Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. IHE EMERE 27

27
1Orú arọ na ise ka Jotam b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze arọ iri na isi nime Jerusalem: aha nne-ya bu Jerusha nwa-nwayi Zedok. 2O me ihe ziri ezi n'anya Jehova, dika ihe nile si di nke Uzaia nna-ya mere: nání na ọ baghi n'ulo uku Jehova. Ma ndi Juda nọ nēbibi onwe-ha. 3Onye ahu wuru ọnu-uzọ-ama ulo Jehova nke di n'elu, o wu-kwa-ra ulo n'uba n'elu mb͕idi Ofel. 4O wu-kwa-ra obodo ufọdu n'ugwu Juda, wu kwa ulo uku na ulo-elu n'oké ọhia. 5Onye ahu buso-kwa-ra eze umu Amon agha, we ka ha ike. Umu Amon we nye ya n'arọ ahu ọgu talent ọla-ọcha ise, na orú nnù cor ọka wheat na nnù ise, na orú nnù cor ọka barley na nnù ise. Nka ka umu Amon nyeghachiri ya, n'arọ nke-abua kwa, na n'arọ nke-atọ. 6Jotam we me onwe-ya ka ọ di ike, n'ihi na o doziri uzọ-ya nile n'iru Jehova, bú Chineke-ya. 7Ma ihe nile nke Jotam mere nke fọduru, na agha-ya nile, na uzọ-ya nile, le, edewo ha n'akwukwọ ndi-eze Israel na Juda. 8Orú arọ na ise ka ọ b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze, o we buru eze arọ iri na isi nime Jerusalem. 9Jotam we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, ha we lìe ya n'obodo Devid: Ehaz nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

II. IHE EMERE 27: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye