Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. NDI TESALỌNAIKA 1

1
1Pọl na Silvanọs na Timọti nēdegara nzukọ nke ndi Tesalọnaika nime Chineke, bú Nna, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, akwukwọ: Amara diri unu, ya na udo.
2Ayi nēkele Chineke ekele mb͕e nile bayere unu nile, nēcheta unu mb͕e ayi nēkpe ekpere; 3ebe ayi nēcheta nēwepughi aka ọlu nke okwukwe unu na ndọb͕u-n'ọlu nke ihunanya unu na ntachi-obi nke olile-anya unu ji ele anya Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, n'iru Chineke-ayi, bú Nna-ayi; 4ebe ayi matara, umu-nna-ayi ndi Chineke huru n'anya, i rọputa unu, 5na ọ bughi nání n'okwu-ọnu ka ozi ọma ayi biaruru unu, kama ọ bia-kwa-ra n'ike, na nime Mọ Nsọ na ọtutu nkwezu; dika unu matara aha madu a huru na ayi bu n'ebe unu nọ n'ihi unu. 6Unu onwe-unu ghọchikwara ndi nēṅomi ayi na Onye-nwe-ayi, ebe unu were ọṅù nke Mọ Nsọ nara okwu ahu nke-ọma nime ọtutu nkpab͕u; 7ya mere unu ghọrọ ihe-atù n'ebe ha nile, nọ, bú ndi kwere ekwe nime Masedọnia na nime Akaia. 8N'ihi na okwu nke Onye-nwe-ayi esiwo n'aru-unu daputa udà, ọ bughi nání na Masedọnia na Akaia, kama n'ebe nile ọ bula okwukwe-unu n'ebe Chineke nọ aputawo ìhè; ya mere ọ dighi ayi nkpà ikwu okwu ọ bula. 9N'ihi na ha onwe-ha nākọ akukọ bayere ayi aha nbata ayi batara n'ebe unu nọ; ya na otú unu siri n'arusi chigharikute Chineke, ibu orù Chineke Nke di ndu Nke bu kwa onye-ezi-okwu, 10na ichere Ọkpara-Ya Onye gēsi n'elu-igwe bia, Onye O mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, bú Jisus, Onye nādọputa ayi n'iwe nke nābia.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

I. NDI TESALỌNAIKA 1: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye