O rue, mb͕e ha biara, na ọ huru Elaiab, o we si, N'ezie, ọ nọ n'iru Jehova, bú onye nke Ya etere manu. Ma Jehova siri Samuel, Elegidela iru-ya anya, elegide-kwa-la ogologo nke idi-elu-ya; n'ihi na ajuwom ya: n'ihi na Jehova adighi-ahu dika madu si ahu; n'ihi na madu nēle ihe anya nāhu, ma Jehova nēle obi. Jesi we kpọ Abinadab, me ka ọ gābiga n'iru Samuel. Ọ si, Jehova arọputaghi kwa nka. Jesi we me ka Shama gabiga. Ọ si, Jehova arọputaghi kwa nka. Jesi we me ka madu asa nime umu-ya ndikom gabiga n'iru Samuel. Samuel we si Jesi, Jehova arọputaghi ndia. Samuel we si Jesi, Hà agwuwo, bú umu-okoro-gi? Ọ si, Ọ fọdu-kwa-ra ọdudù-nwam, ma, le, ọ nāzù aturu. Samuel we si Jesi, Ziga kuta ya: n'ihi na ayi agaghi-anọdu buruburu rue mb͕e ọ biara n'ebe a. Ọ we ziga, me ka ọ bia. Ma nwa-okorọbia ahu nācha ọbara-ọbara, anya-ya abua ma-kwa-ra nma, ọ di kwa nma ile anya. Jehova we si, Bilie, te ya manu: n'ihi na nka bu ya. Samuel we were mpi manu ahu, te ya n'etiti umu-nne-ya: Mọ nke Jehova we nādakwasi Devid n'ike site n'ubọchi ahu ga n'iru. Samuel we bilie, la Rema.