Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. IHE EMERE 29

29
1Hezekaia malitere ibu eze mb͕e ọ b͕ara orú arọ na ise; o we buru eze orú arọ na iteghete nime Jerusalem: aha nne-ya bu Abaija nwa-nwayi Zekaraia. 2O me ihe ziri ezi n'anya Jehova, dika ihe nile si di nke Devid nna-ya mere. 3Onye ahu, n'arọ mbu nke ọ bu eze, n'ọnwa mbu, o meghere uzọ ulo Jehova, me ka ha di ike. 4O we me ka ndi-nchu-àjà na ndi Livai bata, o we chikọbata ha n'amá ọwuwa-anyanwu, 5si ha, Nurunum, ndi Livai; ub͕u a donu onwe-unu nsọ, do kwa ulo Jehova, bú Chineke nna-unu-hà, nsọ, me ka idi na nsọ-unu pua n'ebe nsọ ahu. 6N'ihi na nna-ayi-hà mekpuru emekpu, me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, bú Chineke-ayi, ha we rapu Ya, si n'ebe-obibi Jehova chigharia iru-ha, b͕akuta azu-ha. 7Ọzọ, ha emechiwo ọnu-uzọ nile nke uzọ-nbata, menyu oriọna nile, ha esureghi kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ha esureghi kwa àjà-nsure-ọku, n'ebe nsọ ahu, nye Chineke Israel. 8Iwe Jehova we dikwasi Juda na Jerusalem, O we rara ha nye ka ha buru ihe-nkwaghari, na ibu ihe-iju-anya, na ibu ihe-ima-ọsọ, dika unu onwe-unu nēwere anya-unu hu. 9Ma, le, nna-ayi-hà adawo site na mma-agha, umu-ayi ndikom na umu-ayi ndinyom na ndinyom-ayi nọ na ndọta-n'agha n'ihi nka. 10Ub͕u a ọ di n'obim ka ayi na Jehova, bú Chineke Israel, b͕a ndu, ka iwe-Ya nke di ọku we si n'ebe ayi nọ chigharia. 11Umum, ub͕u a unu ejehiela: n'ihi na ọ bu unu ka Jehova rọputara iguzo n'iru Ya, ijere Ya ozi, na iburu Ya ndi nēje ozi na ndi nēsure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.
12Ndi Livai we bilie, bú Mehat nwa Amasai, na Joel mwa Azaraia, ndi sitere n'umu ndi Kohat: na Kish nwa Abdi, na Azaraia nwa Jehalelel, ndi sitere n'umu Merari: na Joa nwa Zima, na Iden nwa Joa, ndi sitere na ndi Giashon: 13na Shimri na Jeuel, ndi sitere n'umu Elizafan: na Zekaraia na Matanaia, ndi sitere n'umu Esaf: 14na Jehuel na Shimai, ndi sitere n'umu Himan: na Shemaia na Uziel, ndi sitere n'umu Jedutum. 15Ha we chikọta umu-nne-ha ndikom, do onwe-ha nsọ, ba, dika ihe ahu si di nke eze nyere n'iwu, site n'okwu, ime ka ulo Jehova di ọcha. 16Ndi-nchu-àjà we ba n'ime-ime nke ulo Jehova, ime ka o di ọcha, ha we buputa ihe ruru árú nile nke ha chọtara n'ulo uku Jehova tiye ya n'ogige ulo Jehova. Ndi Livai we nara ya, ibupu ya je miri-iyi Kidron n'èzí. 17Ha we malite ido nsọ n'ubọchi mbu nke ọnwa mbu, n'ubọchi nke-asatọ nke ọnwa ka ha biaruru uzọ-nbata Jehova; ha we do ulo Jehova nsọ n'ubọchi asatọ: ọ bu kwa n'ubọchi nke-iri-na-isi nke ọnwa mbu ka ha dobìri ya nsọ. 18Ha we ba nime biakute Hezekaia, bú eze, si, Ayi emewo ka ulo Jehova nile di ọcha, ya na ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku, na ihe-ya nile, na Table achicha anēdo n'usoro, na ihe-ya nile. 19Ihe nile kwa nke eze, bú Ehaz, juru aju mb͕e ọ bu eze mb͕e o mekpuru emekpu, ndia ka ayi doziworo, do kwa nsọ; ma, le, ha di n'iru ebe-ichu-àjà Jehova.
20Hezekaia, bú eze, we bilie n'isi-ututu, chikọta ndi-isi obodo, rigorue ulo Jehova. 21Ha we webata oke-ehi asa, na ebulu asa, na umu-aturu asa, na nkpi asa, ibu àjà-nmehie n'ihi ala-eze, na n'ihi ebe nsọ ahu, na n'ihi Juda. Ọ si umu Eron, bú ndi-nchu-àjà, ka ha sure ha ọku n'elu abe-ichu-àjà Jehova. 22Ha we b͕ue oke-ehi asa ahu, ndi-nchu-àjà we nara ọbara-ha, wusa n'ebe-ichu-àjà: ha b͕u-kwa-ra ebulu asa ahu, wusa ọbara-ha n'ebe-ichu-àjà: ha b͕u-kwa-ra umu-aturu ahu, wusa ọbara-ha n'ebe-ichu-àjà. 23Ha we weta nkpi asa nke àjà-nmehie nso n'iru eze na nkpọkọta Juda; ha we bikwasi ha aka-ha: 24ndi-nchu-àjà we b͕ue ha, were ọbara-ha chua àjà-nmehie n'ebe-ichu-àjà, ikpuchiri Israel nile nmehie: n'ihi na eze siri, Ọ diri Israel nile, bú àjà-nsure-ọku a na àjà-nmehie a. 25O we guzo ndi Livai n'ulo Jehova, ndi chiri ájà, na une, na ubọ-akwara, dika ihe ahu si di nke Devid, na Gad, bú onye-ọhu-uzọ nke eze, na Netan, bú onye-amuma, nyere n'iwu: n'ihi na o sitere n'aka Jehova, bú ihe ahu enyere n'iwu, site n'aka ndi-amuma-Ya. 26Ndi Livai we chiri ihe Devid guzo, ndi-nchu-àjà chiri kwa opì. 27Hezekaia we si ka esure àjà-nsure-ọku n'ebe-ichu-àjà. Ma na mb͕e amalitere isure àjà-nsure-ọku, amalitere ibù abù Jehova, na ifù opì nile, na ikpọ ihe nile bu ubọ nke Devid, bú eze Israel. 28Nkpọkọta ahu nile nākpọ kwa isi ala, ndi-ọbù-abù nābù kwa, ndi nāfù opì nāfù kwa: anēme ihe a nile rue mb͕e achubìri àjà-nsure-ọku. 29Ma mb͕e ha surebìsiri àjà-nsure-ọku, eze na ndi nile ahuru n'ebe ọ nọ ruru ala, we kpọ isi ala. 30Hezekaia, bú eze, na ndi-isi we si ndi Livai ka ha were okwu nke Devid, na nke Esaf, bú onye-ọhu-uzọ, to Jehova. Ha we to Chineke rue ọṅù, ha we rube isi kpọ isi ala. 31Hezekaia we za, si, Ub͕u a unu emejuwo aka-unu n'ebe Jehova nọ, bianu nso webata àjà na àjà-ekele n'ulo Jehova. Nkpọkọta Juda we webata àjà na àjà-ekele; onye ọ bula nke nwere afọ-ofufo weta-kwa-ra àjà-nsure-ọku. 32Ọnu-ọgugu àjà-nsure-ọku, nke nkpọkọta Juda wetara, we di ọgu oke-ehi atọ na iri, na ọgu ebulu ise, na ọgu umu-aturu iri: ndia nile bu ihe àjà-nsure-ọku ichuru Jehova. 33Ihe edoro nsọ di kwa nnù oke-ehi na ọgu iri, na nnù aturu asa na ọgu iri. 34Nání na ndi-nchu-àjà di ole-na-ole, ha apughi kwa ib͕a akpukpọ anu àjà-nsure-ọku nile: umu-nne-ha, bú ndi Livai, we me ka ha di ike, rue mb͕e ejebìri ozi ahu, ru kwa mb͕e ndi-nchu-àjà doro onwe-ha nsọ: n'ihi na ndi Livai nwere obi ziri ezi kari ndi-nchu-àjà ido onwe-ha nsọ. 35Ọzọ kwa, àjà-nsure-ọku bara uba, tiyere abuba nke àjà-udo nile, tiye-kwa-ra àjà-ihe-ọṅuṅu nile nke diri àjà-nsure-ọku. Ewe dozie òfùfè ulo Jehova. 36Hezekaia we ṅuria, ya na ndi-ya nile, n'ihi ihe nke Chineke doziri nye ndi ahu: n'ihi na ọ bu na mberede ka ihe a mere.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

II. IHE EMERE 29: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara