Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. NDI-EZE 5

5
1Hairam, bú eze Taia, we zìe ndi-orù-ya jekuru Solomon: n'ihi na ọ nuru na ya ka ha tere manu ibu eze n'ọnọdu nna-ya: n'ihi na onye nāhu Devid n'anya ubọchi nile ka Hairam bu. 2Solomon we zigara Hairam ozi, si, 3Gi onwe gi amawo Devid, bú nnam, na ọ pughi iwuru aha Jehova, bú Chineke-ya, ulo n'ihi agha nke b͕ara ya buruburu, rue mb͕e Jehova tiyere ha n'okpuru ọbu-ukwu-ya abua. 4Ma ub͕u a Jehova, bú Chinekem, emewo ka m'zuru ike buruburu; ọ dighi onye-nmegide, ọ dighi kwa ihe ọjọ daputara ayi. 5Ma, le, m'nāsi na m'gēwuru aha Jehova, bú Chinekem, ulo, dika Jehova gwara Devid, bú nnam, okwu, si, Nwa-gi, onye M'gētiyekwasi n'oche-eze-gi n'ọnọdu gi, ya onwe-ya gēwuru aham ulo. 6Ma ub͕u a nye iwu ka ha b͕utuerem osisi cedar site na Lebanon; ndi-orùm gēso kwa ndi-orù-gi; m'gēnye kwa gi ugwọ-ọlu ndi-orù-gi dika ihe nile si di nke i gāsim: n'ihi na gi onwe-gi amawo na ọ dighi nwoke n'etiti ayi mara ib͕utu osisi dika ndi Zaidon. 7O rue, mb͕e Hairam nuru okwu nile nke Solomon, na ọ ṅuriri ọṅu nke-uku, si, Onye agọziri agọzi ka Jehova bu ta, Onye nyeworo Devid nwa mara ihe ibu onye-isi ndi uku a. 8Hairam we zigara Solomon ozi, si, Anuwom ozi nke i ziterem: mu onwem gēme ihe nile nātọ gi utọ bayere osisi cedar, baye-kwa-ra osisi fir. 9Ndi-orùm gēsi na Lebanon buputa ha oké osimiri: mu onwem gāb͕a kwa ha ka ha se n'elu oké osimiri rue ebe ahu nke i gēziterem ozi, m'gātọsa kwa ha n'ebe ahu, gi onwe-gi gēburu kwa ha: gi onwe-gi gēme kwa ihe nātọm utọ, n'inye ulom nri. 10Hairam we nēnye Solomon osisi cedar na osisi fir, bú ka ihe nile nātọ ya utọ ra. 11Solomon we nye Hairam orú nnù ọtùtù ọka uzọ abua na nnù iri nke ọka wheat iburu ulo-ya ihe-oriri, na orú ọtùtù cor nke manu asuru asu: otú a ka Solomon nēnye Hairam kwa-arọ. 12Jehova nye-kwa-ra Solomon amam-ihe, dika Ọ gwara ya; udo we di n'etiti Hairam na Solomon; ha abua we b͕a ndu.
13Eze, bú Solomon, we weputa usu ndi nēfè òfùfè n'Israel nile; usu ahu ndi nēfè òfùfè bu orú nnù ndikom uzọ atọ na nnù iri-na-ise. 14O ziga ha na Lebanon, orú nnù ndikom na nnù ise n'ọnwa na nb͕anwe: otù ọnwa ka ha nọ na Lebanon, ọnwa abua n'ulo: Adonairam bu kwa onye-isi usu ndi nēfè òfùfè. 15Solomon nwe-kwa-ra orú nnù ndikom uzọ asatọ na nnù iri-na-ise ndi nēbu ibu, na orù nnù ndikom uzọ iri ndi nāwa ihe-ọwuwa n'ugwu; 16nāgughi ndi-isi nke ndi edoro ndi-isi, bú ndi Solomon nwere, ndi bu isi n'ije-ozi ahu, nnù ndikom asatọ na ọgu ise, ndi nwere ike n'aru ndi ahu ndi nālu ọlu n'ije-ozi ahu. 17Eze we nye iwu, ha we bute nkume uku, nkume di oké ọnu-ahia, iwere nkume awaputara awaputa tọ ntọ-ala ulo ahu. 18Ndi-owu-ulo nke Solomon na ndi-owu-ulo nke Hairam na ndi Gebal we, dozie osisi na nkume iwu ulo ahu.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

I. NDI-EZE 5: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye