Na mb͕e ahu ka Jehova malitere ibipu ufọdu n'Israel: Hazael we tib͕ue ha n'ókè ala nile nke Israel; site na Jọdan n'ọwuwa-anyanwu, ala nile nke Gilead, ndi Gad, na ndi Reuben, na ndi Manase, site n'Aroea, nke di n'akuku ndagwurugwu Anon, bú Gilead na Beshan. Ma okwu Jihu nile nke fọduru, na ihe nile o mere, na idi-ike-ya nile, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel? Jihu we so nna-ya-hà dina n'ọnwu: ha we lìe ya na Sameria. Jehoahaz nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya. Ma ubọchi Jihu bu eze Israel nime Sameria di orú arọ na asatọ.
Gụọ II. NDI-EZE 10
Geere nke a ntị II. NDI-EZE 10
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: II. NDI-EZE 10:32-36
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo