Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. SAMUEL 16:1-13

I. SAMUEL 16:1-13 IGBOB

Jehova we si Samuel, Rùe ole mb͕e ka gi onwe-gi ganēruru Sọl újú, ebe Mu onwem juworo ya ka ọ ghara ibu eze Israel? b͕ajue manu na mpi-gi, je, M'gēziga gi jekuru Jesi onye Bet-lehem: n'ihi na ahutaworom onwem eze n'etiti umu-ya ndikom. Samuel we si, M'gēsi aṅa je? ọ buru na Sọl anu ya, ọ gēb͕um. Jehova we si, I gēwere nwa-ab͕ọghọ-ehi n'aka-gi, si, Ichuru Jehova àjà ka m'biaworo. I gākpọ kwa Jesi ibia n'ichu-aja ahu, Mu onwem gēme kwa ka i mara ihe i gēme: i gēte-kwa-ram ya manu, bú onye M'gāsi gi te. Samuel we me ihe ahu nke Jehova kwuru, ọ biarue Bet-lehem. Ndi-okenye obodo ahu we ma jijiji izute ya, si, Ọ̀ bu n'udo ka i biaworo? Ọ we si, Ọ bu n'udo: ichuru Jehova àjà ka m'biaworo: donu onwe-unu nsọ, sorom bia n'ichu-àjà ahu. O we do Jesi na umu-ya ndikom nsọ, kpọ ha bia n'ichu-aja ahu. O rue, mb͕e ha biara, na ọ huru Elaiab, o we si, N'ezie, ọ nọ n'iru Jehova, bú onye nke Ya etere manu. Ma Jehova siri Samuel, Elegidela iru-ya anya, elegide-kwa-la ogologo nke idi-elu-ya; n'ihi na ajuwom ya: n'ihi na Jehova adighi-ahu dika madu si ahu; n'ihi na madu nēle ihe anya nāhu, ma Jehova nēle obi. Jesi we kpọ Abinadab, me ka ọ gābiga n'iru Samuel. Ọ si, Jehova arọputaghi kwa nka. Jesi we me ka Shama gabiga. Ọ si, Jehova arọputaghi kwa nka. Jesi we me ka madu asa nime umu-ya ndikom gabiga n'iru Samuel. Samuel we si Jesi, Jehova arọputaghi ndia. Samuel we si Jesi, Hà agwuwo, bú umu-okoro-gi? Ọ si, Ọ fọdu-kwa-ra ọdudù-nwam, ma, le, ọ nāzù aturu. Samuel we si Jesi, Ziga kuta ya: n'ihi na ayi agaghi-anọdu buruburu rue mb͕e ọ biara n'ebe a. Ọ we ziga, me ka ọ bia. Ma nwa-okorọbia ahu nācha ọbara-ọbara, anya-ya abua ma-kwa-ra nma, ọ di kwa nma ile anya. Jehova we si, Bilie, te ya manu: n'ihi na nka bu ya. Samuel we were mpi manu ahu, te ya n'etiti umu-nne-ya: Mọ nke Jehova we nādakwasi Devid n'ike site n'ubọchi ahu ga n'iru. Samuel we bilie, la Rema.

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara