, ọ dighi kwa onye nēlì ya. O we meghe uzọ b͕alaga. Jehu we pukute ndi-orù onye-nwe-ya: otù onye we si ya, Ùdo di kwa? gini mere onye a nke nāwi ara biakutere gi? Ọ si ha, Unu onwe-unu amawo nwoke ahu na nkpari-uka-ya. Ha si, Ọ bu okwu-ugha; biko, gosi ayi. Ọ si, Otú a na otú a ka ọ gwaram, si, Otú a ka Jehova siri, Etewom i manu ibu eze Israel. Ha we me ngwa, chiri, nwoke ọ bula uwe-ya, do ya n'okpuru ya n'elu ihe-nrigo, fùa opì-ike, si, Jihù bu eze.

II. NDI-EZE 9:1-13 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Emesịa, Ịlaisha onye amụma, kpọrọ otu onye nʼime ụmụ ndị amụma sị ya, “Jikere, fanye ọnụ uwe mwụda gị nʼeriri ikere nʼukwu gị, werekwa karama mmanụ oliv a nʼaka gị, bịa ka ị gaa Ramọt Gilead. I jeruo ebe ahụ, jee hụ Jehu nwa Jehoshafat, nwa Nimshi anya. Mee ka o bilie site nʼetiti ndị ha na ya nọ. Mekwaa ka gị na ya naanị baa nʼime ụlọ. Were karama mmanụ wụkwasị ya nʼisi gwa ya okwu sị, ‘Otu a ka ONYENWE ANYị kwuru, eteela m gị mmanụ ịbụ eze Izrel.’ I mesịa, meghe ụzọ ọsịịsọ, sitekwa nʼebe ahụ gbapụ ọsọ.” Nwokorobịa onye amụma ahụ gara Ramọt Gilead. Mgbe o jeruru, ọ hụrụ ebe ọchịagha ahụ nọdụrụ nʼala nʼetiti ndịisi agha ibe ya. O kwuru sị, “Enwere m ozi m ga-ezi gị, ọchịagha.” Jehu jụrụ, “Ọ bụ onye nʼime anyị ka ị chọrọ izi ozi?” Ọ zara, “Ọ bụ gị ọchịagha.” Jehu biliri baa nʼime ụlọ. Nwokorobịa onye amụma ahụ wụkwasịrị ya mmanụ nʼisi, sị ya, “Otu a ka ONYENWE ANYị, Chineke Izrel sịrị, ‘Eteela m gị mmanụ ịbụ eze ndị nke ONYENWE ANYị, bụ Izrel. Ị ga-ekpochapụ ezinaụlọ Ehab, nna gị ukwu, aga m esi otu a bọtara onwe m ọbọ, nʼihi ọbara ndị ohu m, bụ ndị amụma na ọbara ndị ozi ONYENWE ANYị niile Jezebel wufuru. Ezinaụlọ Ehab ga-abụ ihe lara nʼiyi. Nʼala Izrel, m ga-esite nʼezinaụlọ Ehab bipụ ndị ikom niile, maọbụ ohu maọbụ onye nwe onwe ya. M ga-ala ụlọ Ehab nʼiyi, ka m si laa ezinaụlọ Jeroboam nwa Nebat nʼiyi, na dịka m si lakwaa ezinaụlọ Baasha, nwa Ahija nʼiyi. Nkịta ga-erikwa anụ Jezebel nwunye Ehab na Jezril. Ọ dịkwaghị onye ga-eli ya.’ ” Mgbe o kwuchara okwu ndị a, onye amụma ahụ meghere ụzọ gbapụ ọsọ. Jehu jekwuuru ndịisi agha ibe ya. Otu onye nʼime ha jụrụ ya sị, “Gịnị ka onye ara ahụ chọrọ bịa? Udo ọ dịkwa?” Jehu zara, “Unu maara onye ọ bụ, marakwa ụdị okwu ga-esi ya nʼọnụ pụta.” Ha sịrị, “Ihe i kwuru abụghị eziokwu, gwa anyị ihe o kwuru.” Jehu sịrị, “Ihe ndị a ka ọ gwara m, ‘Otu a ka a ONYENWE ANYị kwuru, Eteela m gị mmanụ ịbụ eze Izrel.’ ” Ngwangwa ha chịịrị uwe mgbokwasị ha niile doo ha nʼusoro nʼala ebe ahụ ka Jehu zọkwasị ha ụkwụ. Ha fụrụ opi ike tie mkpu sị, “Jehu bụ eze!”