II. NDI-EZE 10:32-36
II. NDI-EZE 10:32-36 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼoge ahụ, ONYENWE ANYị malitere ime ka ndị Izrel bido ịdị nta. Hazael eze Aram, buru agha merie ọtụtụ akụkụ Izrel, nke dị nʼọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan, na ala niile nke Gilead (nʼoke ala ndị Gad, na nke ndị Ruben, na Manase), site nʼAroea nke dị nʼakụkụ ndagwurugwu Anọn, ruo Gilead na Bashan. Akụkọ gbasara ọchịchị eze Jehu, na ihe niile o mere, na ịkpa ike ya niile, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Izrel? Jehu sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya na Sameria. Nwa ya bụ Jehoahaz nọchiri anya ya dịka eze. Ma ụbọchị niile Jehu bụ eze Izrel nʼime Sameria dị iri afọ abụọ na asatọ.
II. NDI-EZE 10:32-36 Bible Nso (IGBOB)
Na mb͕e ahu ka Jehova malitere ibipu ufọdu n'Israel: Hazael we tib͕ue ha n'ókè ala nile nke Israel; site na Jọdan n'ọwuwa-anyanwu, ala nile nke Gilead, ndi Gad, na ndi Reuben, na ndi Manase, site n'Aroea, nke di n'akuku ndagwurugwu Anon, bú Gilead na Beshan. Ma okwu Jihu nile nke fọduru, na ihe nile o mere, na idi-ike-ya nile, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel? Jihu we so nna-ya-hà dina n'ọnwu: ha we lìe ya na Sameria. Jehoahaz nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya. Ma ubọchi Jihu bu eze Israel nime Sameria di orú arọ na asatọ.