Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. SAMUEL 18:1-16

I. SAMUEL 18:1-16 IGBOB

O rue, mb͕e ọ gwabìri Sọl okwu, na ekekọtara nkpuru-obi Jonatan na nkpuru-obi Devid, Jonatan we hu ya n'anya dika nkpuru-obi-ya. Sọl we nara ya n'ubọchi ahu, o kweghi kwa ka ọ laghachi n'ulo nna-ya. Jonatan na Devid we b͕a ndu, n'ihi na ọ huru ya n'anya dika nkpuru-obi-ya. Jonatan we yipu uwe-nwuda nke di n'aru ya, nye ya Devid, na uwe-ya nile, ọbuná rue mma-agha-ya, ru kwa uta-ya, ru kwa ihe-ike-n'úkwù-ya. Devid we nāpu je ebe ọ bula Sọl nēziga ya, o nwe-kwa-ra uche: Sọl we do ya onye-isi ndikom agha, o we di nma n'anya ndi Israel nile, di kwa nma n'anya ndi-orù Sọl. O rue mb͕e ha nābia, mb͕e Devid si na ntib͕u onye Filistia ahu lata, na ndinyom siri n'obobo nile nke Israel puta, ibù abù na ite egwú, izute Sọl, chiri egwú-otiti, were kwa ọṅu, chiri kwa ubọ eji akwara atọ kwe. Ndinyom we zarita onwe-ha, bú ndi nēgwuri egwú, si, Sọl etib͕uwo ndi-iro-ya, nnù ndikom abua na ọgu iri, nnù ndikom abua na ọgu iri, Devid kwa ndi-iro-ya, orú nnù ndikom na nnù ise, orú nnù ndikom na nnù ise. Iwe Sọl we di ọku nke-uku, okwu a jọ-kwa-ra njọ n'anya-ya; ọ si, Ha enyewo Devid orú nnù na nnù ise, orú nnù na nnù ise, ma ọ bu mu ka ha nyeworo nání nnù abua na ọgu iri, nnù abua na ọgu iri: ma nke fọduru inye ya bu nání ala-eze. Sọl we nēle Devid anya ọjọ site n'ubọchi ahu ga n'iru. O rue, n'echi-ya, na mọ ọjọ nke Chineke dakwasiri Sọl n'ike, o we bū amuma n'etiti ulo: Devid nēwere kwa aka-ya kpọ ubọ, dika ọ nēme kwa-ubọchi: ma ube di n'aka Sọl. Sọl we tua ube ahu; ọ si, M'gātugide Devid ọbuná na mb͕idi. Devid we chigharia onwe-ya si n'iru ya pua ub͕ò abua. Sọl we nātu egwu Devid, n'ihi na Jehova nọyere ya, ma O siri n'ebe Sọl nọ wezuga Onwe-ya. Sọl we si n'ebe ọ nọ wezuga ya, do ya ka ọ buru ya onye-isi nnù ndikom abua na ọgu iri; o we nāpu nābata kwa n'iru ndi Israel. Devid we nēnwe uche n'uzọ-ya nile; Jehova nọye-kwa-ra ya. Sọl we hu na nwoke ahu bu onye nēnwe uche nke-uku, o we tua ujọ ya. Ma Israel nile na Juda nile nāhu Devid n'anya; n'ihi na ya onwe-ya nāpu nābata kwa n'iru ha.