II. NDI KỌRINT 7:8-13
II. NDI KỌRINT 7:8-13 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọ naghị ewutekwa m ugbu a na m deere unu akwụkwọ ahụ, ọ bụ ezie na o wutere m mgbe ahụ m na-ede ya, nʼihi na amaara m na ọ ga-ewetara unu obi ọjọọ mgbe unu gụrụ ya. Ma obi ọjọọ ahụ abụrụla naanị nke nwa oge nta. Ma ugbu a ana m aṅụrị ọṅụ na m dere akwụkwọ ahụ. Ọ bụghị nʼihi na ọgụgụ ya wetaara unu obi ọjọọ, kama ọ bụ nʼihi na mwute o wutere unu emeela ka unu chegharịa. Ụdị mwute unu nwere bụ ụdị mwute Chineke chọrọ ka ndị nke ya nwee. Ya mere, o nweghị ihe ọjọọ bịakwasịrị unu nʼihi akwụkwọ anyị deere unu. Nʼihi na iru ụjụ otu Chineke chọrọ na-eweta nchegharị nke na-eduba mmadụ na nzọpụta, bụ nchegharị nke a na-apụghị ịkwa ụta banyere ya. Ma iru ụjụ dịka ụwa si eme na-eweta ọnwụ. Leenụ ihe Chineke rụpụtara site nʼihe mwute dakwasịrị unu. Ugbu a, unu abụrụla ndị ọ na-anụ ọkụ nʼobi na ndị jikeere izi anyị na aka unu abụọ dị ọcha. Lee otu unu si zi iwe unu, otu unu si zikwa na ihe ahụ wutere unu. Lee otu unu si tụọ ụjọ ihe mmehie ahụ nwere ike iwetara unu. Leekwanụ otu unu si mee ihe niile igosi na unu kwagidere m. Leekwanụ otu unu si nye onye ahụ mere mmehie ahụ ntaramahụhụ ngwangwa. Unu egosila na aka unu dị ọcha nʼokwu ndị a niile. Ọ bụ ezie na m deere unu akwụkwọ ahụ, ma edeghị m ya nʼihi onye ahụ mehiere, maọbụ nʼihi onye ahụ e mehiere megide. Kama edere m ya ime ka Chineke gosi unu otu ihe gbasara anyị si na-anụ unu ọkụ nʼobi. Nʼụzọ niile ndị a, anyị bụ ndị a gbara ume site nʼịhụnanya unu nwere nʼebe anyị nọ. A gbara anyị ume karịa site na ịhụ ọṅụ Taịtọs nʼihi nnabata unu nabatara, na otu unu si mee ka mmụọ ya zuru ike mgbe ọ bịakwutere unu.
II. NDI KỌRINT 7:8-13 Bible Nso (IGBOB)
N'ihi na asi na ọ bu ezie na ejim akwukwọ-ozim me ka o wuta unu, akwaghm uta, asi na ọ bu ezie na anamakwari uta; n'ihi na anamahu na akwukwọ-ozi ahu mere ka o wuta unu, ma asi na ọ bu ezie na ọ bu nání otù oge hour ka o wutara unu. Ub͕u a anamaṅuri ọṅu, ọ bughi na emere ka ihe wuta unu, kama na emere ka o wuta unu rue nchèghari: n'ihi na emere ka o wuta unu dika Chineke chọrọ, ka unu we ghara isite n'ayi yi iyì n'ihe ọ bula. N'ihi na nwuta dika Chineke chọrọ nālu ọlu nchèghari rue nzọputa, bú nchèghari nke anāpughi ikwa uta bayere ya: ma nwuta nke uwa nāluputa ọnwu. N'ihi na le, otù ihe a, na emere ka ihe wuta unu dika Chineke chọrọ, le ka ọ ra, bú inu-ọku-n'obi ọ luputara nime unu, e, le ka ngọpu ra, e, le ka iwe uku ra, e, le ka egwu ra, e, le ka ọgugu m'gusiri unu ike ra, e, le ka ekworo ra, e, le ka nkpeputa ra! N'ihe nile ọ bula unu mere ka amara unu na unu di ọcha n'okwu ahu. Ya mere asi na ọ bu ezie na edegaram unu akwukwọ, ọ bughi n'ihi onye ahu mere ajọ omume ka m'dere ya, ọ bughi kwa n'ihi onye ahu emere ajọ omume megide ya, kama ka ewe me ka inu-ọku-n'obi unu nānu n'ihi ayi putara unu ìhè n'iru Chineke. N'ihi nka akasiwo ayi obi: ma na nkasi-obi-ayi ayi ṅuribigara ókè nke-uku kari n'ihi ọṅù Taitọs, n'ihi na emewo ka mọ-ya zuru ike site n'ebe unu nile nọ.