Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

II. IHE EMERE 20

20
1O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na umu Moab, na umu Amon, ha na ufọdu site na ndi ọzọ, biara imegide Jehoshafat n'agha. 2Madu ufọdu we bia gosi Jehoshafat, si, Ìgwè madu bara uba esiwo n'ofè oké osimiri, site na Siria, bia imegide gi; ma, le, ha nọ nime Hazazon-tema (nke bu En-gedi). 3Jehoshafat we tua egwu, che iru-ya ichọ Jehova; o we kpọsa obubu-ọnu na Juda nile. 4Juda we chikọta onwe-ha ichọ iye-aka site n'aka Jehova: ọbuná site n'obodo nile nke Juda ka ha biara ichọsi Jehova ike. 5Jehoshafat we guzo nime nkpọkọta Juda na Jerusalem, n'ulo Jehova, n'iru ogige ọhu; 6ọ si, Jehova, bú Chineke nke nna-ayi-hà, ọ̀ bughi Gi onwe-gi bu Chineke n'elu-igwe? ọ̀ bughi Gi onwe-gi nāchi kwa ala-eze nile nke mba nile? ọ bu kwa n'aka-Gi ka ume na idi-ike di, ọ dighi kwa onye gēguzo onwe-ya n'ebe I nọ. 7Ọ̀ bughi Gi onwe-gi, Chineke-ayi, napuru ndi bi n'ala nka ala-ha n'iru ndi-Gi, bú Israel, were ya nye nkpuru Abraham, bú onye nāhu Gi n'anya, rue mb͕e ebighi-ebi? 8Ha we biri nime ya, wuere Gi ebe nsọ nime ya nye aha-Gi, si, 9Ọ buru na ihe ọjọ abiakwasi ayi, bú mma-agha ikpé, ma-ọbu ajọ ọria nēfe efe, ma-ọbu oké unwu, ayi gēguzo n'iru ulo a, na n'iru Gi, (n'ihi na aha-Gi di n'ulo a,) si na nkpab͕u-ayi tikue Gi, I gānu kwa, zọputa. 10Ma ub͕u a, le, umu Amon na Moab na ugwu Sia, ndi I nēkweghi Israel ka ha bakuru ha, mb͕e ha nēsi n'ala Ijipt bia, kama ha si n'ebe ha nọ wezuga onwe-ha, ha ekpochapughi kwa ha; 11ma, le, otú ndi ahu nēnyeghachi ayi, n'ibia ichupu ayi n'ihe-nnweta-Gi, nke I meworo ka ayi nweta. 12Chineke-ayi, Ì gaghi-ekpe ha ikpe? n'ihi na ike adighi nime ayi n'iru ìgwè madu a bara uba nke nābia imegide ayi; ayi onwe-ayi amaghi kwa ihe ayi gēme: kama ọ bu Gi ka anya-ayi nādikwasi. 13Juda nile nēguzo kwa n'iru Jehova, ha na umu-ntakiri-ha, na ndinyom-ha, na umu-ha. 14Ma Mọ Jehova dikwasiri Jahaziel nwa Zekaraia, nwa Benaia, nwa Jeiel, nwa Matanaia, bú onye Livai, onye sitere n'umu Esaf, n'etiti nkpọkọta ahu; 15ọ si, Ṅanu nti, Juda nile, na ndi bi na Jerualem, na eze-ayi, bú Jehoshafat, otú a ka Jehova siri unu, Unu onwe-unu atula egwu, unu atu-kwa-la ujọ n'iru ìgwè madu a bara uba; n'ihi na ọ bughi unu nwe agha nka, kama ọ bu Chineke nwe. 16Echi ridanu imegide ha: le, ha nārigo n'uzọ-nrigo Ziz; unu gāchọta kwa ha na nsọtu ndagwurugwu, n'iru ọzara Jeruel. 17Ọ bughi unu gēnwe ibu agha n'agha nka: guzonu onwe-unu, guzo, hu nzọputa Jehova n'etiti unu, Juda na Jerusalem: unu atula egwu, unu atu-kwa-la ujọ: echi pukurunu ha; Jehova nọye-kwa-ra unu. 18Jehoshafat we rube isi kpuchie iru-ya n'ala: Juda nile na ndi bi na Jerusalem da-kwa-ra n'ala n'iru Jehova, ikpọ isi ala nye Jehova. 19Ndi Livai, bú ndi sitere n'umu ndi Kohat na ndi sitere n'umu ndi Kora, we bilie ito Jehova, bú Chineke Israel, n'olu di uku ri nne. 20Ha we bilie n'isi-ututu, pua ba n'ọzara Tekoa: ma mb͕e ha nāpu, Jehoshafat guzoro, si, Nurunum, Juda, na ndi bi na Jerusalem; kwerenu na Jehova, bú Chineke-unu, unu gēkwesi kwa ntukwasi-obi; kwerenu na ndi-amuma-Ya, ihe gāga-kwa-ra unu nke-ọma. 21O we me ka ndi-ya dua ya ọdu, o we guzo ndi nābùku Jehova abù, ndi nēto kwa ima-nma nke idi-nsọ, mb͕e ha nāpu n'obodo n'iru ndi ejikere agha, si, Kelenu Jehova; n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. 22Ma na mb͕e ha malitere iti nkpu na ito otuto, Jehova tiyere ndi nēru nbì imegide umu Amon na Moab na ugwu Sia, bu ndi nābakuru Juda; ewe tib͕ue ha. 23Umu Amon na Moab we guzo imegide ndi bi n'ugwu Sia, iwezuga ha ka ebibie ha na ikpochapu ha: mb͕e ha mere ka ndi bi na Sia gwusia, ha we yere onwe-ha aka, nwoke na ibe-ya, ibibi onwe-ha. 24Juda we biarue ulo-nche, rue ọzara, ha we le ìgwè madu ahu anya; ma, le, ha bu ozu ozu daworo n'ala, ọ dighi kwa onye b͕apuru ab͕apu. 25Jehoshafat na ndi-ya we bia iluta ihe-nkwata-ha n'agha, ha we hu n'etiti ha ma àkù ma ozu ma ihe di oké ọnu-ahia n'uba, ha we napusia onwe-ha ihe, kari nke ha nwere ike ibū: ha we nọ ubọchi atọ nāluta ihe-nkwata n'agha, n'ihi na ihe bara uba ka ọ bu. 26Ma n'ubọchi nke-anọ ha kpọkọtara onwe-ha na ndagwurugwu Beraka; n'ihi na n'ebe ahu ka ha gọziri Jehova: n'ihi nka ka ha kpọrọ aha ebe ahu, Ndagwurugwu Bekara, rue ta. 27Ha we lata, nwoke ọ bula nke Juda na Jerusalem, Jehoshafat nāga kwa n'iru ha, iwere ọṅù lata na Jerusalem; n'ihi na Jehova mere ka ha ṅuria ọṅu n'iru ndi-iro-ha. 28Ha we chiri une, na ubọ-akwara, na opì, biarue Jerusalem rue ulo Jehova. 29Oké egwu Chineke we dikwasi ala-eze nile nke ala nile ọzọ, mb͕e ha nuru na Jehova busoro ndi-iro Israel agha. 30Ala-eze Jehoshafat we di jū: n'ihi na Chineke-ya mere ka o zuru ike buruburu.
31Jehoshafat we buru eze Juda: ọ b͕ara orú arọ na iri na ise mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze orú arọ na ise nime Jerusalem: aha nne-ya bu Azuba nwa-nwayi Shilhi. 32O jere ije n'uzọ Esa nna-ya, o sighi kwa nime ya wezuga onwe-ya, nēme ihe ziri ezi n'anya Jehova. 33Nání na ewezugaghi ebe di elu; ma rue ub͕u a ndi Juda edozighi obi-ha nye Chineke nke ndi bu nna-ha. 34Ma ihe nile Jehoshafat mere nke fọduru, nke-mbu na nke-ikpe-azu, le, edewo ha n'akwukwọ ihe emere nke Jihu nwa Hanani, onye etiyere aha-ya n'akwukwọ ndi-eze Israel.
35Ma mb͕e ihe ndia gasiri, Jehoshafat, bú eze Juda, jikọrọ onwe-ya na Ehazaia, bú eze Israel; onye ahu nēmebi iwu n'omume-ya: 36o we jikọ onwe-ya na ya ime ub͕ọ ijeru Tashish: ha we me ub͕ọ ahu n'Ezion-geba. 37Elieza nwa Dodavahu nke Marisha we bu amuma megide Jehoshafat, si, N'ihi na i jikọrọ onwe-gi na Ehazaia, Jehova etipúwo ihe i mere. Ewe tiwa ub͕ọ ahu nile, ha enweghi kwa ike ijeru Tashish.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

II. IHE EMERE 20: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye