Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. NDI-EZE 3

3
1Ma Jehoram nwa Ehab malitere ibu eze Israel nime Sameria n'arọ nke-iri-na-asatọ nke Jehoshafat, bú eze Juda, o we buru eze arọ iri na abua. 2O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova; nání na o meghi dika nna-ya, na dika nne-ya: o wezuga ogidi Beal nke nna-ya mere. 3Otú ọ di, ọ rapara na nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat, nke o ji me ka Israel mehie; o wezugaghi onwe-ya nime ya.
4Ma Misha, bú eze Moab, bu onye-nwe ìgwè anu-ulo; o we tuara eze Israel utu aji nke orú nnù umu-aturu uzọ iri-na-abua na nnù iri, na nke orú nnù ebulu uzọ iri-na-abua na nnù iri. 5O rue, mb͕e Ehab nwuru, na eze Moab jehiere megide eze Israel. 6Eze, bú Jehoram, we si na Sameria pua n'ubọchi ahu, gukọta Israel nile. 7O je kwa, zigara Jehoshafat, bú eze Juda, ozi, si, Eze Moab ejehiewo megidem: ì gēsorom jekuru Moab ibu agha? Ọ si, M'gārigo: dika m'di, otú a ka i di; dika ndim di, otú a ka ndi-gi di; dika inyinyam di, otú a ka inyinya-gi di. 8Ọ si, Òle nke bu uzọ ayi gēsi rigo? Ọ si, Uzọ ọzara Edom. 9Eze Israel we je, ya na eze Juda, na eze Edom: ha we ga ije ubọchi asa buruburu: ma ọ dighi miri diri ọmuma-ulo-ikwū ahu, ma ọbu nke diri anu-ulo nke ha chiri je. 10Eze Israel we si, Ewó! n'ihi na Jehova akpọwo eze atọ ndia inye ha n'aka Moab. 11Jehoshafat we si, Ọ̀ dighi onye-amuma Jehova nọ ebe a, ka ayi we jua Jehova ase site n'aka-ya? Otù nime ndi-orù eze Israel we za, si, Elaisha nwa Shefat nọ ebe a, onye wukwasiri miri n'aka Elaija. 12Jehoshafat we si, Okwu Jehova di n'ebe ọ nọ. Eze Israel na Jehoshafat na eze Edom we ridakuru ya. 13Elaisha we si eze Israel, Gini ka mu na gi nwekọrọ? jekuru ndi-amuma nna-gi, jekuru kwa ndi-amuma nne-gi. Eze Israel we si ya, É-è: n'ihi na Jehova akpọwo eze atọ ndia inye ha n'aka Moab. 14Elaisha we si, Jehova nke usu nile nke ndi-agha nādi ndu, Onye m'guzoworo n'iru Ya, n'ezie, ọ buru na ahughm Jehoshafat, bú eze Juda, iru-ọma, m'gaghi-elegide anya n'ebe i nọ ma-ọli, m'gaghi-ahu kwa gi anya ma-ọli. 15Ma ub͕u a kutaranum ọkpọ-ubọ. O rue, mb͕e ọkpọ-ubọ ahu nākpọ, na aka Jehova di n'aru ya. 16Ọ si, Otú a ka Jehova siri, Me ndagwurugwu a ka ọ buru olùlù olùlù. 17N'ihi na otú a ka Jehova siri, Unu agaghi-ahu ifufe, unu agaghi-ahu kwa oké miri-ozuzo, ma ndagwurugwu ahu gējuputa na miri: unu gāṅu kwa, unu onwe-unu, na anu-ulo-unu, na anumanu-unu nile. 18Ma nka di nfe n'anya Jehova: Ọ gēnye kwa Moab n'aka-unu. 19Unu gētib͕u kwa obodo ọ bula ewusiri ike, na obodo ọ bula kachasi nma, unu gēme kwa ka ezi osisi ọ bula da, unu gēkpochi kwa isi-iyi miri nile, were kwa nkume mebie ezi òkè ala-ubi ọ bula. 20O rue n'ututu, na, mb͕e anēsure onyinye-inata-iru-ọma, le, miri nēsi n'uzọ Edom bia, ala we juputa na miri. 21Moab nile we nu na ndi-eze ahu arigotawo ibuso ha agha, ha we kpọkọta onwe-ha, site n'onye ọ bula nke nēke onwe-ya ihe-ọkiké agha n'úkwù, we rigorue ndi bu okenye, ha we guzo n'ókè-ala-ha. 22Ha we bilie n'isi-ututu, ma anyanwu mukwasiri miri ahu, Moab we hu miri ahu na ncherita-iru ha ka ọ nācha ọbara dika ọbara: 23ha we si, Nka bu ọbara; ekpochapuwo ndi-eze ahu nọ̄, ha etib͕uwo kwa, nwoke ọ bula ibe-ya: ma ub͕u a, Moab, kwatanu ihe-nkwata. 24Ha biarue ọmuma-ulo-ikwū Israel, Israel we bilie, tib͕ue Moab, ha we si n'iru ha b͕alaga: ha we ba nime ya nētib͕u Moab. 25Ha we tipia obodo nile ha; ha nātubà kwa, nwoke ọ bula nkume-ya, n'ezi òkè ala-ubi ọ bula, tujue ya; ha nēkpochi kwa isi-iyi miri nile, me ka ezi osisi nile da: rue mb͕e ọ bu nání na Kia-hareset ka emere ka nkume-ya fọdu; ma ndi-ọma-èbè b͕ara ya buruburu, tib͕ue ya. 26Eze Moab we hu na agha ahu di ike kari ya, o we chiri nnù ndikom na ọgu iri-na-ise tiyere onwe-ya, bú ndi nāmiputa mma-agha, itiwaru eze Edom: 27O we were ọkpara-ya, nke gābu eze n'ọnọdu ya, sure ya ọku n'elu mb͕idi, ka ọ buru àjà-nsure-ọku. Oké iwe we di megide Israel: ha we si n'ebe ọ nọ bulie ije, laghachi n'ala-ha.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

II. NDI-EZE 3: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye