Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. NDI-EZE 19:1-18

I. NDI-EZE 19:1-18 Bible Nso (IGBOB)

Ehab we gosi Jezebel ihe nile Elaija mere, na ihe nile otú o were mma-agha b͕ue ndi-amuma nile. Jezebel we zigara Elaija onye-ozi, si, Ka chi me otú a, ka ha me kwa ihe ọzọ otú a, ma asi na emeghm ndu-gi ka ọ di ka ndu otù onye nime ha dika mb͕e a echi. O we tua egwu, bilie, je n'ihi ndu-ya, biarue Bia-sheba, nke Juda nwere, o me ka nwa- okorọbia-ya nọdu n'ebe ahu. Ma ya onwe-ya jere ije otù ubọchi n'ọzara, bia nọdu n'okpuru otù osisi broom: ọ riọ Chineke ndu-ya ka ọ nwua, si, O zuwo; ub͕u a, Jehova, wepu ndum; n'ihi na mu onwem adighi nma kari nnam-hà. O dina, raru ura n'okpuru otù osisi broom; ma, le, mọ-ozi nēmetu ya aka, si ya, Bilie, rie ihe. O we legide anya, ma, le, ob͕e achicha, nke esiri n'elu nkume di ọku, na ite miri di n'akuku isi-ya. O rie, ṅu kwa, dina kwa ọzọ. Mọ-ozi nke Jehova we biaghachi nke ub͕ò abua, metu ya aka, si, Bilie, rie ihe; n'ihi na ije riri nne kari ike-gi. O we bilie, rie ihe, ṅu kwa miri, je n'ike ihe-oriri ahu ọgu ubọchi abua ehihie na abali rue ugwu Chineke, bú Horeb. Ọ bia n'ebe ahu rue ọb͕à, nọ ọnọdu-abali n'ebe ahu; ma, le, okwu Jehova ruru ya nti, si ya, Gini ka i nēme n'ebe a, Elaija? Ọ si, Ekwoworom Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, ekworo nke-uku; n'ihi na umu Israel arapuwo ọb͕ub͕a-ndu-Gi, tipia ebe-ichu-àjà-Gi nile, were mma-agha b͕ue ndi-amuma-Gi: ọ fọduru mu onwem, náním; ha nāchọ kwa ndum, iwepu ya. Ọ si, Pua, guzo n'ugwu n'iru Jehova. Ma, le, Jehova nāgabiga, oké ifufe di ike nāb͕ọwa kwa ugwu nile, nētipia kwa nkume di elu nile n'iru Jehova; ma Jehova anọghi n'ifufe ahu: ma mb͕e ifufe gasiri ala-ọma-jijiji mara; ma Jehova anọghi n'ala-ọma-jijiji ahu: ma mb͕e ala-ọma-jijiji gasiri ọku we di; ma Jehova anọghi n'ọku ahu: ma mb͕e ọku gasiri olu ntà nke di ezi nwayọ dara. O rue, mb͕e Elaija nuru ya, na ọ huchiri iru-ya n'uwe-nwuda-ya, pua, guzo n'ọnu-uzọ ọb͕à ahu. Ma, le, olu ruru ya nti, si, Gini ka i nēme n'ebe a, Elaija? Ọ si, Ekwoworom Jehova, bú Chineke usu-ndi-agha, ekworo nke-uku; n'ihi na umu Israel arapuwo ọb͕ub͕a-ndu-Gi, tipia ebe-ichu-àjà-Gi nile, were mma-agha b͕ue ndi-amuma-Gi; ọ fọduru mu onwem, náním; ha nāchọ kwa ndum, iwepu ya. Jehova we si ya, Je, laghachi n'uzọ-gi rue ọzara Damaskọs: ma mb͕e i biara, i gēte Hazael manu ibu eze Siria: i gēte kwa Jihu, bú nwa Nimshi, manu ibu eze Israel: i gēte kwa Elaisha, bú nwa Shefat, nke Ebel-mehola, ibu onye-amuma n'ọnọdu gi. Ọ gēru kwa, na onye nēwepuga onwe-ya na mma-agha Hazael, Jihu gēme ka ọ nwua: onye nēwepuga kwa onwe-ya na mma-agha Jihu, Elaisha gēme ka ọ nwua. Ma M'gēme ka nnù madu iri-na-asa na ọgu iri fọdu n'Israel, bú ikperè nile nke anēb͕ughi nye Beal, na ọnu ọ bula nke nēsutughi ya.

I. NDI-EZE 19:1-18 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ehab kọọrọ Jezebel ihe niile Ịlaịja mere, na otu o si jiri mma agha gbuo ndị amụma Baal niile. Nʼihi nke a, Jezebel zigara onyeozi ka ọ ga zie Ịlaịja sị, “Ka chi ndị a mesoo m mmeso, nʼagbanyeghị otu mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na oge dịka oge a echi, egbughị gị dịka i si gbuo ndị amụma Baal.” Ịlaịja tụrụ egwu, gbapụ ọsọ, nʼihi ichebe ndụ ya. Mgbe ọ bịaruru Bịasheba, dị na Juda, ọ hapụrụ nwokorobịa na-ejere ya ozi nʼebe ahụ. Ma ya onwe ya pụkwara jee ije otu ụbọchị nʼọzara naanị ya. Nʼikpeazụ, ọ kwụsịrị nọdụ ala nʼokpuru otu osisi brum, kpee ekpere rịọọ ka a napụ ya ndụ ya. Ekpere o kpere nʼoge a bụ, “O zuorela m ONYENWE ANYị, biko napụ ndụ m. O nweghị ụzọ m si dị mma karịa nna nna m ha.” O dinara nʼokpuru osisi brum rahụ ụra. Ma lee, otu oge ahụ, mmụọ ozi metụrụ ya aka, sị ya, “Bilie, rie nri.” Ịlaịja biliri legharịa anya, hụ ogbe achịcha na ite mmiri nta nke dị nʼakụkụ ebe ọ tụkwasịrị isi ya. O riri ogbe achịcha ahụ a hụrụ nʼicheku ọkụ, ṅụọkwa mmiri ahụ. Emesịa, o dinakwara ọzọ. Mmụọ ozi nke ONYENWE ANYị bịaghachikwara nke ugboro abụọ, sị ya, “Bilie rie ihe, nʼihi na ije dị gị nʼihu dị ukwuu.” Ịlaịja biliri rie ihe, ṅụọkwa mmiri. Nri ahụ nyere ya ike ije ije iri ụbọchị anọ ọzọ, ehihie na abalị, tutu ruo mgbe ọ bịaruru nʼugwu Horeb nke bụ ugwu Chineke. Nʼebe ahụ, ọ banyere nʼotu ọgba nkume rahụ ụra abalị nʼime ya. ONYENWE ANYị Ma okwu ONYENWE ANYị rutere ya sị, “Ịlaịja, gịnị ka ị na-eme nʼebe a?” Ọ zaghachiri sị, “Eji m ịnụ ọkụ nʼobi na-ejere ONYENWE ANYị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile ozi. Ndị Izrel ajụla ọgbụgba ndụ gị, tidasịakwa ebe ịchụ aja gị, were mma agha gbukwaa ndị amụma gị niile, ugbu a, ọ bụ naanị mụ onwe m bụ onye fọdụrụ, ma ha na-achọkwa iwepụ ndụ m.” ONYENWE ANYị sịrị ya, “Pụọ gaa guzo nʼelu ugwu, nʼihu ONYENWE ANYị, nʼihi na ONYENWE ANYị na-aga isite nʼebe ahụ gafee.” Mgbe ahụ, oke ifufe dị ike gbawara ugwu ahụ, tipịasịa nkume ndị ahụ nʼihu ONYENWE ANYị, ma ONYENWE ANYị anọghị nʼime ifufe ahụ. Mgbe ifufe ahụ gasịrị, e nwere oke ala ọma jijiji nʼugwu ahụ, ma ONYENWE ANYị anọkwaghị nʼala ọma jijiji ahụ. Mgbe ala ọma jijiji ahụ gasịrị, ọkụ nwuuru, ma ONYENWE ANYị anọghị nʼime ọkụ ahụ. Ma mgbe ọkụ ahụ gasịrị, nwa olu nta dị nwayọọ dara. Mgbe Ịlaịja nụrụ ya, o ji uwe mwụda ya kpuchie ihu ya, pụọ gaa guzo nʼọnụ ụzọ ọgba nkume ahụ. Mgbe ahụ, ọ nụrụ olu jụrụ ya sị, “Ịlaịja, gịnị ka ị na-eme nʼebe a?” Ọ zaghachiri sị, “Eji m ịnụ ọkụ nʼobi na-ejere ONYENWE ANYị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile ozi. Ndị Izrel ajụla ọgbụgba ndụ gị, tidasịakwa ebe ịchụ aja gị, were mma agha gbukwaa ndị amụma gị niile, ugbu a ọ bụ naanị mụ onwe m bụ onye fọdụrụ, ma ha na-achọkwa iwepụ ndụ m.” ONYENWE ANYị sịrị ya, “Sikwa ụzọ i si bịa laghachi, gaa nʼọzara Damaskọs. Mgbe i ruru ebe ahụ, tee Hazael mmanụ ịbụ eze Aram. Teekwa Jehu, nwa Nimshi mmanụ ịbụ eze Izrel. Ị ga-etekwa Ịlaisha nwa Shafat, onye Ebel-Mehola mmanụ ịbụ onye amụma nʼọnọdụ gị. Onye ọbụla gbanarịrị Hazael ga-anwụ nʼaka Jehu. Otu a kwa, ndị niile gbanarịrị mma agha Jehu ka Ịlaisha ga-egbu. Ma ghọta na ọ dị puku mmadụ asaa nọ nʼIzrel, ndị na-egbubeghị ikpere ha nʼala nye Baal, maọbụ sutu ya ọnụ, ife ya ofufe.”