Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. NDI-EZE 19:1-18

I. NDI-EZE 19:1-18 IGBOB

Ehab we gosi Jezebel ihe nile Elaija mere, na ihe nile otú o were mma-agha b͕ue ndi-amuma nile. Jezebel we zigara Elaija onye-ozi, si, Ka chi me otú a, ka ha me kwa ihe ọzọ otú a, ma asi na emeghm ndu-gi ka ọ di ka ndu otù onye nime ha dika mb͕e a echi. O we tua egwu, bilie, je n'ihi ndu-ya, biarue Bia-sheba, nke Juda nwere, o me ka nwa- okorọbia-ya nọdu n'ebe ahu. Ma ya onwe-ya jere ije otù ubọchi n'ọzara, bia nọdu n'okpuru otù osisi broom: ọ riọ Chineke ndu-ya ka ọ nwua, si, O zuwo; ub͕u a, Jehova, wepu ndum; n'ihi na mu onwem adighi nma kari nnam-hà. O dina, raru ura n'okpuru otù osisi broom; ma, le, mọ-ozi nēmetu ya aka, si ya, Bilie, rie ihe. O we legide anya, ma, le, ob͕e achicha, nke esiri n'elu nkume di ọku, na ite miri di n'akuku isi-ya. O rie, ṅu kwa, dina kwa ọzọ. Mọ-ozi nke Jehova we biaghachi nke ub͕ò abua, metu ya aka, si, Bilie, rie ihe; n'ihi na ije riri nne kari ike-gi. O we bilie, rie ihe, ṅu kwa miri, je n'ike ihe-oriri ahu ọgu ubọchi abua ehihie na abali rue ugwu Chineke, bú Horeb. Ọ bia n'ebe ahu rue ọb͕à, nọ ọnọdu-abali n'ebe ahu; ma, le, okwu Jehova ruru ya nti, si ya, Gini ka i nēme n'ebe a, Elaija? Ọ si, Ekwoworom Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, ekworo nke-uku; n'ihi na umu Israel arapuwo ọb͕ub͕a-ndu-Gi, tipia ebe-ichu-àjà-Gi nile, were mma-agha b͕ue ndi-amuma-Gi: ọ fọduru mu onwem, náním; ha nāchọ kwa ndum, iwepu ya. Ọ si, Pua, guzo n'ugwu n'iru Jehova. Ma, le, Jehova nāgabiga, oké ifufe di ike nāb͕ọwa kwa ugwu nile, nētipia kwa nkume di elu nile n'iru Jehova; ma Jehova anọghi n'ifufe ahu: ma mb͕e ifufe gasiri ala-ọma-jijiji mara; ma Jehova anọghi n'ala-ọma-jijiji ahu: ma mb͕e ala-ọma-jijiji gasiri ọku we di; ma Jehova anọghi n'ọku ahu: ma mb͕e ọku gasiri olu ntà nke di ezi nwayọ dara. O rue, mb͕e Elaija nuru ya, na ọ huchiri iru-ya n'uwe-nwuda-ya, pua, guzo n'ọnu-uzọ ọb͕à ahu. Ma, le, olu ruru ya nti, si, Gini ka i nēme n'ebe a, Elaija? Ọ si, Ekwoworom Jehova, bú Chineke usu-ndi-agha, ekworo nke-uku; n'ihi na umu Israel arapuwo ọb͕ub͕a-ndu-Gi, tipia ebe-ichu-àjà-Gi nile, were mma-agha b͕ue ndi-amuma-Gi; ọ fọduru mu onwem, náním; ha nāchọ kwa ndum, iwepu ya. Jehova we si ya, Je, laghachi n'uzọ-gi rue ọzara Damaskọs: ma mb͕e i biara, i gēte Hazael manu ibu eze Siria: i gēte kwa Jihu, bú nwa Nimshi, manu ibu eze Israel: i gēte kwa Elaisha, bú nwa Shefat, nke Ebel-mehola, ibu onye-amuma n'ọnọdu gi. Ọ gēru kwa, na onye nēwepuga onwe-ya na mma-agha Hazael, Jihu gēme ka ọ nwua: onye nēwepuga kwa onwe-ya na mma-agha Jihu, Elaisha gēme ka ọ nwua. Ma M'gēme ka nnù madu iri-na-asa na ọgu iri fọdu n'Israel, bú ikperè nile nke anēb͕ughi nye Beal, na ọnu ọ bula nke nēsutughi ya.