Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. NDI-EZE 10

10
1Ma Ehab nwere ọgu umu-ndikom atọ na iri nime Sameria. Jihu we de akwukwọ ziga na Sameria, zigara ndi-isi Jezreel, bú ndi-okenye, ziga-kwa-ra ndi nāzù umu Ehab, si, 2Ma ub͕u a, mb͕e akwukwọ a bara n'aka-unu, ebe umu onye-nwe-unu nọ n'etiti unu, ebe ub͕ọ-ala na inyinya di kwa n'etiti unu, na obodo ewusiri ike, na ihe-agha; 3leputanu onye ahu nke kachasi nma, nke zi-kwa-ra ezi karisia, nime umu-ndikom onye-nwe-unu, donu ya n'elu oche-eze nna-ya, buere ulo onye-nwe-unu agha. 4Ha we tua egwu nke-uku ri nne, si, Le, eze abua eguzoghi n'iru ya: àyi onwe-ayi gēsi kwa aṅa guzo? 5Onye nke bu onye-isi ulo, na onye nke bu onye-isi obodo, na ndi-okenye, na ndi nāzù umu eze, we zigara Jihu ozi, si, Ndi-orù-gi ka ayi bu, ayi gēme kwa ihe nile i si ayi me; ayi agaghi-eme nwoke ọ bula eze: gi me ihe di nma n'anya-gi. 6O we degara ha akwukwọ nke ub͕ò abua, si, Ọ buru na mu ka unu diri, ọ buru kwa na olum ka unu onwe-unu nēge nti, chirinu isi ndikom ahu, bú umu onye-nwe-unu, biakutem dika mb͕e a echi rue Jezreel. Ma umu eze, bú ọgu ndikom atọ na iri, nọ n'aka ndi uku obodo ahu, ndi nāzùlite ha. 7O rue, mb͕e akwukwọ ahu bara ha n'aka, na ha chiri umu eze, b͕ue ha, bú ọgu ndikom atọ na iri, tiye isi-ha nime nkata, zigara ya rue Jezreel. 8Onye-ozi we bia, gosi ya, si, Ha ebubatawo isi umu eze. Ọ si, Tukọbanu ha n'obo abua n'oghere ọnu-uzọ-ama rue ututu. 9O rue, n'ututu, na ọ puru, guzo, si ndi Israel nile, Ndi ezi omume ka unu bu: le, mu onwem kekọtara madu imegide onye-nwem, b͕ue ya: ma ònye tib͕uru ndia nile? 10Maranu ub͕u a na ọ dighi okwu ọ bula gāda n'ala nime okwu Jehova, nke Jehova kwuru bayere ulo Ehab: n'ihi na Jehova emewo ihe O kwuru n'aka orù-Ya, bú Elaija. 11Jihu we tib͕ue ndi nile fọduru ulo Ehab nime Jezreel, na ndi uku ya nile, na ndi ọ mara nke-ọma, na ndi-nchu-àjà-ya, rue mb͕e ọ dighi onye fọduru ọ rapuru ya. 12O bilie, bia, jerue Sameria. Mb͕e ya onwe-ya ruru ulo-nlibe-anu nke ndi-ọzùzù-aturu n'uzọ, 13Jihu hutara umu-nne Ehazaia, bú eze Juda, ọ si, Òle ndi ka unu bu? Ha si, Umu-nne Ehazaia ka ayi bu: ayi nārida kwa iju ajuju bayere udo umu eze na umu eze-nwayi. 14Ọ si, Jidenu ha na ndu. Ha we jide ha na ndu, b͕ue ha n'olùlù ulo-nlibe-anu, bú ọgu ndikom abua na abua; o kweghi kwa ka nwoke ọ bula fọdu nime ha.
15O si n'ebe ahu je, we huta Jehonadab nwa Rikab, ka ọ nābia izute ya: ọ gọzie ya, si ya, Obi-gi, ò ziri ezi, dika obim di n'ebe obi-gi di? Jehonadab we si, Otú a ka ọ di. Ọ buru na ọ di otú a, nyem aka-gi. O we nye ya aka-ya; o we me ka ọ rigo n'ub͕ọ-ala-ya. 16Ọ si, Jesom, le ekworo m'nēkworo Jehova. Ha we me ka ọ ga ije n'ub͕ọ-ala-ya. 17Ọ biarue Sameria, tib͕ue ndi nile fọduru Ehab nime Sameria, rue mb͕e o kpochapuru ya, dika okwu Jehova si di, nke Ọ gwara Elaija. 18Jihu we chikọta ndi Israel nile, si ha, Ehab fère Beal òfùfè nke-ntà; Jihu gēfè ya òfùfè rinne. 19Ma ub͕u a, kpọnu ndi-amuma nile nke Beal, na ndi nile nēfè ya, na ndi-nchu-àjà-ya nile, ka ha biakutem; ka aghara ile anya nwoke ọ bula ma ahughi ya: n'ihi na enwerem àjà uku ichuru Beal; onye ọ bula elere anya ya ma ahughi ya, ọ gaghi-adi ndu. Ma Jihu mere ya n'aghughọ, ka o we me ka ndi nēfè Beal la n'iyì. 20Jihu we si, Donu ubọchi nb͕ochi nsọ nye Beal. Ha we kpọsa ya. 21Jihu we ziga ozi n'Israel nile: ndi nile nēfè Beal we bia, ọ dighi kwa nwoke ọ bula fọduru nke nābiaghi. Ha we ba n'ulo Beal; ulo Beal we juputa na madu site n'otù ọnu-uzọ rue ọnu-uzọ ọzọ. 22Ọ si onye ahu nke bu onye-isi ulo anēdebe uwe, Chiputara ndi nile nēfè Beal uwe. O we chiputara ha uwe. 23Jihu we ba, ya na Jehonadab nwa Rikab, n'ulo Beal; ọ si ndi nēfè Beal, Chọsienu ike, hu, ka otù nime ndi nēfè Jehova ghara idi n'ebe a n'etiti unu, kama ndi nēfè Beal, nání ha. 24Ha we ba ime àjà na àjà-nsure-ọku. Ma Jihu doro nye onwe-ya ọgu ndikom anọ n'èzí, si, Nwoke ahu nke kwere ka otù onye wepuga onwe-ya nime ndikom ahu ndi mu onwem nēme ka ha ba n'aka-unu, ndu-ya gālara ndu-ya. 25O rue, mb͕e o surebìri àjà-nsure-ọku, na Jihu siri ndi-ọb͕a-ọsọ, si kwa ndi-isi-agha, Banu, tib͕ue ha; ekwela nwoke ọ bula pua. Ha we were ọnu mma-agha tib͕ue ha; ndi-ọb͕a-ọsọ na ndi-isi-agha tupuru ha n'èzí, jerue obodo ulo Beal. 26Ha we buputa ogidi nke ulo Beal, sure ha ọku. 27Ha kwatu-kwa-ra ogidi Beal, kwatu kwa Beal, me ka ọ buru olùlù-ọkwu, rue ta. 28Jihu we kpochapu Beal n'Israel. 29Nání nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat, nke o jiri me ka Israel mehie, Jihu ewezugaghi onwe-ya n'iso ha, bú umu-ehi ọla-edo ahu nke di na Bet-el, na nke di na Dan. 30Jehova we si Jihu, N'ihi na i mewo nke-ọma n'ime ihe ziri ezi n'anyam, i we me ulo Ehab dika ihe nile si di nke di n'obim, umu-gi ndikom nke umu-umu nke-anọ gānọkwasiri gi n'oche-eze Israel. 31Ma Jihu elezighi anya ijeghari n'iwu Jehova, bú Chineke Israel, n'obi-ya nile: o wezugaghi onwe-ya pua na nmehie nile nke Jeroboam, nke o jiri me ka Israel mehie.
32Na mb͕e ahu ka Jehova malitere ibipu ufọdu n'Israel: Hazael we tib͕ue ha n'ókè ala nile nke Israel; 33site na Jọdan n'ọwuwa-anyanwu, ala nile nke Gilead, ndi Gad, na ndi Reuben, na ndi Manase, site n'Aroea, nke di n'akuku ndagwurugwu Anon, bú Gilead na Beshan. 34Ma okwu Jihu nile nke fọduru, na ihe nile o mere, na idi-ike-ya nile, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel? 35Jihu we so nna-ya-hà dina n'ọnwu: ha we lìe ya na Sameria. Jehoahaz nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya. 36Ma ubọchi Jihu bu eze Israel nime Sameria di orú arọ na asatọ.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

II. NDI-EZE 10: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye