Ndi nile nke Juda we were Uzaia, ma onye ahu b͕ara arọ iri na isi, ha we me ya eze n'ọnọdu nna-ya Amazaia. Ya onwe-ya wuru Ilot, nyeghachi ya Juda, mb͕e eze sorosiri nna-ya-hà dina n'ọnwu. Arọ iri na isi ka Uzaia b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze ọgu arọ abua na iri na abua nime Jerusalem: aha nne-ya bu Jekilia nke Jerusalem. O me ihe ziri ezi n'anya Jehova, dika ihe nile si di nke Amazaia nna-ya mere. O we nọ n'ichọ Chineke n'ubọchi Zekaraia, onye nwere nghọta n'ihu Chineke: ma n'ubọchi ọ nāchọ Jehova, Chineke mere ka ihe gara ya nke-ọma. O we pua, buso ndi Filistia agha, tipúsia mb͕idi Gat, na mb͕idi Jabne, na mb͕idi Ashdod, o we wue obodo n'ala Ashdod na n'etiti ndi Filistia. Chineke we yere ya aka imegide ndi Filistia, na imegide ndi Arebia ndi bi na Gua-beal, na Meunim. Ndi Amon we nye Uzaia onyinye-inata-iru-ọma: aha-ya we rue nbata Ijipt; n'ihi na o mere onwe-ya ka ọ di ike ri nne. Uzaia wu-kwa-ra ulo-elu nime Jerusalem n'ọnu-uzọ-ama nkuku, na n'ọnu-uzọ-ama ndagwurugwu, na na nkuku mb͕idi, we me ka ha di ike. O wu-kwa-ra ulo-elu ufọdu n'ọzara, gwue ọtutu olùlù-miri, n'ihi na o nwere ọtutu anu-ulo; ma n'ebe di ala ala, ma n'ebe di lari: o nwe-kwa-ra ndi-ọlu-ubi na ndi-ọlu-ubi-vine n'ugwu na nime Kamel; n'ihi na ọ bu onye huru ọlu ubi n'anya. Uzaia nwe-kwa-ra usu-ndi-agha ndi nēbu agha, ndi nāpukuru usu-ndi-agha n'usu n'usu, dika ọnu-ọgugu nke ngukọta-ha si di n'aka Jeiel, bú ode-akwukwọ, na Maaseia, bú odozi-okwu, n'okpuru aka Hananaia, otù onye nime ndi-isi eze. Ọnu-ọgugu nile nke ndi-isi ulo nke ndi bu nna, bú ndi-dike bu dìnkpà, di nnù isi na ọgu iri. Ma n'okpuru aka-ha ka usu nke usu-ndi-agha di, orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ iri-na-asatọ na nnù asatọ na ọgu iri-na-ise, ndi nēwere ume nke ndi bu dìnkpà bu agha, iyere eze aka imegide onye-iro. Uzaia we doziere ha, bú usu-ndi-agha nile, ọta, na ube, na okpu-agha, na uwe-agha, na ute, ọbuná rue nkume èbè. O me kwa nime Jerusalem ihe-agha echèputara, bú nchèputa nke onye nēchèputa ihe, idi n'elu ulo-elu nile, na n'elu nkuku mb͕idi nile, iji b͕a àkú na nkume uku. Aha-ya we pua rue ebe di anya; n'ihi na eyere ya aka n'uzọ di ebube, rue mb͕e ọ di ike.
Ma mb͕e ọ di ike, obi-ya di elu rue nbibi, o we mekpu emekpu megide Jehova, bú Chineke-ya; o we ba n'ulo uku Jehova isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu ebe-ichu-àjà nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ. Azaraia, bú onye-nchu-àjà, we baso ya, ya na ọgu ndi-nchu-àjà anọ nke Jehova, bú ndi-dìnkpà: ha we guzo imegide Uzaia, bú eze, si ya, Uzaia, ọ bughi gi nwe isurere Jehova ihe-nsure-ọku nēsì utọ, kama ọ bu ndi-nchu-àjà, bú umu Eron, ndi edoworo nsọ isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ: pua n'ebe nsọ a; n'ihi na i mekpuwo emekpu; ọ gaghi-adi-kwa-ra gi ihe nsọpuru site n'aka Jehova, bú Chineke. Uzaia we wee iwe; ma ihe eji esure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ di n'aka-ya isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; ma mb͕e o nēkosa ndi-nchu-àjà ọnuma, ekpenta wara n'egedege-iru-ya, n'iru ndi-nchu-àjà n'ulo Jehova, n'akuku ebe-ichu-àjà nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ. Azaraia, bú onye-isi-nchu-àjà, na ndi-nchu-àjà nile, we le ya anya, ma, le, ya onwe-ya bu onye-ekpenta n'egedege-iru-ya, ha we me ka ọ pua n'ebe ahu n'ima-jijiji;ọzọ kwa, ya onwe-ya mere ngwa ipu apu, n'ihi na Jehova etib͕uwo ya. Uzaia, bú eze, we buru onye-ekpenta rue ubọchi ọnwu-ya, we biri n'ulo ewupuru iche, ebe ọ bu onye-ekpenta; n'ihi na ebipuru ya n'ulo Jehova: Jotam nwa-ya we buru onye-isi ulo eze, nēkpe ndi ala ahu ikpe.