Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. SAMUEL 11

11
1Nehash, bú onye Amon, we rigota, ma ulo-ikwū-ya imegide Jebesh-gilead: ndikom nile nke Jebesh we si Nehash, Ka ayi na gi b͕a ndu, ayi gēfè kwa gi òfùfè. 2Nehash, bú onye Amon, we si ha, Na nka ka mu na unu gāb͕a ndu, n'irukpọ unu anya aka-nri nile; m'gātukwasi kwa ya n'aru Israel nile ka ọ buru ihe-ita-uta. 3Ndi-okenye Jebesh we si ya, Ra ayi aka ubọchi asa, ka ayi we zisa ndi-ozi n'ókè-ala nile nke Israel: ọ buru kwa na ọ dighi onye nāzọputa ayi, ayi gāpukuru kwa gi. 4Ndi-ozi ahu we biarue Gibea nke Sọl, kwue okwu ndia na nti ndi Israel: ndi Israel nile we welie olu-ha kwa ákwá. 5Ma, le, Sọl biara, nēso ìgwè ehi si n'ubi; Sọl we si, Gini nēme ndi Israel na ha nākwa ákwá? Ha we kọrọ ya okwu nile nke ndikom Jebesh. 6Mọ nke Chineke we dakwasi Sọl n'ike mb͕e ọ nuru okwu ndia, iwe-ya we di ọku nke-uku. 7O we chiri ehi abua, bọkasia ha, zisa ha n'ókè-ala nile nke Israel n'aka ndi-ozi, si, Onye ọ bula nke nāputaghi iso Sọl na iso Samuel n'azu, otú a ka agēme ehi-ya. Oké egwu nke Jehova we dakwasi ndi Israel, ha we puta dika otù nwoke. 8O we gukọta ha na Bezek; umu Israel we di orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ iri-na-asa, na nnù iri, ndikom Juda di kwa orú nnù ndikom uzọ atọ, na nnù iri-na-ise. 9Ha we si ndi-ozi biara, Otú a ka unu gāsi ndikom Jebesh-gilead, Echi ka nzọputa gādiri unu, mb͕e anyanwu nēkpo ọku. Ndi-ozi ahu we bia gosi ndikom Jebesh; ha we ṅuria ọṅu. 10Ndikom Jebesh we si, Echi ka ayi gāpukuru unu, unu gēme kwa ayi dika ihe nile si di nke di nma n'anya-unu. 11O rue, n'echi-ya, na Sọl doro ndi Israel n'usu atọ; ha we ba n'etiti ọmuma-ulo-ikwū n'iche-nche ututu, tib͕ue Amon rue ikpo-ọku nke ehihie: o rue, na ndi fọduru b͕asara, ọ fọdughi kwa ndikom abua n'otù ebe n'etiti ha. 12Ndi Israel we si Samuel, Ònye ka ọ bu, bú onye nāsi, Sọl, ọ̀ gābu eze-ayi? nyenu ayi ndikom ahu, ka ayi we me ka ha nwua. 13Sọl we si, Ọ dighi nwoke agēme ka ọ nwua ta: n'ihi na ta ka Jehova zọputara nzọputa n'Israel.
14Samuel we si ndi Israel, Bianu, ka ayi jerue Gilgal, me ka ala-eze-unu di ọhu ọzọ n'ebe ahu. 15Ndi Israel nile we jerue Gilgal; ha we me Sọl eze n'ebe ahu n'iru Jehova nime Gilgal; ha we chua ihe àjà nke àjà-udo n'iru Jehova n'ebe ahu. Sọl na ndikom nile nke Israel we ṅuria ọṅu nke-uku n'ebe ahu.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

I. SAMUEL 11: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye