N'ihi na asi na ọ bu ezie na ejim akwukwọ-ozim me ka o wuta unu, akwaghm uta, asi na ọ bu ezie na anamakwari uta; n'ihi na anamahu na akwukwọ-ozi ahu mere ka o wuta unu, ma asi na ọ bu ezie na ọ bu nání otù oge hour ka o wutara unu. Ub͕u a anamaṅuri ọṅu, ọ bughi na emere ka ihe wuta unu, kama na emere ka o wuta unu rue nchèghari: n'ihi na emere ka o wuta unu dika Chineke chọrọ, ka unu we ghara isite n'ayi yi iyì n'ihe ọ bula. N'ihi na nwuta dika Chineke chọrọ nālu ọlu nchèghari rue nzọputa, bú nchèghari nke anāpughi ikwa uta bayere ya: ma nwuta nke uwa nāluputa ọnwu. N'ihi na le, otù ihe a, na emere ka ihe wuta unu dika Chineke chọrọ, le ka ọ ra, bú inu-ọku-n'obi ọ luputara nime unu, e, le ka ngọpu ra, e, le ka iwe uku ra, e, le ka egwu ra, e, le ka ọgugu m'gusiri unu ike ra, e, le ka ekworo ra, e, le ka nkpeputa ra! N'ihe nile ọ bula unu mere ka amara unu na unu di ọcha n'okwu ahu. Ya mere asi na ọ bu ezie na edegaram unu akwukwọ, ọ bughi n'ihi onye ahu mere ajọ omume ka m'dere ya, ọ bughi kwa n'ihi onye ahu emere ajọ omume megide ya, kama ka ewe me ka inu-ọku-n'obi unu nānu n'ihi ayi putara unu ìhè n'iru Chineke. N'ihi nka akasiwo ayi obi: ma na nkasi-obi-ayi ayi ṅuribigara ókè nke-uku kari n'ihi ọṅù Taitọs, n'ihi na emewo ka mọ-ya zuru ike site n'ebe unu nile nọ.