Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. NDI KỌRINT 8

8
1Ọzọ, umu-nnam, ayi nēme ka unu mara amara Chineke nke enyeworo nime nzukọ Kraist nile nke Masedọnia; 2na nime ọtutu nnwaputa nke nkpab͕u, nbabiga-ókè nke ọṅù-ha na ob͕eye-ọnu-ntu ha bu babigara ókè rue àkù nke afọ-ofufo-ha. 3N'ihi na ka ike-ha ra, dika m'nāb͕a àmà, e, kari kwa ike-ha, ka ha nyere dika ha zuputara n'onwe-ha, 4ha were ọtutu aririọ nāriọ ayi ka ayi nye ha amara nka na nnwekọ ije-ozi anējere ndi nsọ: 5ha me-kwa-ra nka, ọ bughi dika ayi lere anya, kama ha buru uzọ were onwe-ha nye Onye-nwe-ayi, nye kwa ayi site n'ọchichọ Chineke. 6Ya mere ayi riọrọ Taitọs, ka, dika ọ malitereri na mbu, ka ọ luzu kwa n'etiti unu amara nka otú a kwa. 7Ma dika unu babigara ókè n'ihe nile, bú okwukwe, na okwu, na ihe-ọmuma, na inu-ọku-n'obi nile, na ihu-n'anya unu huru ayi, lezienu anya ka unu babiga kwa ókè n'amara nka. 8Ekwughm n'uzọ inye iwu, kama n'iwere inu-ọku-n'obi nke ndi ọzọ nwaputa kwa ihu-n'anya-unu na ọ bu ezi ihu-n'anya. 9N'ihi na unu mara amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, na, ọ bu ezie na Ọ bu ọgaranya, ma Ọ ghọrọ ob͕eye n'ihi unu, ka unu onwe-unu we were ob͕eye-Ya ghọ ndi-ọgaranya. 10Na nka ka m'nēnye kwa ìzùm: n'ihi na nka nābara unu urù, madu ndi buru uzọ malite n'arọ gara aga, ọ bughi nání ime eme, kama ichọ kwa achọ. 11Ma ub͕u a mezu-kwa-nu omume ahu; ka, dika obi di ọku ichọ achọ diri unu, ka ewe site n'ihe unu nwere mezu kwa ya otú a. 12N'ihi na asi na obi di ọku di ya, ọ bu ihe agānara nke-ọma dika ihe ọ bula madu nwere si di, ọ bughi dika ihe ọ nēnweghi. 13N'ihi na ekwughm nka, ka o we di ndi ọzọ nfé, ka nkpab͕u we di-kwa-ra unu: 14kama anamekwu n'uzọ nrata; ebe ihe unu nwebigara ókè mejuru ihe fọduru ha inwe n'oge di ub͕u a, ka ihe ndi ahu nwebigara ókè we meju kwa ihe fọduru unu inwe; ka nrata we di: 15dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye chikọtara ri nne enweghi kari nke gēzuru ya; onye chikọta-kwa-ra ntà, ọ dighi ihe fọduru ya inwe.
16Ma ekele diri Chineke, Onye nētiye otù inu-ọku ahu n'ihi unu n'obi Taitọs. 17N'ihi na ọ nara aririọ-ayi nke-ọma n'ezie; ma ebe ọ nānu ọku n'obi kari ihe m'chère, o siri n'ebe a pua jekuru unu dika o zuputara n'onwe-ya. 18Ayi ezìkọwo kwa ya na nwa-nna-ayi ahu onye otuto-ya n'ozi ọma ayi ruzuru nzukọ Kraist nile; 19ma ọ bughi nání otú a, kama nzukọ Kraist nile rọputa-kwa-ra ya ka ọ nēso ayi n'ije ije n'amara nka, nke ayi nēje ozi ya inye Onye-nwe-ayi otuto, na igosi obi di ọku nke ayi: 20ma ayi nēze nka, ka onye ọ bula ghara ita ayi uta n'oké onyinye-amara nka nke ayi nēje ozi ya: 21n'ihi na ayi buru uzọ nēchè ihe ọma, ọ bughi nání n'iru Onye-nwe-ayi, kama n'iru madu kwa. 22Ayi ezìkọwo kwa ha na nwa-nna-ayi, onye ayi nwaputara ọtutu mb͕e na ọ nānu ọku n'obi n'ọtutu ihe, ma ub͕u a ọ nānu kari ọku n'obi nke-uku, site n'oké ntukwasi-obi nke ọ nātukwasi n'aru unu. 23Ma ọ buru na onye ọ bula aju ajuju bayere Taitọs, ọ bu onye mu na ya nēnwekọ ihe, buru kwa onye mu na ya nālukọrọ unu ọlu; ma-ọbu umu-nna-ayi, ha bu ndi-ozi nke nzukọ Kraist, ha bu otuto nke Kraist. 24Ya mere nēgosinu ha n'iru nzukọ Kraist nile ihe gēgosi ihu-n'anya-unu na inya-isi-ayi bayere unu.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

II. NDI KỌRINT 8: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye