II. IHE EMERE 26:1-21
II. IHE EMERE 26:1-21 Bible Nso (IGBOB)
Ndi nile nke Juda we were Uzaia, ma onye ahu b͕ara arọ iri na isi, ha we me ya eze n'ọnọdu nna-ya Amazaia. Ya onwe-ya wuru Ilot, nyeghachi ya Juda, mb͕e eze sorosiri nna-ya-hà dina n'ọnwu. Arọ iri na isi ka Uzaia b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze ọgu arọ abua na iri na abua nime Jerusalem: aha nne-ya bu Jekilia nke Jerusalem. O me ihe ziri ezi n'anya Jehova, dika ihe nile si di nke Amazaia nna-ya mere. O we nọ n'ichọ Chineke n'ubọchi Zekaraia, onye nwere nghọta n'ihu Chineke: ma n'ubọchi ọ nāchọ Jehova, Chineke mere ka ihe gara ya nke-ọma. O we pua, buso ndi Filistia agha, tipúsia mb͕idi Gat, na mb͕idi Jabne, na mb͕idi Ashdod, o we wue obodo n'ala Ashdod na n'etiti ndi Filistia. Chineke we yere ya aka imegide ndi Filistia, na imegide ndi Arebia ndi bi na Gua-beal, na Meunim. Ndi Amon we nye Uzaia onyinye-inata-iru-ọma: aha-ya we rue nbata Ijipt; n'ihi na o mere onwe-ya ka ọ di ike ri nne. Uzaia wu-kwa-ra ulo-elu nime Jerusalem n'ọnu-uzọ-ama nkuku, na n'ọnu-uzọ-ama ndagwurugwu, na na nkuku mb͕idi, we me ka ha di ike. O wu-kwa-ra ulo-elu ufọdu n'ọzara, gwue ọtutu olùlù-miri, n'ihi na o nwere ọtutu anu-ulo; ma n'ebe di ala ala, ma n'ebe di lari: o nwe-kwa-ra ndi-ọlu-ubi na ndi-ọlu-ubi-vine n'ugwu na nime Kamel; n'ihi na ọ bu onye huru ọlu ubi n'anya. Uzaia nwe-kwa-ra usu-ndi-agha ndi nēbu agha, ndi nāpukuru usu-ndi-agha n'usu n'usu, dika ọnu-ọgugu nke ngukọta-ha si di n'aka Jeiel, bú ode-akwukwọ, na Maaseia, bú odozi-okwu, n'okpuru aka Hananaia, otù onye nime ndi-isi eze. Ọnu-ọgugu nile nke ndi-isi ulo nke ndi bu nna, bú ndi-dike bu dìnkpà, di nnù isi na ọgu iri. Ma n'okpuru aka-ha ka usu nke usu-ndi-agha di, orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ iri-na-asatọ na nnù asatọ na ọgu iri-na-ise, ndi nēwere ume nke ndi bu dìnkpà bu agha, iyere eze aka imegide onye-iro. Uzaia we doziere ha, bú usu-ndi-agha nile, ọta, na ube, na okpu-agha, na uwe-agha, na ute, ọbuná rue nkume èbè. O me kwa nime Jerusalem ihe-agha echèputara, bú nchèputa nke onye nēchèputa ihe, idi n'elu ulo-elu nile, na n'elu nkuku mb͕idi nile, iji b͕a àkú na nkume uku. Aha-ya we pua rue ebe di anya; n'ihi na eyere ya aka n'uzọ di ebube, rue mb͕e ọ di ike. Ma mb͕e ọ di ike, obi-ya di elu rue nbibi, o we mekpu emekpu megide Jehova, bú Chineke-ya; o we ba n'ulo uku Jehova isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu ebe-ichu-àjà nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ. Azaraia, bú onye-nchu-àjà, we baso ya, ya na ọgu ndi-nchu-àjà anọ nke Jehova, bú ndi-dìnkpà: ha we guzo imegide Uzaia, bú eze, si ya, Uzaia, ọ bughi gi nwe isurere Jehova ihe-nsure-ọku nēsì utọ, kama ọ bu ndi-nchu-àjà, bú umu Eron, ndi edoworo nsọ isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ: pua n'ebe nsọ a; n'ihi na i mekpuwo emekpu; ọ gaghi-adi-kwa-ra gi ihe nsọpuru site n'aka Jehova, bú Chineke. Uzaia we wee iwe; ma ihe eji esure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ di n'aka-ya isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; ma mb͕e o nēkosa ndi-nchu-àjà ọnuma, ekpenta wara n'egedege-iru-ya, n'iru ndi-nchu-àjà n'ulo Jehova, n'akuku ebe-ichu-àjà nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ. Azaraia, bú onye-isi-nchu-àjà, na ndi-nchu-àjà nile, we le ya anya, ma, le, ya onwe-ya bu onye-ekpenta n'egedege-iru-ya, ha we me ka ọ pua n'ebe ahu n'ima-jijiji;ọzọ kwa, ya onwe-ya mere ngwa ipu apu, n'ihi na Jehova etib͕uwo ya. Uzaia, bú eze, we buru onye-ekpenta rue ubọchi ọnwu-ya, we biri n'ulo ewupuru iche, ebe ọ bu onye-ekpenta; n'ihi na ebipuru ya n'ulo Jehova: Jotam nwa-ya we buru onye-isi ulo eze, nēkpe ndi ala ahu ikpe.
II. IHE EMERE 26:1-21 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe ahụ, ndị Juda mere Ụzaya eze nʼọnọdụ Amazaya nna ya, mgbe ọ dị naanị afọ iri na isii. Ọ bụ Ụzaya wugharịrị obodo Elat, nwetaghachi ya nye Juda mgbe eze bụ Amazaya sooro ndị nna nna ya dinaa nʼọnwụ. Ụzaya dị afọ iri na isii mgbe ọ malitere ịchị dịka eze. Ọ chịrị iri afọ ise na abụọ na Jerusalem. O soro nzọ ụkwụ nna ya bụ Amazaya mee ihe ziri ezi nʼanya ONYENWE ANYị. Ụzaya chọsịrị Chineke ike ụbọchị niile nke Zekaraya na-adị ndụ, bụ onye mere ka ọ ghọta ịtụ egwu Chineke. Mgbe niile, dịka ọ na-achọ ONYENWE ANYị, Chineke nyere ya ọganihu. O busoro ndị Filistia agha, ma kụdakwa mgbidi niile nke Gat, Jabna, na Ashdọd. Emesịa, o wuziri ọtụtụ obodo dị nʼakụkụ Ashdọd na nʼebe ndị ọzọ nʼobodo Filistia. Chineke nọnyeere ya nʼọgụ niile ọ lụsoro ndị Filistia, na ndị Arab bi na Gua Baal na ndị Meunim. Ndị Amọn na-atụtara ya ụtụ afọ niile, ude aha ya ruru ọ bụladị ala Ijipt nʼihi na ọ ghọrọ onye dị ike nke ukwuu. O wuru ọtụtụ ụlọ elu nche na Jerusalem na nkuku Ọnụ Ụzọ Ama, nʼỌnụ Ụzọ Ama Ndagwurugwu, na nkuku mgbidi, wusie ha ike. O wukwara ọtụtụ ụlọ elu nche siri ike nʼọzara, gwuokwa ọtụtụ olulu mmiri nʼihi na o nwere ọtụtụ anụ ụlọ na ndagwurugwu, na nʼala dị larịị. Ọ hụrụ ịrụ ọrụ ubi nʼanya, nʼihi ya, o nwere ọtụtụ ndị na-arụ ọrụ nʼubi na ubi vaịnị ya dị nʼala ugwu ugwu, na nʼala ndị dị na ndagwurugwu. Ụzaya nwere ndị agha ọnụọgụgụ ha dị ukwuu, ndị a zụziri azụzi, na ndị nọ na njikere mgbe niile ịpụ ibu agha dịka ọnụọgụgụ e kewapụtara ha si dị. Ọ bụ Jeiel, ode akwụkwọ na Maaseia, onyeisi ozi nọ nʼokpuru Hananaya, otu nʼime ndịisi ozi eze, ka ọ dị nʼaka ịgụpụta ndị agha ga-apụ ibu agha. Ndị agha a nwekwara puku ndịisi agha abụọ na narị isii, ya bụ 2,600. Ọnụọgụgụ ndị agha ahụ niile dị narị puku atọ na asaa, na narị ise, ya bụ, 307,500. Ha bụ ndị a zụziri nke ọma, ndị dị nnọọ ike iguzo nʼazụ eze ibu agha megide ndị iro ya. Ụzaya nyere ndị agha niile, ọta, na ùbe, na uwe agha, na okpu igwe, na uwe agha igwe, ụta na nkume na-akwọ mụrụmụrụ, nke ndị na-atụ iche ji alụ ọgụ. O mepụtakwara ihe nchepụta ọhụrụ na Jerusalem, nke ndị nwere amamihe chepụtara, bụ nke a ga-eguzobe nʼụlọ elu nche nakwa nʼelu nkuku mgbidi, ka ndị agha nwee ike jiri ha gbaa àkụ maọbụ tụọ nkume ukwu site nʼelu mgbidi ahụ niile. Ude aha ya gbasara ruo ebe dị anya, nʼihi na-enyeere ya aka nʼụzọ dị ukwuu ruo mgbe ọ ghọrọ onye dị ike. Ma mgbe Ụzaya ghọrọ onye dị ike, nganga wetaara ya ọdịda. Ọ bụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye ONYENWE ANYị bụ Chineke ya, ọ banyere nʼime ụlọnsọ ONYENWE ANYị ka ọ chụọ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ebe ịchụ aja. Azaraya onye nchụaja na ndị nchụaja ONYENWE ANYị iri asatọ ọzọ bụ dimkpa jekwuru ya nʼebe ahụ. Ha guzogidere eze bụ Ụzaya, sị ya, “Ụzaya, i kwesighị ịbata nʼebe a jiri aka gị suree ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye ONYENWE ANYị. Nke a bụ ọrụ dịrị naanị ndị nchụaja ndị bụ ụmụ Erọn, ndị a họpụtara doo iche maka ọrụ a. Site nʼebe nsọ a pụọ, nʼihi na i gosila onwe gị dịka onye na-ekwesighị ntụkwasị obi. Ọzọ ị gaghị enwekwa nsọpụrụ site nʼaka ONYENWE ANYị Chineke gị.” Ụzaya onye ji ihe ịgụ ọkụ nke e ji esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ ahụ nʼaka, were iwe nke ukwu megide ndị nchụaja ahụ. Mgbe ọ nọ na-abara ndị nchụaja mba nʼihu ebe ịchụ aja nke dị nʼụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYị, lee ekpenta pụtara ya nʼegedege ihu. Mgbe Azaraya onyeisi nchụaja, na ndị nchụaja ọzọ niile lere ya anya, ha hụrụ na ekpenta agbaala ya nʼegedege ihu ya, ha mere ka ọ site nʼebe ahụ pụọ ngwangwa. Ya onwe ya kwa chọkwara isite nʼebe ahụ pụọ ngwangwa, nʼihi na ONYENWE ANYị tiri ya ihe otiti. Eze Ụzaya bụ onye ekpenta ruo ụbọchị ọnwụ ya. O biri nʼụlọ ewupụrụ iche, ebe ọ bụ onye ekpenta, na onye amapụrụ site nʼụlọnsọ ONYENWE ANYị. Jotam nwa ya ghọrọ onye nlekọta ụlọeze, na-achịkwa ndị ala ahụ.